OTU Ọhaneze Ndịigbo, ngalaba ụmụnwaanyị nke Lagos atụọla mmamma wee kelee Chineke maka ichekwaba ha na nsogbu afọ 2020 nke gụnyere iche aka mgba korona.
Ha tụrụ mmamma ahụ n’ụlọụka SS Mulumba and David Catholic Church, Lawanson, Surulere, Lagos.
Emume oriri na ọńụńụ sochiri anya ka a gbasara ụka. Ọ bụ n’isi ọnọdụ ha, Ọhaneze Ndịigbo Secretariat ka ha nọkọrịtara wee kwanyere ụmụ Igbo ndị nwoke na ndị nwaanyị bụ ndị nke nyere otu ụmụnwaanyị ahụ tinyere ndụ mmadụ nkwado n’ime afọ gara aga ugwu.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onye ndu ụmụnwaanyị Ọhaneze Ndịigbo ahụ, Oriakụ Violet Obiora kwuru sị na ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n’afọ 2020 n’ihi ọrịa korona mana Chukwu chekwara ndụ ha.
O kelere ụmụnwaanyị ahụ maka nkwado ha na-enye ya oge niile ma tọkwaa ọtụtụ ụmụnwoke ndị Igbo ndị na-akwado ha bụ ụmụnwaanyị.
O kwuru sị: “Anyị na ekele Chineke maka idebe anyị ndụ. Onwebeghị afọ dị ka 2020. Nde kwuru nde ndị mmadụ nwụrụ n’ụwa niile ma o nweghị nwaanyị so n’otu Ọhaneze Ndịigbo tụfuru ndụ ya. Ana m ekelekwa ụmụnwaanyị maka mbọ ha. Ha na-enye m ezi nkwado.”
Ọ gara n’ihu kelee di ya bụ Chiifu Edwin Uchenna Obiorah onye ọ kọwara dịka ide nke mbụ n’ịkwado ya.
Onyeisi mpaghara na-asụ Igbo (Igbo speaking community), Chiifu Sunday Ude kpokuru ụmụnwaanyị ahụ ka ha na-agbaso udo. Dịka o siri kwu, ọtụtụ ezinaụlọ nọ n’ọgbaaghara n’ihi esemokwu di na nwunye. Ọ kọwara na ezinalọ ọbụla enweghị udo agaghị enwe ọganihu.
Ha nyere ọtụtụ ndị mmadụ onyinye nkwanye ugwu.