ÒTÙ e jiri inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka wee mara, bụ òtù ‘Love Care For The Needy Foundation’ site na njikọaka ya na ‘Sharing Life Issues With Ifeomamebe’ — bụ ihe mmemme redio a na-eme n’ụlọ mgbasàozi Anambra Broadcasting Service (ABS) dị n’Awka — ejirila ihe erimeri na ihe ndị ọzọ dị iche iche wee gbaara ndị ikedịnobi ekeresimeesi, bụ ndị ọlụsị nakwa ndị nwere nkwarụ n’akụkụ ahụ ha dị iche iche.
Ya bụ mmemme ikesà ihe wéréré ọnọdụ n’ụlọụka ‘St Peter’s Parish Amawbia’ dọtàrà ọtụtụ ndị ikedịnobi sitere mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ wee bịa, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kesàárá ha ihe erimeri dị iche iche gụnyere àkpà osikapa, oche ndị ngwọrọ, ákwà, mkpọ na ihe ndị ọzọ.
A nọkwara na ya bụ mmemme wee nye ọgwụgwọ maka ndị nwere ọrịa anya dị iche iche, ma kesàkwara ha ugegbe anya nakwa ọgwụ, bụ nke site n’aka Dọkịta Ijeoma Muoka, dịka ntụnye nke ya, iji hụ na ndị ahụ nọkwa n’ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgbà.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onye na-eme ihe mmemme redio ahụ bụ ‘Sharing Life Issues with Ifeomamebe’ na ABS, bụ Maazị Okechukwu Ojiakor gwàrà ndị ikedịnobi ahụ ka ha tụkwasị obi ha na olileanya ha niile na Chineke ma gharakwa ịhụta ọnọdụ ha dịka ihe mgbawa obi maọbụ ihe ndọghachi azụ, n’ihi na ọ dịghị ihe nyịrị Chineke omume.
O kelekwazịrị ndị tụnyere ụtụ n’ụzọ dị iche iche iji hụ na ya bụ ịgbara ndị ahụ ekeresimeesi gara nke ọma, ọbụladị dịka o kelekwara onyeisi ụlọọrụ ABS, bụ Maazị Uche Nworah maka nkwàdo ya na ụlọọrụ ya na-enye ihe mmemme ahụ bụ ‘Ifeọmamebe’ bụzị nke a na-egè site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.
N’okwu nke ha n’ótù n’ótù, ụfọdụ ndị soro rite urù n’ihe ahụ e kesàrà ụbọchị ahụ, nke gụnyere Maria-Ngozichukwu Onyibor na Simon Ozoemena kèlèrè ndị ahụ maka ichèta ha nakwa ọnọdụ ahụ ha nọ na ya n’oge ekeresimeesi a site n’inye ha ihe dị iche iche ga-eme ka ha ñụrịa ma sokwa ibè ha kwee oyooyoo n’oge mmemme ekeresimeesi a.
Ndị ikedinobi sonyere na mmemme ahụ.
Ha gbakwara akebe na Chineke esitélá n’ihe mmemme redio ahụ bụ ‘Ifeọmamebe’ wee metụ ọtụtụ ndụ aka ma gbanwekwara ọtụtụ mmadụ ọnọdụ dịka ọ dị taa. Ha gara n’ihu kelee ndị ahụ na-ahazi ya bụ ihe ma kpee ka Chineke gọzie ha ebighịebi.
Mmadụ isii n’ime ndị ikedịnobi ahụ bịara mmemme ahụ nọkwara n’ebe ahụ wee nweta ohere agụmakwụkwọ n’efu ruo ogoogo sekọndịrị niile, site n’aka otu onye n’ime ndị bịara mmemme ahụ, bụ Dọkịta Ekwunife Obidiegwu.