A baala izuụka Ekeresimeesi, ebe niile na-adazi katakata maka na ndị mmadụ na-akwadobe nnukwu emume ahụ n’ike n’ike. N’ihi ya, onye ntaakụkọ anyị CHINWENDU UZOATU gbara ụfọdụ ndị mmadụ ajụjụ ọnụ iji chọpụta otu ha si akwadebe. Otu a ka o siri ga:
EKENE Ikeh – Onye ọbụla dị ndụ agbaala Ekeresimeesi. Ekeresimesi bụ mmadụ na Chineke ya ịdị mma. Ọ bụghị sọ oriri ka a na-eri n’oge a. Mmadụ kwesịrị iji ileru ndụ ya anya wee chọọ ihu onye kere ya. A bịa maka ịla obodo, ọ dịkwa mma maka na oge a bụ oge mmadụ na ikwu na ibe ya ji anọkọrịta dịka ụmụnne. Otu o sila dị, ihe siri ike ugbu a, ọ bụghị sọ n’ala anyị bụ Nigeria kama ọ zuru ụwa niile ọnụ. Mmadụ ga-eji nwayọọ kwadoo ma mee ihe ndị ọ ga-emeli iji wee rie oriri Ekeresimeesi. Ihe kacha mkpa bụ na onye ahụ dị ndụ, onye enweghị taa ga-enwe echi.
Okeke Ike – Emume Ekeresimeesi bụ ome n’afọ. Ọ bụ oge e ji echeta ọmụmụ onyenweghị Jesu Kristi. Ana m agwa ndị mmadụ ka ha hapụ itinye aka n’ihe ọjọọ n’ụdị na ha na-agba Ekeresimeesi. O kwesịrị ka ihe onye nwere ju ya afọ. I nwee ego anụ I goro, gị na ezinaụlọ gị a taa ma ọ bụrụkwanụ na Ị nweghị, Ị goro azụ, maka Ekeresimeesi ga na-adị n’aga. Ihe dị ụtọ na ya bụ na mmadụ nọ wee soro ńụrịa maka ọmụmụ Jesu Kristi. Ọzọ dị ka ibe ya bụ na ndị ọ dị n’aka ga-akaba ahụ nyere ndị ha ka mma aka, yaabu onye na-eri ọ na-echeta nwanne ya, e mee otu a, ihe ga na-aga dịka o kwesịrị.
Ikenna Dim – Agaghị m ala obodo n’afọ a n’ihi na ụbọchị amaghị kwụrụ. Egighị m ego m ga-eji akpọ ezinaụlọ m ala. Ahụghị ka e mere, e mee ka a hụrụ. Anyị ga-anọ n’Awka gbaa ma rie oriri Ekeresimeesi. Ihe anyị hụrụ anyị erie, otu o sila dị. Afọ a bụ 2020 adịghị mma. E si na nsogbu nke a, a baa na nke a nke mere na mmiri siri n’isi wee gbarụọ. Otu ihe doro m anya bụ na nke afọ a gaa, nke afọ ọzọ ga-abịa. E nwere m olile anya na ihe ga-aka mma echi.
Eunice Mmadu – E bidoro m n’oge kwadobe maka emume Ekeresimeesi. Isusu anyị na-atụ n’ụlọọrụ ebe m na-arụ ọrụ na-enyere m aka nke ukwu n’ihi na ọ na-abụ anyị tụchaa ya, anyị ewere ya zụtacha ihe oriri dị iche iche dịka mmanụ, ji, agwa, okporoko, azụ, ịsha, ncha na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ka ọ dị ugbu a, anyị azụtala ma kee ihe oriri ndị ahụ iji wee chebiri emume Ekeresimeesi. A bịa n’anụ, ana m adị na mbụ gota ụmụ obere ọkụkọ na-azụ. Ya mere, ọkụkọ ndị ahụ m na-azụ etoola ugbu a, ọ bụ ha ka mụ na ezinaụlọ m ga-eji merube emume Ekeresimeesi. Anyị ga-atagide ha banye afọ ọhụrụ. N’ihe gbasara akwa, anyị ga-eyi ndị anyị nweburu n’ihi na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-akwa maọbụ gota akwa ọhụrụ.
Peter Emmanuel – Mụ na ndị be m ga-ala ụlọ Ekeresimesi. Anyị na-anọ n’ụlọ eme emume a afọ ọbụla. Ọ bụ oge m ji akpọla ụmụ n’ụlọ ka ha wee na-amata ikwu na ibe anyị. Onweghị oke nkwado anyị na-eme n’abụghị na anyị ga-anọ n’obodo anyị ụbọchị ahụ ebe anyị na ụmụnne anyị ga-ańụrị, rikọọ.
Dịka nna m ka nọ ndụ, ọ bụ ezi ohere anyị ga-eji kposa ya ahụ ọkụ mee ka ọ mata na ya nwere mmadụ. E ji m ohere a adụ ndị mmadụ ọdụ ka ha na-alarụ ụlọ oge Ekeresimeesi maka na ọ bụ ohere ọma e ji ezute ikwu na ibe. Oge m nọ n’ikorobịa, ebi m Ugwu Awụsa, anyị lọta ụlọ, ndị Lagos, Aba, Onitsha na ndị ọzọ bi ebe dị iche iche obodo a na-ekpo ọkụ, onye ọbụla amara nwanne ya. Ma ọ dịchaghị otu a ugbu a, ụfọdụ sị na ọ bụ ihe isi ike kpatara na ha anaghị ala ụlọ ebe ụfọdị sị na ọ bụ egwu ndị amosu na-atụ ha. Ihe niile ndị ahụ ha na-ekwu enweghị isi n’ihi na kemgbe ụwa ndị mmadụ na-ala ụlọ. Ana m eche na ọ bụ ụwa ọhụrụ kpatara ihe ndị ahụ, oke akwụkwọ maọbụ mmụta. Ụfọdụ anaghị ekwe ka ụmụ ha pụta iro ma ha nwaa anwaa kpọrọ ha lọta ụlọ, ọbụladị nnukwu nne ha, ọ naghị ahụ ha anya.
Ọ bụrụ ndị bi n’ụlọ elu, n’elu ahụ ka ha ga-anọgide, ha anaghị agbatu ala. Ọnọdụ dị otu a jọgburu onwe ya na njọ. O si otu a dịrị gaba, ihe ga-emebikwa.
Oge Ekeresimesi bụ ohere ikwu na ibe, enyi na enyi tinyere ndị ọgọ w.d.g ji anọkọrịta ma banye afọ ọhụrụ.
Uwa Onwukwe – Onweghị ihe m na-akwado n’ihi na ụbọchị adịghị mma. Ihe siri ike nke ukwu nke mere na ejighị m ego ọbụla. Anyị agaghị ala ụlọ n’ihi na ị sị ka ị laa ụlọ ị ga na-emefu ego. Ọtụtụ ihe ka o kwesịrị na ị ga-eji ego mee n’ụlọ. Ya mere, ebe o doro m anya na o nweghị ego dị m n’aka, ọ kaara m mma na mụ kwanyere onwe m ugwu nọrọ n’Awka ebe a. Ma I riri ma I righị, o nweghị onye ga-achọpụta.
Amarachi Mba – Mụ na ezinaụlọ m ga-eme emume Ekeresimeesi afọ a n’usoro nke Chukwu. Ihe kachanụ bụ na anyị dị ndụ. Ọtụtụ ndị adịghị ndụ taa iso gba Ekeresimeesi. Ihe dị iche n’ebe anyị nọ bụ na Chukwu mere amara ọ bụrụ na a ga-echi nne dị m Ezinne n’ụlọụKa. Echichi Ezinne bụ nnukwu ihe n’ihi na ọ bụ ịkwanyere mmadụ ugwu ma na-egosipụta na onye ahụ zuru oke n’ụka. N’ihi ya, anyị ga-ala ụlọ kelee Chineke, gbaa Ekeresimeesi ma sonyere nne di m dịka a na-echi ya Ezinne. Anyị ga-ejizi ohere ahụ rie ma nyekwa ndị mmadụ ihe oriri ka ha wee soro anyị ńụrịa.
Ngozi Nnam – onweghị ihe ọbụla m na-akwado. Agaghị m ala obodo n’ihi na ụmụnne m na ndị enyi m kwuru na ha agaghị ala. Ọ baghị uru na m na-ala n’ihi na m laa ha anọghị ya, ọ gaghị enye m ohere ime mkpagharị. Ọzọ bụ na a na-ama ọkwa na ọrịa korona ka dịkwa, n’ihi ya achọghị m oke mmekọrịta n’ebe ndị mmadụ nọ maka na nkwụcha abụghị ụjọ.
Uche Mbakogu – Chineke na-adị ndụ, ihe niile a na-eri n’Ekeresimesi anyị ga-ericha ya. Agaghị m ala ụlọ n’ihi na ego kọrọ m ugbu a. Mụ na ezinaụlọ m ga-anọ n’Awka ebe a wee rie oriri Ekeresimeesi. Ihe m na-agwa ndị mmadụ bụ na Ekeresimeesi anaghị agwụ agwụ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ oge onye ọbụla nọ n’ụzọ ije kwesịrị ịkpọrọ ezinaụlọ ya laa obodo ya mana nsogbu adịghị ya. Onye agaghị n’afọ a, ọ gaa afọ ọzọ. Ihe a na-agba agba anaghị agwụ agwụ. Ekeresimesi gafee, Ista na-abịa.
Nwanyiabia Mmadu – Ana m enwe ọńụ maka ọmụmụ onyenzọpụta anyị. Ọ bụ ọńụ a bụ ihe kacha mkpa n’emume Ekeresimeesi. Ana m ekwu ka onye ọbụla gbaa mbọ hụ na o nwetara ọńụ ọmụmụ onyenzọpụta n’oge a ọńụ ahụ wee zuo oke n’ime ya. Oge Ekeresimeesi bụ oge onye ọbụla ji enyere ibe ya aka. Ị mara onye ị ka mma, ị nyere ya aka maka na onye ọbụla nwere onye ọ ka mma. Ịla ụlọ dị mkpa maka ọ bụ oge ikwu na ibe, ụmụnna dị iche iche ji anọkọta ọnụ rie, ńụọ, dozie esemokwu ọbụla dịịrị ha ma mee udo. Ha e si na ya banye afọ ọhụrụ.
Ya mere, Ekeresimeesi na-eweta ịdịnotu na ịhụnanya. Ọ bụghị sọọsọ oriri na ọńụńụ kama oge e ji eme nwanne ma dozie ihe ọbụla na-ebuye nsogbu.
Wisdom Agu – Ana m ejikarị oge emume Ekeresimeesi aga n’ogige ndị enweghị nne na nna. Ana m aga ebe ahụ na-enye ha onyinye ole m nwere ike iji wee gbaara ha Ekeresimeesi ma mee ka obi dị ha mma. Mụ na ikwu na ibe m ga-anọkọrịtakwa. Ọ bụ oge anyị ji eleru anya, nọọ nzukọ wee tụọ arọ ụzọ ezinaụlọ anyị ga-esi na-aga n’ihu. Ọzọ bụ na aga m agakwa ikwu nne m ka mụ na ha nọkọọ. Anyị na-esi n’ọnọdụ ahụ na-adịwanye na mma.