ORIAKỤ Chinwe Nnagbo bụ onyeisioche otu nnọọrọonwe (NGO) Chiemma Empowerment Foundation, otu na-ahụ maka ọ dị mma ụmụaka na-arịa ọrịa nńụọbara (sickle cell) ma bụrụkwa otu onye n’ime ndị na-enyocha (monitoring committee) maka ọrịa ahụ na steeti Anambra akpọọla oku ka gọọmenti nye ha nkwado iji hụ na e busoro ọrịa ahụ agha dịka o kwesịrị.
O kwuputara nke a ka ọ wụchara n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra.
Ọ kọwara na otu ahụ na-ahụ maka ọrịa nńụọbara na-agba mbọ dị egwu site n’inyere ụmụaka na-arịa ọrịa ahụ aka dịka ịhụ na ha na-ańụ ọgwụ nke ha kwesịrị ịdị na-ańụ oge niile (routine drug), ịhụ na ha na-aga ụlọọgwụ oge o kwesịrị, ịkwụ ụgwọ ụlọọgwụ, iri ezigbo nri tinyere isite n’ụzọ nlekọta ahụike steeti bụ Anambra State Health Insurance Agency (ASHIA) wee na-enyere ha aka.
Ọ kọwara na ọrịa ahụ abụghị nke a na-agwọ agwọ n’ihi na ọ dị n’ime ọbara mmadụ kama na a ga-esite n’ezi nlekọta mee ka onye na-arịa ya bie ndụ ya ruo n’okenye.
Ọ rụtụrụ aka na ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ahụ si n’alụmdinanwunye ghasara aghasa ya na n’afọ ime atụghị anya ya.
Nnagbo gara n’ihu kwuo na otu Chiemma agbaala ezi mbọ ịgbazi ma kọwaara ọha na eze ihe ndị ha kwesịrị ịma banyere ọrịa nńụọbara. O kwuru sị: “Anyị agaala ụlọụka dị iche iche ebe anyị nyere nkuzi kọwaa maka ọrịa a, ma nyochakwaa ha iji mata ‘genotype’ ụmụaka. Anyị na-enye nkọwa n’ebe ndị ọzọ dị iche iche dịka ụlọakwụkwọ, ahịa, ụlọmgbasa ozi dịka anyị nọ ebe a ugbu a. Anyị na-agba mbọ ịhụ na ndị mmadụ nyochara ma chọpụta ọnọdụ ‘genotype’ ha tupu ha banye alụmdinanwunye.”
Ọ rụtụrụ aka na korona gbochiri ha ịga nkọwa n’ụlọakwụkwọ dị iche iche mana otu o sila dị ha ga-abagide njem nkuzi na nkọwa gbasara ọrịa ahụ n’izuụka nke abụọ n’ọnwa Febụwarị afọ a bụ 2021. O kwuru na ha ga-amalite na prima na sekọndịrị tupu ha gawa n’ụlọakwụkwọ dị elu.
Ọ dụrụ ndị ndu ụka, tinyere ndị ọchịchị obodo dị iche iche ọdụ ka ha hụ na ndị mmadụ na-eme nnyocha, ma chọpụta ọnọdụ ‘genotype’ ha tupu ha ejikọọ ha dịka di na nwunye.
Nnagbo kelere aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Wille Obiano, kọmishọna na-ahụ maka ahụike tinyere onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasara ụlọọgwụ maka ezi mbọ ha.
Otu o sila dị, ọ kpọrọ oku ka a na-enye otu nnọọrọonwe nkwado ma kọwaa na otu ahụ bụ Chiemma Foundation na-arụ ọrụ site na njikọ aka ụlọọgwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospital (COOUTH).
O kwuru na ndị na-arịa ọrịa nńụọbara kwesịrị inwe ngalaba nke ha (clinics) n’ụlọọgwụ iji mee ka ha nwetechaa ihe ha chọrọ dịka ọbara, oge ọbụla ha jiri chọ ya, n’iji na enwetaghị ihe ha chọrọ n’oge na-ebute ọnwụ ha.
Ya mere, Nnagbo kpọkuru ndị mmadụ ka ha na-emeso ndị na-arịa ọrịa ahụ nke ọma site n’ụzọ dị iche iche gụnyere ilebara ha anya n’ụzọ pụrụ iche, ịkwụrụ ndị enweghị onye ga-akwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ, tinyere ọtụtụ enyemaka ndị ọzọ.