… Chie Nnabuife, Udokwu, Okafor, Enemali, ndị ọzọ echichi
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma bụrụ emume dara ụda n’Isita Monde, ọnwa Epure dị n’abalị ise ka Eze Nwaozekwe Okeke, Igwe Ukwu 1 n’Oroma Etiti nke dị n’okpuru ọchịchị Anambra West gbara ọvala. Ọ nọ na ya mee emume agbamafọ iri iteghete na otu, cheta afọ iri anọ na ise o jiri nọrọ n’oche eze ma chie ọtụtụ ndị mmadụ echichi nke gụnyere ‘Sir’ Chuka Nnabuife, onyeisi (MD/CEO) Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra.
Emume ọvala ahụ nke weere ọnọdụ n’ụlọakwụkwọ Hope Rising Primary School, Oroma Etiti kpọkọtara ọtụtụ ndị mmadụ e ji okwu ha agba izu.
Igwe ukwu nabatara ọha na eze bịara mmemme ahụ. Ka ọ na-ekpunye ndị o chiri echichi okpu ka ọ na-enye ha aha n’otu n’otu.
N’okwu ya, Chuka Nnabuife onye e chiri echichi chiifu ma nye ya aha- Iru Ọma 1 n’Anam gosipụtara afọ ojuju o nwere maka nnukwu ugwu ahụ a kwanyeere ya. O kwuru sị: “Obi dị m aṅụrị na Oroma Etiti hụtara m dịka onye a ga-echi echichi n’ụbọchị taa. Abịabeghị m obodo a mbụ, taa bụ izizi m na-abịa na ya. Ya mere, bido taa gaba mụ na ha abụrụla otu. Ihe gbasara ha ga na-emetụta m. Ana m ekele Igwe Ukwu n’ụzo pụrụ iche.”
Nnabuife gara n’ihu gọọrọ Igwe Ukwu ọfọ ma kelee ya maka mbọ ya. O kelekwara ndị enyi na ikwu na ibe ya, tinyere ndị ọrụ ya bụ ndị ANPC maka isonyere ya ma kwadokwa ya na mmemme ahụ.
N’akụkụ nke ya, Kọmishona na-ahụ maka azụmahịa (Commissioner for Trade and Commerce) na steeti Anambra bụ Chiifu Uche Charles Okafor so n’otu onye n’ime ndị e chiri echichi ma bụrụ onye e nyere aha Ibobo Anam kelere Igwe Ukwu maka echichi o chiri ya. O kwere nkwa ezi nkwado n’ebe Oroma Etiti nọ dịka ọ ga na-eleru anya na-ahụ na ihe ọma ga na-abata n’obodo ahụ.
Otu nwa afọ Oroma Etiti sokwa na ndị e chiri echichi aha ya bụ Chiifu Anthony Onyekwe Onuorah, onye e chiri Ojilichukwubuluzọ 1 n’Anam kwuru sị na obi dị ya ụtọ iso n’otu onye na ndị e kpunyere okpu. Ọ kpọrọ oku ka ndị mmadụ ṅomie eziomumu ma kwe nkwa inye obodo ya bụ Oroma Etiti nkwado oge niile. Ọ gọọrọ Igwe Eze Ukwi ọfọ ogologo ndụ na ahụike.
Diọkpara Eze Ukwu bụ Prince Anthony Aniukwu Okeke, Ogbuevi Amalụ Mee Nwanne ji ọṅụ nabata ndị mmadụ ma gbaa ezi mbọ iji hụ na ọ bụ ihe e kwuru ka a na-eme. O gosipụtara n’ezie na agha a kara aka anaghị eri nwa ngwọrọ; na nna ya bụ Igwe zuru oke ka aha ya siri dị.
N’okwu ya, Prince Rapuluchukwu Nwozekwe kọwara ụbọchị ahụ dịka ọpụru iche n’ihi na nna ya bụ Igwe na-agba ovala, na-emekwa ọgbụgba afọ iri iteghete na otu, tinyere ncheta afọ iri anọ na ise ọ nọrọla n’oche eze Oroma Etiti. O kwuru sị na emume ọfala bụ ememe na-eweta oganihu, akụ na ụba.
Ọ gara n’ihu kwuo sị:”Igwe bụ onye udo, ọ na-atọ ezi ụkpụrụ, anyị na-eso nzọ ụkwụ ya. Site n’usoro ọma ya, o hibere udo n’Oroma Etiti. Ya mere, anyị na-ebunye Chineke otito niile.”
N’ekele ya, Iwuchukwu Philip Okeke, onyeisi National Identity Management Commission (NIMC), steeti Anambra kọwara ụbọchị ahụ bụ oke ụbọchị. O kelere ọha na eze bịara mmemme ahụ ma gọọrọ ha ọfọ ọma dịka o kelekwara Igwe Ukwu n’ụzọ pụrụ iche.