AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwenwòóla nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n’ịkwàdo na n’ịkwàlite ezi ọnọdụ mmụta bụ ịgbà na steeti ahụ.
Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a na mmemme àgbà nke iri ise na asatọ nke ọgbakọ isi ọchịchị ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ule ‘West African Examinations Council’ (WAEC), bụ nke weere ọnọdụ na steeti Anambra na nsonso a.
Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke kọwàrà mmụta dịka ihe dị oke mkpà na nkwàlite na mmepe obodo ọbụla, bụzị nke mere ọchịchị ya ji atụnye ụtụ pụrụ iche na ngalaba mmụta steeti ahụ.
Ya bụ Gọvanọ mere ka a mara ụfọdụ ịgbà dị iche iche ọchịchị ya tigoro na ngalaba mmụta steeti ahụ, bụkwa nke mịtagoro ọtụtụ ezi mkpụrụ dị iche iche ma wetakwara steeti ahụ ọtụtụ nturu ùgò n’asọmpi na ule dị iche iche, nke WAEC sokwa n’otu n’ime ha, ma kwenwòó nkwà na ọchịchị ya agaghị ada mbà n’inye ya bụ ngalaba nkwàdo, iji wee gaa n’ihu imewanye nke ọma.
Oge ọ na-agbape ya bụ nnukwu ọgbakọ kpọmkwem, Gọvanọ Obianọ jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo isi ọchịchị ụlọọrụ WAEC ka ha wepụta atụmatụ bụ ịgbà a pụrụ isi wee gbochie izu ohi n’ule, iji mee ka ya bụ ule nọsie ike n’ezi ọnọdụ ahụ ọ nọ ugbua dịka ọkaibe nakwa ule kachasị nwe ùgwù na mpaghara ọdịda anyanwụ mba Africa.
Na mbụ n’okwu ya, onyeisioche mmemme isi ọchịchị WAEC n’ala Nigeria, bụ Hajia Binta Abudulkadir, nke ọ bụ Ọkammụta Solomon Ororundare nọchitere anya ya, kelère steeti Anambra maka ile ọbịa n’ọgbakọ ahụ nke ahọ a, ma kpọpụtasịkwa ihe dị iche iche ụlọọrụ WAEC mepụtagoro nakwa ihe ọhụrụ dị iche iche ha webàtàgoro n’ule ahụ iji mee ka ọ kawanye mma n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche.
Okeke (nke atọ n’aka nri) na ụfọdụ ndị ọzọ sonyere n’ọgbakọ ahụ.
Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ WAEC dị n’Abụja, bụ Maazị Patrick Areghan kèlèrè Gọvanọ Obianọ na ọchịchị steeti Anambra maka nkwàdo ya nye WAEC, ọkachasị site n’ikwe ka ule ahụ were ọnọdụ na steeti ahụ na nsonso a, n’agbanyeghị ajọ ọdachi ọrịa nje korona. O kwezịrị nkwà na ha ga-aga n’ihu ịkwadokwa ọchịchị steeti ahụ n’ụzọ ọbụla ha nwere ike, iji mezùpụtachaa ọmarịcha ebumnobi dị iche iche o nwere banyere agụmakwụkwọ na steeti ahụ.
A nọrọ na ya bụ mmemme wee kpọọ ma nyegasịa onyinye nkwanyeùgwù nyegara ụmụakwụkwọ na ụlọakwụkwọ dị iche iche kacha mee nke ọma n’ule ahụ n’ime ahọ gara aga bụ nke e wepụtara mpụtara ya n’ime ahọ a. Ndị e nyere ya bụ onyinye nkwanye ùgwù bụ ụmụakwụkwọ gbara onye nke mbụ, onye nke abụọ, na onye nke atọ n’ule ahụ nke ahọ gara aga, tinyékwara ụlọakwụkwọ kacha mee nke ọma na ya bụ ule, nke gụnyere ụlọakwụkwọ ‘Marist Comprehensive College, Nteje’, ụlọakwụkwọ ‘Estate Secondary School, Onitsha’, na ụlọakwụkwọ ‘Christ the King College, Onitsha’, bụ ụlọakwụkwọ dịgbàdò n’ime steeti Anambra.
Ya bụ nnukwu mmemme dọtàrà Kọmishọna na-ahụ maka mmụta na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Kate Omenugha; eze ọdịnala obodo Oko, bụ Igwe Laz Ekwueme, eze ọdịnala obodo Ụmụeri, bụ Igwe Ben Emeka, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ sitere mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria wee bịa ya bụ ọgbakọ.