NDỊ ụlọụka St Thomas Aquinas Catholic Church G.R.A, Awka nọ ụbọchị ụka ọnwa Febrụwarị dị n’abalị iri na anọ wee mee emume jee nke ọma (sent forth) maka Fada Anthony Akabogu jibu ọkwa dịka ụkọchukwu parish na osote ya bụ Fada Solomon Anyaorah tinyere ụkọchukwu bi ebi (in residence) na parish ahụ bụ Very Rev. Msgr. Jerome Mmadueke na ndị sista abụọ bụ Mary Gaudencia Nwankwo na Maria Lotanna Abbah.
Ha nọkwa n’oge ahụ nabata ụkọchukwu parish bịara ọhụrụ bụ Fada Francis Oranye na ukọchukwu abụọ bi ebi na parish ahụ bụ Fada Emmanuel Umezinwa na Fada Victor Rowland Okoli.
Emume ahụ nke e ji aja maasị elekere itoolu were malite bụ nnọọ emume ịhụnanya n’ihi na ndị mmadụ nuputara n’igwe.
N’okwuchukwu, Fada Anyaora kọwara na Dinwenu Jesu Kristi bụ nna nwere obiọma site n’ịrụtụ aka otu o siri gwọọ onye ekpenta rịọrọ ya ka o nyere ya aka, site n’oziọma a gụrụ ụbọchị ahụ.
Msgr Mmadueke n’oge ọ na-enye ekele, gosịrị obi ọma n’ịhụnanya nke Fada Akabogu na ndị ụkọchukwụ ya na ha rụkọrọ ọrụ gosiri ya, tinyere ndị ụlọụka Aquinas niile.
Ọ rịọrọ ngọzị Chineke n’isi mmadụ niile dịka ọ rụtụrụ aka na parish ahụ bụ oyooyo.
N’akụkụ nke ya, Sista Lotanna onye kwuru okwu n’aha sista nwanne ya kelere ndị Aquinas maka ịhụnanya ha.
O kwuru sị: “Ụnụ na-egosipụta aha ụnụ – otu ezinaụlọ. Chineke ga-emejuputa mkpa anyị niile tutu anyị eruo eluigwe. Site n’okwukwu na ntụkwasa obi na Chukwu anyị ga-enye mmeri.”
Fada Akabogu, n’okwu nke ya toro ndị parish Aquinas sị: “Anyị agaghị ekelecha ụnụ ekele. Ụnụ zara m mgbe m nọ na mkpa. Agaghị m echezọ otu ụnụ siri gbaa mbọ ịzọ ndụ Ifeanyi Okafor bụ onye mechara nwụọ. Agaghịkwa m echezọ mbọ ụnụ gbara n’isi Uju Odimgbe onye Chineke jiri rụọ ọrụebube. Abu m otu onye n’ime ndị a gozikarichara n’ihi na a rụrụ m ọrụ n’etiti ụnụ. Ana m ekele Chineke maka nkwado ụnụ, ọ kachasị mmụọ ụnụ ji arụ ọrụ.”
Ọ gara n’ihu gwa Fada Oranye ka ọ rụrụ ọrụ ọma na-aga dịka ọ gbaara ya ama na ọ nọ n’ebe dị mma, ma kwe ya nkwa na ha ga-enyekwa ya nkwado.
Fada Akabogu dịka ọ na-akọwa ihe kpaliri ya mmụọ ịrụ ọrụ ịhụnanya ọ rụrụ n’ụlọụka ahụ kọwara na ịhụnanya bụ isi ọrụ Kraist rụrụ.
Ya mere, o kwuru sị: “Ọ bụ ihe ọ gwara anyị mee, ụka ọbụla enweghị ịhụnanya abụghị ụka. Ọ bụ isi ọrụ ya mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ bụ ihe anyị nọ na ya ụbọchị kwuru ụbọchị.O bụ ya bụ oziọma a gwara anyị gbasaa.”
Ndị Aquinas oge ha na akọwa njem oziọma Fada Akabogu oge ọ nọ dịka ụkọchukwu parish ha kwuru ihe ndị a: Sir Chuka Nnabuife, onyeisi (MD/CEO) Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra, ma bụrụkwa otu onye n’ọnụ na-ekwuru ụlọụka Aqunias kwuru sị: “Fada Akabogu bụ ụkọchukwu maara ihe ekwe na-akụ. Ọ dị ụzọ ihe atọ m hụtara na ndụ ya dịka ọ nọ n’ụlọụka a. Ọ bụ onye ụbụrụ ya na-anụ ọkụ. Oge niile ha nọ n’ọrụ ya na Msgr Mmadueke, Fada Anyaorah na ndị ọzọ inweghị ike ịga maasị ọbụla laa enweghị ihe omimi ịmụtara. Mgbe ụfọdụ n’okwuchukwu ya, ịhụ ya ka onyenkuzi na-eme ka ị mụta ihe ịmaghị.
Ọzọ bụ na ọ bụ onye na-akpa mmadụ. Ọ na-ekpokọta ndị mmadụ ọnụ, ma nnukwu ma obere ma bụrụ onye ume ala.
“Ọgbụgba ama bụ agadaga ụlọụka ọ rụrụ nke dị ka ‘cathedral’. Dịka ọ bịara were hụ ụlọụka ahụ ọ jiri ọgụgụ isi ya, mee ihe dị na ya, ọ kwụrụ chịm. Echetara m ihe o kwuru otu ụbọchụ n’ụka ụzọ ụtụtụ (morning mass) n’afọ 2015 nke bụ na ya kwetara ịrụpụta nnukwu ụlọụka mana nke kacha bụ ịrụpụta mkpuruobi.”
Ụlọụka St Thomas Aquinas Fada Akabogu
Nnabuife rutukwara aka na ọ bụ onye ekpere wee kọwaa na o ji ekpere wee soo ịrụpụta ụlọụka Aqunias nke Bishop dayọsis Awka bụ Most Rev P.C.Ezeokafor hụrụ ma kwuputa na ọ maka.
Ọ gara n’ihu kwuo sị: “Nke atọ bụ na mmiri agaghị amachị nzọ ụkwụ ya n’ọrụ ịhụnanya ọ rụrụ dịka ụkọchukwu. Ndị nwere nsogbu dị iche iche sitere n’ọrịa akụrụ ruo na nke obi na-agbakwute ya.
Ndị ụka gbatara ọsọ enyemaka, site n’otito nke Chukwu anyị zọpụtara ụfọdụ ndị ụka. Nke a bụ ihe kacha ihe m hụrụ n’ebe ọ nọ na St Thomas Aquinas Parish. Na Fada Anthony Akabogu, ahụrụ m ụkọchukwu dịka Melchizedek.”
N’akụkụ nke ya, Fada Blaise Ejike kwuru sị: “Ọ gbara mbọ dị egwu ọ kachasị n’inwe mmụọ mmadụ. Ọ dị umeala, ọ na-eleta ndị ọrịa, nke m mụtakwara n’aka ya. Ọ na-ege ndị nọ na mkpa ntị. Ọgbụgba ama kachanụ bụ Uju Odimgbe. Ọ bụ onye ọchịchị maara ihe ọ na-eme ma na-enwe ezi mmekọrịta n’ebe ndị mmadụ nọ ma obere ma nnukwu. Anyị na-eso nzọụkwụ ya ma na-ekpe ekpere ka Chineke na-edu ya.”
Sir J.A Ezeuchu, osote onyeisioche parish kansụl ụlọụka Aquinas kwuru sị: “Ọ bụ onye e kwesịrị ịńọmị eńọmị. Ọ na-eji mmụọ ya niile arụ ọrụ, ma nke ime mmụọ ma nke mpụta. Ọ rụrụ ọrụ dị egwu n’agadaga ụlọụka a. Anyị na-asị ya rụrụ ọrụ ọma na-aga. Ụka zigara ya ebe a na-azụpụta ndị ụkọchukwu (seminary). Ụmụaka niile ọ ga-azụpụta ga-abụ ezigbo ụkọchukwu. Ekpere m bụ ka Chineke na-aga n’ihu na-edu ya”.
Onyeisi ndị nne, Catholic Women Organisation (CWO) ụlọụka Aquinas bụ Ọkammụta Obianuju Mary Chiekezie kwuru sị: “Fada Akabogu bụ nwoke zuru oke na mmadụ, obi ruru ya ala. Ọ dị umeala n’ụzọ dị egwu. Ọ na-achawapụ na ngalaba niile – ụmụaka, ndịntorobịa, CMO na CWO. Ọ maara ihe ekwe na-akụ, amamihe juputara n’ime ya ma bụrụ onye ọchịchị dị egwu. O jighị ọrụ nke mmụọ egwu egwu, ọ na-ebu ọnụ (agụụ) ka o were zụọ ndị ozọ nrị.”
N’akụkụ nke ha, onyeisi Catholic Laity Council of Nigeria n’ụlọụka ahụ, Sir Jerry Obodo na Katikisti Aquinas bụ Nwaka A. Nwaka n’ajụjụọnụ a gbara ha n’iche iche kọwakwara Fada Akabogu dịka ụkọchukwu dị obi umeala,ma dịkwa ike na ndụ ime mmụọ ma tinyere na ọ rụchapụrụ ụlọụka ha ma hụ na e chere ya n’ihu Chineke ka ọnwa Novemba dị n’abalị iri n’afọ 2019.”
A kọwakwara na Fada Anyaora nyere aka n’ịhụ na a ruchapụrụ ụlọụka ahụ dịka ya bụ Fada Anyaora gbakwara mbọ n’ụlọakwụkwọ Aquinas Nursery/Primary School dịka onyeisi ya.
Uju Odimgbe, bụ nwaanyị Chineke sị n’aka Fada Akabogu zọọ ndụ toro ya site n’ikwu okwu nd a: “Fada Akabogu bụ nna nke mmụọ m. Ọzọ Igbo ndụ m, onye enyemaka m. Site n’amara Chineke, o nyere m ohere nke abụọ ibi ndụ n’ụwa a site n’aka ndị Aquinas.
Ha tụkọtara nde naira iri na atọ na ụma asatọ (N13.8million) maka akụrụ (kidney) nke e tinyeere m; ha gakwara n’ihu na-ekpe ekpere ka njem (operation) gaa nke ọma.”
Oriakụ Odimgbe gara n’ihu kọwaa na ha gakwara n’ihu na-eweta ego maka nleta (diagnosis) ya na-eme ugboro abụọ n’izuụka oge ahụ ma bụrụkwa ihe na-eri nnukwu ego. Ha mere ya site n’otu ndị a: Divine Mercy, St Vincent De Paul, C.W.O, ndị ụkọchukwu, ndị Aquinas niile, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano, Bishọp dayosis Awka bụ Most Rev Paulinus Ezeokafor na bishọp dayọsis Nnewi, Most Rev. Hillary Okeke.”
Ndị ụlọụka Aquinas gakwara n’ihu too Msgr Mmadueke, onye nke ha kọwara dịka onye ọrụ mgbasaozi (communicator) dị egwu, onye bulitere ụlọụka ahụ n’ogo dị elu, ma rịọ Chineke ka ọ na-aga n’ihu na-edu ya dịka ọ na-akọ n’ugbo ya.
Ụkọchukwu parish nke bịara ọhụrụ, Fada Francis Oranye kelere Chineke maka ihe niile.
Gbasara njem oziọma Fada Akabogu bụ onye ọ nọchiri anya ya, o kwuru sị: “Obi bụ m ańụrị ịmalite ebe ọ kwụsịrị. Ana m esochi ya anya maka ọ bụ ọrụ a na-arụ na-aga n’ihu. Ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ, otu onye bịara tụọ mmamma oge gara aga. Ịnyere ndị mmadụ aka so n’ọrụ anyị, anyị na-eso nzọ ụkwụ Chukwu. Anyị bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ya mere anyị na-elekọta igwe atụrụ anyị na-azụ. Abịara m ka m mụta, ya mere dịka anyị rụkọtachara ọrụ ọnụ, anyị eruo eluigwe.”