KAROORU so n’ihe a na-eme mgbe ọbụla a na-agba Ekeresimeesi. Ihe ọ pụtara bụ ịgụ egwu ọńụ maka ọmụmụ onye nzọpụta. A na-anọ otu ebe eme karooru maọbụ na-agagharikwa agagharị. Otu ọbụla e siri me ya, karooru na-enye obi ụtọ.
Ndị na-agagharị agagharị na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-agụ egwu, ndị mmadụ a na-enye ha ego. Egwu ha na-agụ bụ egwu ọmụmụ onyenzọpụta Jesu Kristi. Ọmụmaatụ: kpakpando na-amụkesi n’ọzara a kpakpando na-amụkesi n’ọzara kpakpando ewoo ewoo chim o mgbe Mary jiri mụọ onyenweanyị.