DỊKA ọrịa nje korona jikwà nwayọ na-agbasawanye ma na-abawanyekwa ụba ọzọ ugbua, ọchịchị steeti Anambra ahaziela ọgbakọ nkụzi pụrụ iche maka ndị ndu ụka dị iche iche n’ime steeti ahụ, iji gbochie mgbasawa ya bụ ọrịa.
Ọgbakọ inye nkụzi ahụ a chịkọbàrà site n’okpuru ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ nke weere ọnọdụ nsonso a n’Ọka (Awka), ma bụrụkwa nke ndị sitere ụlọụka na okpukperechi dị iche iche na steeti ahụ sonyere na ya.
N’ozi nnọọ ya n’ọgbakọ nkụzi ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Okpala mere ka a mara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji kọwaara ha bụ ndị ndu ụka òkè na ọrụ dịịrị ha n’igbochi mgbasawanye ọrịa nje korona ahụ, ma nyekwa ha ọzụzụ kwesiri ekwesi ha ga-eji wee rụọ ya bụ ọrụ chere ha n’ihu, bụ nke dị oke mkpa ugbua ndị nwetara ọrịa ọjọọ ahụ na-abawanyezịkwa ụba n’ebe dị iche iche.
Ọ gwara ndị ahụ sonyere na ya bụ ọgbakọ ọzụzụ ka ha tọọ ntị n’ala nke ọma ịmụta ihe dị iche iche a ga-akụziri ha n’ebe ahụ, ma burukwa ya gaa na ngalaba ụka ha dị iche iche n’ime steeti ahụ iji kụziere ndị ọzọ ma tinyekwa ya n’ọrụ.
Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha gbaa mbọ hụ na onye ọbụla gá-ábata n’ụlọụka ha maọbụ sonye n’ihe ọbụla a ga-eme n’ụlọụka ahụ, ọkachasị n’oge mmemme ekeresimeesi a ndị mmadụ si ebe dị iche iche abata, ga-agbasòrịrị usoro na ntụziaka niile ahụ NCDC na WHO nyere dịka ụzọ kacha mma isi gbochie mgbasa ọrịa ahụ, iji gbanahịkwa ibute maọbụ kesàá ya bụ ọrịa.
Ụfọdụ ndị sonyere na mmemme ahụ.
Na ntụnye nke ya, otu onye e ji okwu ya agba ìzù na ngalaba ahụike steeti Anambra, bụ Oriakụ Uju Onwuegbuzina gwàrà ndị ahụ sonyere na ya bụ ọgbakọ nkuzi ka ha nye aka ịkpọpụta ma gba mbọ hụ na ndị ụka ha dị iche iche wepụtara onwe ha ka e mee ha nnyòcha banyere ọrịa ahụ, bụ nke steeti ahụ malitezịkwara ime n’ebe dị iche iche ugbua, n’ihi na ịchọpụta ọrịa ahụ n’oge na-enye aka igbochi ya.
O jikwara òhèrè ahụ chètara ndị Anambra na mmadu ịga nnyocha ahụ maka ọrịa nje korona abụghị amamikpe ọnwụ, ma kpọkuzie ha ka onye ọbụla nyéré gọọmentị aka n’igbòchi ọrịa ahụ site n’ije ya bụ nnyocha na ime ihe ndị ọzọ kwesiri na ọ ga-eme.
N’okwu ha dị iche iche, ụfọdụ ndị sonyere na ya bụ ọgbakọ nkụzi, nke gụnyere Ụkọchukwu Emmanuel Egwuagu, Ụkọchukwu Felix Efobi na ụfọdụ ndị ọzọ kèlèrè gọọmenti steeti ahụ maka igosipụta na ha bụ ndị ụka so na ndị nwere ọrụ pụrụ iche nakwa ntụnye ha ga-eme n’igbochi mgbasa ọrịa nje korona ahụ, bụ ajọ ọrịa gbukoro puku kwuru puku mmadụ na mba ụwa.
Ha kwezịkwara nkwà iburu ihe ha mụtara na ya bụ ọgbakọ wee lakwuru ndị ụka ha dị iche iche, kụziere ha ihe ndị ahụ, ma tinyekwa ha n’ọrụ n’ozuzuoke.
A nọrọ na ya bụ mmemme kụziere ndị ahụ ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere ọrịa nje korona, ọkachasị dịka o siri metụta ihe e ji ama onye bu ya, ụzọ o si agbasa, nakwa usoro a pụrụ isi wee gbochie maọbụ gbanahụ ibute maọbụ ikesà ya, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị iche iche a kụziiri ha.