BISHỌP ụka Katọlik Dayọsis Awka bụ ‘Most Rev. Dr’ Paulinus Ezeokafor nọ na Satọdee gara aga gbaara ndị onweghị ka ọ ha karịrị narị atọ n’ọnụọgụ Isita, site n’ibunye ha ihe nri dị iche iche.
Ndị ahụ ritere onyinye ndị ahụ bụ ndị si n’okpukperechi na agbụrụ dị iche iche nwetara akpa osikapa, ogbe ji ga, yabaasị, ego na ọtụtụ ihe nri ndị ọzọ.
Ka ọ na-ekesa ihe ndị a n’obi Chukwu St Patrick’s Cathedral, Awka, Bishọp Ezeokafor kọwara na onyinye ndị ahụ bụ iji me ka ndị onweghị ka ọ ha soro ńụrịa na mmemme Isita.
Dịka o siri kwu, Isita bụ emume kacha emume a na-eme n’okpukperechi Kraist, mana ọ bụ oge e ji atụgharị uche n’ọnwụ na mbilite ọnwụ Jesu Kristi.
O kwuru sị: “Anyị na-enyechigha site n’ihe anyị nwetara n’aka ndị o metụrụ n’obi. Anyị chọrọ ka ndị o nweghị ka ọ ha sonye na mmemme a. Anyị chọrọ ka ha soro ndị ọzọ ńụrịa n’emume Isita. Nke a bụ ome n’afọ nke anyị na-eme, anyị ga na-aga n’ihu na-eme ya dịka anyị na-aga n’ihu na-enweta site n’aka ndị ọzọ. Anyị na-eme ya Tọọzdee izizi n’ọnwa ọbụla, ma a na-akwado nke a n’ụzọ pụrụ iche n’oge emume Isita ọbụla. N’afọ gara aga, anyị mekwara otu aka ahụ n’oge Ekeresimesi n’ihi iche aka mgba korona.”
Ya mere, Bishọp Ezeokafor gara n’ihu kọwaa na emume Isita bụ oge ịhụnanya. Oge e ji echeta otu Onyenweanyị Jesu Kristi si bịa n’ụwa, taa ahụhụ, nwụọ maka anyị ma bilite n’ọnwụ.
O kwuru sị: “Anyị kwesịrị ileba anya na ndụ anyị ma gbaa mbọ hụ na ka anyị tachara ahụhụ n’ụwa na anyị ga-enwe ańụrị ebeebe n’eluigwe. Ya mere, ana m akpọku onye ọbụla ka ọ gbaa mbọ maka nzọpụta anyị.”
Otu nwaanyị onye steeti Abia aha ya bụ Oriakụ Bridget Nwachukwu kelere Bishọp maka onyinye ndị ahụ, ma kwe nkwa na ha ga-ebi ndụ maka Kraist.