OGE Isita nke a nọ n’elu ya ugbu a na-abụ oge mmemme dị iche iche. Ndị mmadụ na-esite n’ugwu na ndịda na-aga mmemme n’ebe dị iche iche n’ihi na agha a kara aka anaghị eri ngwụrọ.
Ụbọchị ụka gara aga ka ndị otu Kraịst n’ụwa niile mere emume Isita, nke bụ oge e ji echeta mbilite n’ọnwụ ya. Kemgbe ahụ ka a malitere mmemme n’ike n’ike. Ọ bụ eziokwu na a dị mbụ eme mmemme ma nke oge a na-adị egwu.
Mmemme a na-eme n’oge a gụnyere ịgba nkwụ nwaanyị, agbamakwụkwọ, ịgba ọfala, ịchi ọzọ, ịkpọghe ụlọ; tinyere na n’oge ugbu a ụfọdụ na-ejikwa oge a eme emume akwamozu na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
N’agbanyeghị ihe isi ike cheere ala anyị aka mgba ugbu a, ndị mmadụ na-aga n’ihu na mmemme ndị ha nwere. Onye ọbụla na-eme ole o nwere ike maka na Igbo kwuru okwu sị na ọ bụ ole aka ha nwaanyị ka ọ na-atụkwasa di ya.
N’agbanyeghị na oge a bụ oge mmemme ọ bụkwazi oge oriri na ọńụńụ, na oge e ji egosipụta ịhụnanya site na mmadụ ileta onye ọ ka mma. Ụfọdụ na-ebunye ihe oriri, akwa, ego w.d.g.
Otu nwaanyị kwuru sị: “Emume Isita bụ ome n’afọ. Ọ bụ ụbọchị ụka pụrụ iche n’ihi na ọ bụ ụbọchị e ji echeta mbilite n’ọnwụ Onyenweanyị Jesu Kristi. Ma otu o sila dị, e mere m ole aka ha m. E siiri m ụmụ m osikapa nke anyị dị mbụ eri. Mana anyị riri osikapa ụbọchị ahụ n’ụzọ pụrụ iche ma nwee ańụrị.
Nwaada Adaeze: Anyị gburu torotoro gbukwaa ọkụkụ. Anyị ji torotoro sie osikapa ụbọchị Isita kpọmkwem ma jiri ọkụkọ sie ofe na Monde. Nna m gotakwara mmanya ọtọ bịrịbịrị nke anyị niile ńụrụ ma kelee Chineke.
Oriakụ Mma: Ụbọchị Isita kpọmkwem bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ nwa m nwoke. Yaabụ ụbọchị ahụ bụ ụbọchị o tinyekwara otu afọ n’ime ndụ ya, o wee bụrụ ihe oke ọńụ ụzọ abụọ. Ekele dịrị Chineke maka nke ahụ. Chineke dị afọọma na ebere. Ọdịghị mfe na anyị dị ndụ ma nwekwaa ezi ahụike. Onye ọbụla dị ndụ agbaala Isita.