
Butere ha ihe onyinye maka adịmọcha
NDỊ òtù Rotary nke Awka G.R.A kpọtụụrụ ụlọakwụkwọ St Thomas Aquinas Nursery/Primary School, Awka. Alex Okwuoyibo, onye kwuputara ebumnobi ha jiri bịa kọwara na ọ bụ n’ihi ụbọchị mba ụwa wepụtara maka ịkwọ aka ‘2021 Hand Washing Day’. Ha ji ihe onyinye ndị ga-enye aka maka i debe gburugburu ọcha, tinyekwara igbochi ọrịa korona.
Ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ ji baandị ụlọakwụkwọ wee nabata ha nke mere ka ọńụ si n’elu na ala daa ebe ahụ n’ihi na ihe dị mma na anya gbara akwụkwọ.
Onyeisi òtù ahụ bụ Izunna Somadina Okwelogu toro ha maka adịmọcha. O kwuru sị: “Obi bụ anyị ańụrị ańụrị ịhụ ụnụ, o nwere oge anyị dị ka ụnụ. Anyị bịara ebe a ichetara ụnụ na adịmọcha dị mkpa. Anyị na-enye ụnụ ihe ndị a, nkata (baskets), bọkeeti, aziza, ncha, sanitaiza, akwa mkpuchi ihu na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ka ụnụ were na-edebe onwe ụnụ na gburugburu ụnụ ọcha.”
Okwelogu gara n’ihu gwa ha ka ha kụọrọ onwe ha aka maka adịmọcha ha na-adị.
N’akụkụ nke ya, Ken Aniemena kwuru ihe ndị a ka ha gụchaa egwu Igbo a: ‘Akwụkwọ na-asọ ụsọ’; “Ụmụ m, aga m achọ ka ụnụ na-echeta egwu a oge niile ma na-emejuputa ya. Nne na nna ụnụ nwere ego, ọ bụ ya ka ụnụ jiri nọrọ ebe a. Ka m na-ele ụnụ anya n’ihu ka m na-ahụ ndị ọchịchị ga-apụta ihe n’ọdịnihu dịka ndị sinetọ, gọvanọ, ndịisiala, ndịisi ọba ego mba ụwa dịka Okonjo Iweala w.d.g. Ụnụ ga-agba mbọ iji ruo ogogo ndị a. Jụọnụ ajụjụ. Dịka ụnụ na-ekwe ‘Amen’ ọ ga-abịa na mmezu n’aha Jesus.”
Ọ gara n’ihu site n’ichetara ha na ọrịa korona dịkwa ire n’eziokwu ma dọọ ha aka na ntị ka ha na-ekpuchi ihu ha oge niile. Ọ gwara ha ka ha na-akwọ aka oge niile ma na-asụkwa akwa akwụkwọ ha tinyere idebe gburugburu ọcha.
Aniemena kpọkuru ha ka ha bata n’otu ahụ bụ Rotary Club. Ọ kọwara na ha nwere ngalaba ụmụakwụkwọ na ya ma kwuo na otu ahụ so n’otu kacha pụta ihe n’ụwa niile ma bụrụ nke na emetụta ndụ mmadụ n’ebe ọ dị ukwuu. Ọ kpọkukwara ndị nkuzi ka ha sonyere ha.
Onyeisi ụmụakwụkwọ (senior prefect), Edochie Esther n’aha ụmụakwụkwọ ahụ kelere ha maka mmeso ọma ha ma kpekwaa ka Chineke gozie ha.
Ihe kacha pụta ihe na mmemme ahụ gụnyere ụgwọ akwụkwọ ha kwụụrụ Ezeliora Chinenye nọ na prịma 2 bụ onye akwubeghị ụgwọ akwụkwọ n’ihi ka ọnọdụ siri dị.
Onyeisi ụlọakwụkwọ bụ Oriakụ Ngozi Nwanwko ji ọńụ were kelee ha. O kwuru sị: “Afọ juru m maka ihe a ụnụ mere. Ekpere m bụ ka e sikwa otu a mere ya ndị nke ụnụ.”