NDỊ ụka St Thomas Aquinas Catholic Church, G.R.A, Awka,. kelere Chineke n’ebe ọ dị ukwuu ụbọchị ụka gara aga ka otu onye n’ime ha bịara ịtụrụ Chineke mmamma maka ịzọpụta ya n’ọrịa. Oriakụ Uju Odimgbe bụ onye Chineke gwọrọ ọrịa akụrụ (kidney), o wee bụrụ ihe oke ọńụ.
N’aja maasị dị asọ nke e ji abụ otito jaa Chineke mma, Fada Blaise Ejike kwuru si na ụka kpọrọ ndị mmadụ oku ka ha ńụrịa n’ime Chineke n’ụbọchị ahụ o wee dabakwaa dịka Uju Odimgbe bịara ịtụrụ Chineke mmamma. O kelere Chineke n’isi ya, ma kelekwaa Fada Anthony Akabuogu ji ọkwa dịka ụkọchukwu Parish oge ahụ maka mbọ ọ gbara, tinyekwara ndị niile nyere aka.
N’okwuchukwu, Fada Rowland Victor Okoli tokwara Chineke maka ọrụebube ya n’isi Uju Odimgbe. O kwuru sị: “Nwanne anyị nwaanyị gabigara ọtụtụ ihe nke ụfọdụ n’ime anyị tụnyere ụtụ na ya. Ana m ekele ezinaụlọ ya maka okwukwe ha nwere na Chineke.”
Ọ gara n’ihu kọwaa na Akwụkwọ Nsọ kwuru na anyị ga na-ekele Chineke ma ọ dị mma ma ọ dị njọ. Ka mmadụ hapụ ịtụ uche banyere ihe ọbụla karịa sọ ịgbaso ekpere na ịtụrụ Chineke mmamma.
N’okwu nke ya, Paully Onyeka bụ onyeisi otu haziri ụzọ enyemaka iji zọọ Uju Odimgbe ndụ kelere ndị dị iche iche gbatara ọsọ enyemaka ọ kachasi ụkọchukwu parish oge ahụ bụ Fada Anthony Akabuogu, ndị otu Divine Mercy, Madonna Mercy, St Vincent De Paul, Maazị Odimgbe tinyere ndị mmadụ ndị ọzọ dị iche iche.
Oriakụ Uju Odimgbe ji ọńụ wee kelee ndị mmadụ niile. O kwuru sị: “Onye ji unu ji mmadụ. Ekele dịrị Chineke onye mere ka unu rụọ ọrụ a ruo n’isi njedebe. Ụnụ ga-adị ndụ, ka Chineke gọzibe ụnụ. Ọrịa ọjọọ ọbụla agaghị erute ụnụ n’aha Jesus Christ onye nweanyị.”
N’akụkụ nke ya, Sir Chuka Nnabuife, onyeisi ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) ma bụrụkwa otu onye na ndị gbara mbọ toro ndị St Thomas Aquinas maka ezi ọrụ ha rụrụ, ma kọwaa Fada Akabuogu dịka onye mere nke ọma. Onye rụpụtara ụlọụka ma rụkwaa mmadụ.
Onyeisi otu Divine Mercy bụ Cyril Ifeacho kwuru sị: “Ana m ekele Chineke maka ime ka ndị ekweghị na e nwere ihe dịka oruebube kwenye site n’ịgwọ nwanne anyị nwaanyị ọrịa.”
Lady Kate Izuagba, onye gbakwara mbọ dị egwu n’isi Uju Odimgbe kwuru sị: “Ụlọnsọ Chineke anyị na-ahụ anya bụ mmadụ. Legharịa anya okirikiri gị. Gee nti na mmụọ nke Chukwu ma mee ihe ọ gwara gị mee. Ana m ekele ndị St Thomas Aquinas maka ọrụ Chukwu jiri ha rụ, nke bụ na ọ bụghị ya, agaghị enwezi Uju Odimgbe.”
Uju Onwuka kwuru si: “Ọ bụghị obere ọrụ ka Chukwu rụọrụ anyị. Ọ zara anyị ekpere site n’ime ka nwanne anyị nwaanyị si n’ọrịa pụta.”
Maazị Odimgbe nọ n’oge ahụ kelee ndị Aquinas, Fada Oranye bụ ụkọchukwu parish maka ohere o nyere ha, Fada Akabuogu na Blaise Ejike, tinyere Bishọp Ezeokafor na Gọvanọ Obiano.O kelekwara ndị niile gbara mbọ n’ụzo dị iche iche.
Oriakụ Uju Odimgbe nọkwa n’ụbọchị ahụ merube emume ọgbụgba afọ ya nke mere na emume ụbọchị ahụ gbara mkpị. Ya mere, Fada Ejike gọziri achịcha o jiri bịa ma gọọrọ mmadụ niile ọfọ ihe ọma.