BISHOP ụka Katọlik dayọsịs nke Nnewi, ‘Most Rev’ Hillary Okeke akwaala arịrị maka ịtụfu ọtụtụ ndụ nke dapụtara na mwakpo a wakporo ndị ụka na St Philip’s Catholic Church, Ozubulu na steeti Anambra n’afọ 2017.
Bishọp Okeke, onye kwuputara nke ahụ ka ọ na-edogharị ụlọụka ahụ asọ (re-dedication) dịka a rụgharịchara ya kpọkuru ndị otu Kraist ka ha na-asopụrụ adịmasọ nke ụlọụka ahụ dịka nke nwere ikike na nchekwa Chukwu.
O kwuru sị na Kraist gosipụtara ịhụnanya, ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha na-ahụrịta ibe ha n’anya dịka ọ rụtụrụ aka na ịhụnanya n’ebe mmadụ na ibe ya nọ bụ ihe mere ka okpukpere Kraist dị iche n’ebe okpukperechi ndị ọzọ nọ.
Ọ kwuru sị na dịka ọ bụ ụlọnsọ Chineke, o kwesịrị ka a na-ahụ ya dịka ebe ndị kwere ekwe na-ekpe ekpere, ọbụghị ebe a na-eme ndọrọndọrọ (politics). Ya mere, ọ dọrọ aka na ntị maka iji ụlọụka eme ihe ndị na-anaghị enye Chineke otito.
O kelere Aloysius Ikegwuonu, onye Ozubulu rụrụ ụlọụka ahụ, tinyere mmeso ọma ya n’ebe ndị mmadụ nọ.
N’akụkụ nke ya, Ikegwuonu kelere Chineke maka iji ya kwara ngwaọrụ n’ebe ndị mmadụ nọ. Ọ gara n’ihu kelee ndị kwere ekwe maka ekpere ha nke nyeere ya aka ka ọ gabigachara ihe ike nke mere n’ụlọụka St Philip afọ atọ gara aga, ma kpee ekpere ka ụdị ihe ọjọọ dị otu ahụ ghara ịdapụta ọzọ.