NDỊ uweojii kọmandị Ekiti azọpụtala ụmụejima gbara afọ abụọ bụ ndị nne ha kpọchibidoro ụzọ n’ime ụlọ abalị atọ.
Ozi si n’aka okwupụta okwu ndịuweojii n’Ado-Ekiti bụ Maazị Sunday Abutu kwuru na ya bụ ihe mere n’Igbara-Odo dị n’okpuru ọchịchị Ekiti South-West na steeti ahụ.
Abutu kọwara na ndị uweojii zọpụrụ njem n’ihi oku sitere n’aka otu ezi mmadụ wee zọpụta ụmụejima ahụ bụ ndị eribeghị nri kemgbe abalị atọ.
O kwuru si na otu nwaanyị onye nke e mechara mata aha ya dịka Joy Fatoba nke Igbara-Odo kpọchibidoro ụmụejima ya n’ime ọnụụlọ ya ma kwuo na ya ga-egbu ha ma mmadụ ọbụla gwa ya ka ọ kpọgheere ha ụzọ.
Ọ gara n’ihu kọwaa na dịka a gbara nwaanyị ahụ ajụjụ ọnụ, o kwuru na nna ụmụaka ahụ gbahapụrụ ya n’afọ ime laa Calabar ma jụ ịlọta lekọta ya na ụmụaka ahụ wee ruo taa. Na ya enweghịzị ike ilekọta onwe ya na ụmụaka ahụ anya n’ihi na ọrụ idozi isi (hair dressing) ya na-eme anaghị agazi nke ọma.
Okwuputa okwu ndị uweojii ahụ kwuru na ahụ adịghị ụmụejima ahụ mma oge a gbaputara ha, tinyere na ha enweghị ike ịkwụ ọtọ maọbụ gaa ije n’onwe ha n’ihi ańụghị mmiri na erighi ihe oriri dịka o kwesịrị. Na a kpọgaziri ha ụlọọgwụ ozugbo maka nnyoha na ọgwụgwọ.
Abutu kwuru na kọmandị ahụ ga-aga n’ihu hụ na ụmụaka ahụ na nne ha nwere ezi nchekwa dịka a na-aga n’ihu inyocha ihe kpatara ọnọdụ ahụ.
O ji ohere ahụ kelee ezi mmadụ ahụ kpọrọ oku e ji zọpụta ụmụaka ahụ maka mbọ ya, ma kpokuo ọha na eze ka ha na-akpọtụrụ ogige ndị uweojii dị ha nso maka ọnọdụ ọbụla a na-enyo enyo.