Ọ BỤNNỌỌ oge anyammiri na ákwá arịrị na nsonso a, dịka otu onye ọzọ zutèrè ọnwụ mberede ya n’Onitsha dị na steeti Anambra, ka ọ fọdụrụ mkpụrụ ụbọchị olenaole ka a gbaa ekeresimeesi maọbụ chịkọta ahọ 2020.
Akụkọ banyere ihe mberede a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ozi a kụpụrụ na nsonso a site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n’ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps’ (FRSC), ngalaba ya nke steeti Anambra, bụ SRC Florence N Edor.
O mere ka a mara na ya bụ ihe mberede bụ nke dapụtara n’etiti ụgbọala Suzuki shọtụụl bọọsụ (nwéré ákàrà NKE46XA) na nnukwu ụgbọala gwongworo Mercedes Benz (nwéré ákàrà JJT613XA), ma bụrụkwa nke mere na mpaghara ụzọ awara awara ahụ siri Ọnịsha gaa Enugu.
Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporo ụzọ bụ nke dapụtara oge ụkwụ ụgbọala shọtụụl bọọsụ gbawara oge ọ nọ n’ọsọ, nke mezịrị ka otu onye n’ime mmadụ anọ nọ n’ime ụgbọala ahụ oge ahụ mapụ n’ike, wèé dàá n’ihu ụgbọala gwongworo ji ọsọ ekwodata; o wee kwọrikọọ ya.
O kwuru na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwazị n’ụgbọala ahụ nwètàkwàrà mmerụahụ n’ogoogo dị iche iche, bụkwa ndị ndị mmadụ nọ mgbe ihe ahụ mere buuru wee gaa otu ụlọọgwụ nọ nso n’ebe ahụ maka inye ha ọgwụgwọ, tupu ndị ọrụ FRSC rute n’ebe ahụ. O kwukwazịrị na ndị ọrụ ha bụ FRSC buruzịrị ozu onye ahụ nwụrụ anwụ wee ga dọnye ya n’ụlọ nchekwa ozu ụlọọgwụ Borromeo dị n’Ọnịsha ahụ.
N’okwu ya banyere ajọ ọdachi ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Andrew A Kumapayi kasiri ezinụlọ ahụ onye nke ha nwụrụ obi, ma kpee ka Chineke nabata ma nyekwa mkpụrụobi ya ezumike udo, ọbụladị dịka o kpekwàrà ka ndị ahụ nwetara mmerụahụ gbakere ngwangwa.
CC Kumapayi kpọkuzịrị ndị na-anya ihe ọnyịnya ka ha na-eleta ma na-eleru ọnọdụ ihe ha na-anyà ányá oge niile tupu ha eburu ya pụta n’ụzọ; ma gwakwa ha ka ha na-ego ụkwụ ụgbọala ọhụrụ, karịa igo nke a nyàgòrò ànyà, bụkwa nke nwere ike ịgbawa oge a tụghị anya, wee wetekwa ihe ọdachi n’ụzọ dị iche iche.
Ọ dụkwara onye ọbụla ọdụ ka ọ na-enwe ndidi oge ọ nọ n’ụzọ, na-agba oke ọsọ, na-akpachapụrụ ihe ọ na-anyà, onwe ya nakwa ndị ọzọ na-agba n’ụzọ ányá n’ime oge mmemme ekeresimeesi a, iji belata ọnụọgụgụ ihe mberede okporo ụzọ na-adapụtasị ebe dị iche iche.