ỤGBỌALA (trọọkụ) akwọriela opekata mpe ndị ọrụ (labourers) dị iri na ise n’ọnụọgụ na mba India n’ụzọ ụtụtụ Tuzdee, ebe ha na-arahụ ụra n’akụkụ ụzọ.
Dịka ndị uweojii mba ahụ siri kwu site n’aka onyeisi mpaghara ahụ ihe mere bụ Varadbhai Patel, ya bụ ihe mberede dapụtara n’akụkụ otu ime obodo na Surat dị na Gujarat. O kwuru si na dịka ụgbọala ahụ rịrị ndị ọrụ ahụ elu, o gburu mmadụ iri na abụọ ozugbo, merụọ mmadụ asatọ ahụ bụ ndị e bugara ụlọọgwụ ebe mmadụ atọ n’ime ha mechara nwụọ n’ihi ahụ ha merụrụ.
Ndị ọrụ ahụ si na steeti agbataobi ha bụ Rajasthan.
Peter kọwara na ọkwọ ụgbọala ahụ ejikwatazighi ụgbọala ya dịka ọ kụtụuru okpete (sugar cane) bụ nke si na traktọ e bu ya wee soputa isi dịka traktọ ahụ na-abịa n’ihu ya. Ka ọ dị ugbua, ọkwọ ụgbọala ahụ so anatakwu ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ.
Otu o sila dị, Prime Minister Narendra Modi akasiela ndị ihe metụtara obi ma kwuputa na a ga-etiri ha aka n’obi (compensation), bụ ezinaụlọ ndị ahụ nwụrụ anwụ tinyere ndị merụrụ ahụ.