AZỌPỤTALA otu nwata nwaanyị na-eto eto (teenage girl) n’ụlọ nne na nna ya dị n’Umuokoro Obinkita Arochukwu na steeti Abia, ebe e ji ịga ‘chain’ wee kpochie ya n’olu na aka.
Ọ bụ n’ihi mbọ nwunye gọvanọ steeti Abia, Dọkịnta Nkechi Ikpeazu bụ onyeisioche, State Action Committee on Gender-based Violence ka e jiri mee nke a.
Ndị ụlọọrụ Nigeria Security and Civil Defense Corps (NSCDC) site n’ama si n’aka Vicar Hope Foundation and Child Protection nke Oriakụ Ikpeazu hibere, zọpụtara nwata ahụ.
Maazị Chika Ojiegbe, odeakwụkwọ (Chief Press Secretary) nke Oriakụ Ikpeazu kwuru na a zọpụtara nwata ahụ aha ya bụ Ada site n’aka ndị NSCDC ma kpọnye ya Vicar Home Foundation maka nleru anya.
Ojiegbe onye nke kwuru na Oriakụ Ikpeazu katọrọ mmegbu ụmụaka n’ụzọ ọbụla kwuru na o nweghị ihe ga-eme nne nwata ahụ ga-eji were nye ya ụdị ntaramahụhụ ahụ onye nke o kwuru na o kwesịrị ịchọ usoro ahụike ọ ga-esi nyere nwa ahụ aka maka uche ezuchaghị oke.
N’akụkụ nke ya, nne nwata ahụ bụ Oriakụ Blessing onye nke a nwụchikọrọ kọwara na nwa ya nwaanyị nwere nsogbu uche ezughị oke nke mere ya jiri kpọchie ya ka ọ hapụ ị na-agagharị ka atụrụ enweghị onye nche.
Onye nhazi (coordinator) nke Child Protection Network na steeti ahụ, Apostle Innocent Akomas onye nke so nye aka n’ịzọpụta nwata ahụ, katọrọ ajọ agwa nwaanyị ahụ kpara n’imegide nwa ya ma too NSCDC maka mbọ ha ozugbo ha nwetara ozi site n’aka Vicar Hope Foundation and The Child Protection Network.
Onye na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ na NSCDC na steeti ahụ, Maazị Ndukwe Agu kwuru na kọmandant steeti ahụ bụ Dọkịnta Vincent Ogu enyela iwu ezi nnyocha banyere okwu ahụ.