Igwe Pius Ojonile Omachonu (Ataoja nke abụọ n’Olumbanasa dị n’okpuru ọchịchị Anambra West na steeti Anambra, ma bụrụkwa onye ji ọkwa dịka Odeakwụkwọ Zuzugbe (Secretary General) otu jikọtara ndị eze ọdịnala, Anambra State Traditional Rulers Council akpọọla oku ka ndị Igbo bido n’oge na-asụrụ ụmụ ha Igbo ije mee ka asụsụ Igbo dị ọkpụtọrọkpụ. Igwe Omachonu kwuputara nke a ka onye ntaakụkọ anyị CHINWENDU UZOATU kpọtụụrụ ya n’ụlọ ezumeezu ndị eze ọdịnala nke dị n’obi gọọmenti Anambra, ebe ọ nọrọ gbaa ya ajụjụ ọnụ. Otu a ka o siri ga:
KEDỤ ihe ị nwere ikwu banyere etu e si akwalite asụsụ na omenal Igbo na gọọmenti Anambra, dịka ọ dị taa?
Ikwalite asụsụ Igbo dị mkpa. Ọ dị mma ka e tinye aka na ya ka ọ ka mma. Na nzukọ ndị eze ọdịnala anyị na-asụ Igbo nke gosịrị na anyị na-agba mbọ izi ezi ụzọ. Ebe ọbụla ndị Igbo zukọrọ sị sụba Igbo, ọ kachasị ụmụaka maka na ọ bụrụ na ebidoghị n’oge sụbara ha Igbo, ha agaghị aghọtacha ya. Igbo bụ asụsụ mbụ nwatakịrị bụ onye Igbo kwesịrị ịsụ. N’ụzọ dị otu a, ndị nkuzi kwesịrị iji Igbo na-akụziri ha maka na a bịa na mmụta, mmadụ na-amụta ihe ọsọ n’asụsụ mbụ ya. Ya mere, o kwesịrị ka ndị nkuzi mata banyere nke a; ka ha bido mgbe ha nọ n’ọtaakara na prịma.
Gọọmenti steeti Anambra na-agba mbọ dị egwu iji kwalite asụsụ na omenala Igbo. Iji maatụ, a na-enye ndịnkuzi Igbo ọtụtụ ọnọdụ pụrụ iche ma na-enyekwa ndị niile na-agụ akwụkwọ banyere asụsụ na omenala Igbo agụmakwụkwọ n’efu iji gbaa ha ume.
Ọzo dịka ibe ya bụ na ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) na-ebipụta akwụkwọ akụkọ n’asụsụ Igbo-Ka Ọ Dị Taa; ebe a na-ejikwa asụsụ Igbo agbasa ozi n’Anambra Broadcasting Service (ABS), tinyekwara Igala. Ana m akpọkukwa gọọmenti ka ọ na-akwadokwa asụsụ Igaka dịka ọ na-akwado Igbo. Ka e bidokwa mebe ihe emereme ‘Igala Mawa’ dịka a na-emebu na mbụ. Anyị dị sọ obodo ise na-asụ Igala n’Anambra, ha bụ: Nzam, Owelle, Ukwalla, Inoma na Olumbanasa. E mee onye ka e mere ibe ya obi adị ya ụtọ.
Kedụ ihe ndị fọrọ maọbụ ebe e kwesịrị ilebakwu anya, dịka o siri metụta ịkwalite asụsụ na omenala Igbo n’Anambra?
A ga na-eme ihe ngosị omenala Igbo (cultural activities). A ga na-agụ egwu n’Igbo. Gọọmenti ga na-akwado omenala Igbo dịka ịgba ọfala, ịwa ji, egwu Igbogasị w.d.g. A ga na-akwado asọmpi asụsụ Igbo n’ụlọakwụkwọ dịka edemede, nrụrịtaụka na ọtụtụ ndị ọzọ n’etiti ụlọakwụkwọ na ibe ya wee ruo n’ogogo steeti ma gazuo ‘southeast’ niile, nke bụ steeti ise jikọtara ala Igbo. Ndị tuuru ugo ga na-enwe ihe nrite dịka a ga na-eme ya na steeti Anambra.
Ị kpọta ụmụakwụkwọ n’ụlọ mgbasaozi ABS ka ha na-eme ihe emereme tinyere ide akụkọ asụsụ Igbo na National Light ga-enye nnukwu aka.
E nwegasịrị ihe iche aka mgba na-adọghachi aka elekere azụ n’ịkwalite asụsụ na omenala Igbo?
Otu n’ime ha bụ ka anyị mee ka ndị oyibo, onye asụghị oyibo ejeghị akwụkwọ. Ka m mee na ibe m mere na-adọghachi anyị azụ. Anyị na-enwekarị mmasị n’ebe asụsụ Oyibo (English) maọbụ French nọ karịa Igbo maka na Igbo bụ nke anyị.O kwesịrị ka anyị jiri asụsụ Igbo kpọrọ ihe maka na onye kpọọ ọba ya mkpọkọrọ agbataobi ejiri ya kpoo ntụ.
Gịnị ka I chere e kwesịrị ime maka akwụkwọ Ka Ọ Dị Taa?
Otu e si hazi akwụkwọ akụkọ Ka Ọ Dị Taa bụ ịgba n’ihi na ya na nke oyibo na-adịkọta ọnụ n’otu akwụkwọ. Nke a ga-enyere ndị mmadụ aka ịgụ ihe e dere n’asụsụ Igbo. Ma otu ihe m chọpụtara a ga-eleru anya bụ ụdị akwụkwọ e ji ebipụta ya. Ọ ga-aka mma ka e jiri akwụkwọ siri ike wee na-ebipụta ya.
Onyeisi ANPC bụ Sir Chuka Nnabụife maara ihe ekwe na-akụ. Ọ na-agba ezi mbọ na mmekọrịta ụlọọrụ ahụ na gburugburu ya. Ana m asị ya jide ka o ji maka na ọ maara ihe ọ na-eme.