ỤLỌIKPE ukwu dị n’Ado-Ekiti na steeti Ekiti atụọla onyeisi ndịuweojii (osote kọmishọna) na onye na-edoziri ya ụgbọala (mechanic) nga mkpụrụọka (life imprisonment).
A tụrụ onye uweojii ahụ aha ya bụ Okubo Aboye gbara afọ iri ise na asaa na odozi ụgbọala ya bụ Niyi Ibrahim Afolabi gbara afọ iri atọ na iteghete nga maka ịnabata ụgbọala e zutere n’ohi site n’aka ndị ntọrị mmadụ. N’otu aka ahụkwa, ụlọikpe ahụ tụkwara mmadụ asaa ndị ọzọ nga afọ ise n’otu n’otu maka ịtọrị mmadụ.
Ndị uweojii nyochara okwu ahụ gbara ama na a chọtara ụgbọala ahụ n’ezinaụlọ Akubo Aboye, onye nke kwuputara na ya gotere ụgbọala Hilux Van ahụ site n’aka odozi ụgbọala ya bụ onye nwetara ya site n’aka ndị ntọrị mmadụ.
Ya mere, ọkaikpe, Justice John Adeyeye dịka ọ tụlechara okwu mara mmadụ abụọ ahụ ikpe, wee tụọ ha nga mkpụrụọka.