DỊKA ihe siri ike n’oge ugbu a nke mere na onwekebeghị ihe na-aga otu o kwesịrị, ndị mmadụ na-enye mkpesa na isi akwa adịkwaghị ebe a fanyere ya. Onye elu na-ebe, onye ala na-ebe, o nwekwaghị onye ọ dịịrị mma.Ha kwuru sị:
Maazị Obi Kenneth – Nwanne m efe nyeghị maka na a hụghị akpa akpanye ọkazị. Ihe siri ike n’ihi na agụụ na-achọ ịnara m ụmụ m. Anaghị m ekwu okwu igo ụgbọala maọbụ ọgbatumtum kama ọ bụ nri, ihe a na-eri eri ka m na-ekwu maka ya. Ọnọdụ ụwa dị ugbu a mere na anaghị m akpatazi ihe m ji enye ezinaụlọ m nri. I gote ahịa kpọsa, ọ dịghị onye na-ego, ụfọdụ na-ego n’aka, ha mechaa ha ejide gị ụgwọ, ha agaghị akwụ ya. Ọtụtụ ndị mamdụ na-eme ha goro gị ahịa ha agaghị esikwa n’ihu ọdụ ahịa gị gafee ụbọchị ọzọ.
Otu nwaanyị bịara goro m ihe n’aka yaabụ, ọkara akpa agwa, kemgbe ọnwa ise ruo taa ahụbeghị m ya anya. Ị kpọọ ya n’ekwentị ọ sị gị biko nweere ya ndidi na o nwere ka ihe siri dịrị ya ugbu a. Ọ na-agwa m na o nwere ka ihe siri dịrị ya, ọ ma ka o siri dịrị m. Jụọ m ma ọ bụ ihe ahụ ọ na-agwa m ka m ga-agwa ha ma m gaa ebe m si ebute ahịa m na-ere, ka ihe ndị ahụ ọ na-amị na be m?
John Uzo – Kemgbe nne m jiri mụ m, ahụbeghị m oge dị ka oge a. Ihe siiri onye ọbụla ike. Ebe ọnọdụ m si dịka ọ kacha njọ bụ na e ji m ụgwọ n’ebe m na-arụ ọrụ kemgbe ọnwa isii. Ka ihe siri gbata kwụrụ ugbu a maghịkwa m ihe m ga-eme n’ihi na a tọrọ m atọ. Ọ bụrụ na o kwere omume a gaara m iburu efere na-arịọ arịọrịọ ma nke ahụ agaghị ekwe m omume n’ihi na a bụ m mmadụ ihere, agaghị m arịọlị arịrịọ, ihe ọ sọrọ ihe ụwa dịka ya.
Ya mere, ana m agazi na-arụ ọrụ ọbụla m hụrụ, dịka ịsụchasịrị ndị mmadụ ahịhịa, ibu bụlọọkụ n’ebe a na-arụ ụlọ, tinyere ụmụ obere ọrụ ndị ọzọ, mana e mee elu mee ala ọ naghị ezu n’ihi na ọ bụ ohere mmapụta ka m ji eme ya maka na aka m na-arụ ọrụ n’ụlọọrụ ebe ahụ e ji anyị ụgwọ kemgbe ọnwa isii. Ọ bụrụ na m kwụsizie ịga ọrụ ebe ahụ nke m rụrụ arụ ga-ala m n’iyi.
Joy Okeke – Abụ m onye ọrụ oyibo. Arụọla m ọrụ afọ iri abụọ. N’oge mbụ, ụgwọ ọnwa m na-ezuru m, ma ugbu a ọ naghị ezuzi izuụka abụọ ọ gwụ. Ọnọdụ ọjọọ dị otu a gwụrụ m ike, oge mbụ ana m aba ọgbatumtum gaa ọrụ, dịka keke pụtara amalitere m gbawa keke, mana taa dịka m na-agwa gị, ụkwụ ka m jizi aga ọrụ n’ihi na m sị ka gbara keke na-aga mụ na ụmụ m ga-ebu ọnụ. Ihe galara ọnụ nke ukwuu. Ị baa ime ahịa onweghị ihe ị ga-egotali, amakwaghị m ụdị ụwa anyị nọ n’ime ya.
Nnadi Ume – Mmiri siri n’isi gbaruo. Kemgbe korona batara ka ihe niile kwụụrụ ọtọ ghasaa. Ọ bụ eziokwu na ihe siburu ike mana korona bataziri wụnye mmanụ ọkụ ‘fuel’, ọkụ nwuruzie gbaba ụwa niile a kwụsị akwụsị. Lekwa anya, Ị gee ntị, ị ga-anụ na mba ụwa dị iche iche amalitela lakpubekwa (lock down) n’ike n’ike. Gwa m, ọ bụ ụzọ dị otu a ka ụwa ga-esi dị mma.
Ndụmọdụ m na-enye ndị mmadụ bụ ka onye ọbụla chọba ihu Chukwu ka ụwa wee dịkwa mma.
Nkechi Ike: Ọnọdụ ihe isiike dị ugbu a karịziri akarị nke bụ na ogbenye ọnụ ntụ na-eribu nri ugboro abụọ n’ụbọchị ejisi ike ka o ji erizi otu ugboro. Ihe niile galaziri nnukwu ọnụ. Obụladị ndị na-akọ ugbo anaghị ebuputanwuzi ihe ha kọrọ n’ugbo n’ahịa n’ihi ọnụ ego ụgbọala galara ọnụ. Ihe niile a mere ka ihe sie ike karịa. Mmanụ nri nke ndị Igbo na-emepụta agalakwaana ọnụ karịa. Ihe isi ike dị ugbu a kacha njọ n’ihe oriri. Onye rie nri ọ dị ndụ, mana ugbu a iri ihe oriri adịghịzi mfe.