ỌKỤKỌ so n’anụmanụ na-ebi n’ụlọ nke mmadụ na-azụ. Mmadụ ji ịzụ ọkụkọ egbo mkpa dị iche iche dịka ihe oriri na ego.
Ọ bụ eziokwu na ọkụkọ nọ n’okpuru mmadụ n’ihi na ọ bụ anụmanụ mana o nwere ọtụtụ ihe mmadụ ga-amụta n’aka nnekwu/nwunye ọkụkọ (hen). Ihe ndị ahụ gụnyere ndị a: Mgbe ọbụla ọkụkọ na-eyi akwa, ọ na-ebu ụzọ yie akwa niile o kwesịrị iyi tupu ọ makpuru na ha, nke a gosịrị ezi nkwado. Ọzọ bụ na mgbe ọ malitere makpube n’akwa ndị ahụ, ọ na-ejizi nwayọọ emegharị ahụ ka akwa ya ghara inwe nsogbu nke gosịrị anya iri ala.
Mgbe ọ bụla ọkụkọ na-amakpu n’akwa ya ọ na-amalite taba ahụ n’ihi na ọ naghị enwezi ike iri ihe oriri otu o kwesịrị; nke a gosịrị ịchụ aja na ịnapụ onwe ya ihe. Ọzọ dịka ibe ya bụ na ọkụkọ nwere ike ịmakpu n’akwa ọkụkọ ọzọ yiri nke gosịrị enweghị mmụọ nkewa na ime amara. Ọkụkọ na-eji ndidi makpuru n’akwa ya abali iri abụọ na otu, nọrọ na nche; ọ bụrụgodu na akwa ndị ahụ emepụtaghị ụmụ ọ ga-eyi akwa ọzọ, nke a gosịrị na o nwere okwukwe, nchekwube na obi siri ike. Ọkụkọ na-achọpụta akwa ndị adịghị mma, wepụ ha nke gosịrị inwe mmụọ ịchọpụta ihe.
Ọ na-agbahapụ akwa ndị mebiri emebi ma bido lekwaba ụmụ ọkụkọ ndị ezigbo akwa mepụtara, ọbụladị na ọ dị sọọsọ otu, nke gosịrị amamihe.
Onweghị ihe ọ na-ekwe ka o metụ ụmụ ya aka; nke gosịrị ike nchekwa na ịhụnanya. Ọkụkọ na-akpọkọta ụmụ ya ọnụ nke gosịrị ịdịnotu.
Ọzọkwa, o nweghị ike ịgbahapụ ụmụ ya ganye na ha etoo nke gosịrị ezi mgbazi. Ọkụkọ na-anọ n’ihu ụmụ ya mgbe ọbụla ha na-aga, nke gosịrị ezi onye ndu.