
OKE ọñụ dàrà n’okpuru ọchịchị ‘Anambra West’ nke steeti Anambra na nsonso a, dịka onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo okpuru ọchịchị ahụ n’ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Patrick Udoba kesààrà ụlọakwụkwọ praịma ruru iri ise na asatọ dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ahụ ihe dị iche iche e ji akwàlite ọnọdụ agụmakwụkwọ na mmụta.
Ya bụ mmemme wééré ọnọdụ n’Ụmụeze-Anam bụ nke ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi sitere ụlọakwụkwọ praịma niile dị n’okpuru ọchịchị ahụ wee sonye na ya, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izù na steeti ahụ, ndị ọrụ oyibo, ndị ọrụ ụka, nakwa ndị eze ọdịnala sitere obodo dị iche iche e nwere n’ime okpuru ọchịchị ahụ.
A nọkwara na ya bụ mmemme wee kesàárá ụlọakwụkwọ praịma niile ahụ ihe dị iche iche gụnyere akwụkwọ e ji ede ihe, akpụkpọ ụkwụ, mkpịsị odee na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e kesààrà ụlọakwụkwọ niile ahụ. Onye omeiwu ahụ nọkwàzịrị na ya bụ mmemme wee kesàára ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ ọ na-anọchite anya ha n’ụlọ omeiwu àkpà osikapa na ego, maka mmerùbe mmemme ekeresimeesi. O bunyekwazịrị ọtụtụ ndị mmadụ obere ụgbọala e ji ebu ndị njem, bụ shọtụụl bọọsụ, iji kwàdó ha ịgba mbọ, ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha, nà inwee ike kwàdò ndị ọzọ.
N’okwu ya na mmemme ahụ, ya bụ onye omeiwu kesara ya bụ ihe, bụ Maazị Udoba mere ka a mara na ihe ahụ o kesààra so n’otu n’ime nkwà dị iche iche o kwere ndị ọgbọ nta nkwàdo ya ahụ oge ọ na-achụ nta nkwàdo, ma kpọpụtasịkwa ọtụtụ ụzọ dị iche iche nke ahụ ga-esi bàárá ha úrù mekwa ka ihe dịrị ha mfe, ọkachasị n’ime oge a ọnọdụ amachaghị kwụrụ n’ihi ihe dị iche iche ndị mmadụ gabigara n’ime ahọ a.
Udoba (nke mbụ n’aka ekpe) na ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ikesà ihe ahụ, tinyere ụfọdụ ihe ahụ o kesàrà.
O kwuru na ọ bụ ihe ọ na-emezị kwa mgbe kwa mgbe bụ ikesà ihe dị iche iche e ji akwàdo agụmakwụkwọ, inye ohere agụmakwụkwọ n’efu, ịkwàdò ndị ihe na-esiri ike, na ilekọta ndị okenye dị iche iche n’ọgbọ nta nkwàdo ya ahụ, ma kwe nkwà na ọ ga-aga n’ihu ime nke ahụ n’esepụghị aka.
Na ntụnye nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Anambra East’ na ‘Anambra West’ n’ụlọ nnọchianya etiti, bụ Maazị Chinedu Obidịegwu gbàrà akaebe na Maazị Udoba agbanweela ọnọdụ ọtụtụ ndị mmadụ n’okpuru ọchịchị ahụ site n’ụzọ dị iche iche nakwa atụmatụ dị iche iche o si eme nke ahụ.
Ọ kpọkukwazịrị ndị ọgba nta nkwàdo ahụ bụ ‘Anambra West’ ka ha jisie ije na-enye nwa amadi ahụ ezi nkwàdo, iji gaa n’ihu n’ezi ọrụ ahụ o ji n’aka, ma nwekwa ike imezùpụta ezi ihe dị iche iche o bu n’obi maka ha.
N’okwu nke ya, eze ọdịnala obodo Ụmụọba Anam, bụ Igwe George Ekwealor kelere onye omeiwu ahụ ma kpee ka Chineke gaa n’ihu ịgọzi ya mmaji kwuru mmaji, ka o wee mee karịa ka ọ na-eme.
Otu onye n’ime ndị soro kèta ụgbọala shọtụụl ahụ, bụ Maazị Solomon Onuorah kèlèrè onye omeiwu ahụ, ma kwe nkwà iji ya bụ ụgbọala wee gbaara onwe ya mbọ ma kwàdókwa ndị ọzọ, maka ọ na-adị mma onye e meere nọkwata, o meere ibe ya.
A nọrọ na mmemme ahụ gbaa egwu ọdịnala ma mekwa ihe ngosi dị iche iche.