IJI nweta akụkọ dị mkpa na ihe na-eme n’ulọ akwukwọ dị elu n’ihi ajọ ọrịa dị ugbu a bụ koronavaịrọsụ, ụzọ ha sị egbochi ọrịa ahụ, usoro ha ji enye ụmụakwụkwọ nkuzị zuru oke maka ogologo ọnọdụ ha nọrọ oge ‘lockdown’ nakwa ngagharị iwe #EndSARS, oge ha ga-amalite ịnabata ụmụakwụkwọ ọhụụ, nakwa etu ndị isi ha sịrị hazie usoro nnabata a n’ihi ọnụọgụ ụmụakwụkwọ, tinyere ngwa ọrụ ha nwere iji gbochie nkesa ọrịa ahụ n’ime ụlọakwụkwọ; onye nta akụkọ anyị gara Federal Polytechnic, Oko maka nke a.
Oge a na-agba ya ajụjụ ọnụ, onye jị ọkwa dịka rejịstra nke nnukwu ụlọ akwụkwọ a bụ Maazị Obini Onuchukwu ma bụrụ onye a họpụtara n’afọ gara aga kọwara na mmekpa ahụ ọrịa koroa bụ nnọọ nke metụtara ụwa niile.
N’okwu ya, ọ sịrị, “Ọ ghasara usoro kalenda agụmaakwụkwọ n’ụwa niile nakwa ọtụtụ ụzọ dị iche iche e si enweta ezi agamnihu, bịa wetere anyị oke ihe isiike dị oge ugbu a n’ụzọ metụtara akụ na ụba n’ala anyị bụ Nigeria nakwa n’ụlọakwụkwọ. Anyị na agba mbọ iji mee ka ụmụakwụkwọ anyị na-agụ akwụkwọ mgbe ọbụla ma na aga n’ihu ịhazị ule agba nke abụọ tupu anyị e mee emume nnabata ụmụakwụkwọ anyị bụ ‘matriculation’. Dịka ọ dị ugbu a, anyị agbaala mbọ ịsonye n’atụmatụ niile gọọmenti tụpụtara ma hazie otu anyị kpọrọ ‘Safe Reopening of Institution Against COVID- 19’ nke ọrụ ha bụ ịgba mbọ mgbe ọbụla ma hụ na onye ọbụla sonyere n’usoro e si egbochi ọrịa ahụ tinyere ihụ na mmiri e ji akwọ akọ, ncha na sanịtaịza dị ebe dị iche iche n’ime ụlọakwụkwọ anyị”.
Maazị Onuchukwu gara n’ihu kwuo na ụlọakwụkwọ a arụpụtala igwe ha ji enyocha maka ọrịa ahụ ma bụrụ nke na-anata ike ya site n’anyanwụ.
“Ya bụ ihe bụ ihe gbagwojuru anya ma sie ike na ọnọdụ dị etu a dakwasịrị ụwa niile gbara gburugburu. Anyị maara na Chukwu Abịama mazuuru ihe niile dịka ọ dị n’ubọchị taa ma na-enyekwara anyị aka n’ụzọ dị iche iche anyị si atụpụta aro maka ọ dị mma ụlọakwụkwọ anyị. Federal Polytechnic Oko na- agba mbọ ihụ na anyị sonyere n’atumatu gọọmenti tụpụtara iji gbochie ajọ ọrịa korona a.
Dịka ọ dị ugbu a, ụlọakwụkwọ anyị ga-achịkọba emume nnabata ụmụakwụkwọ nke afọ a n’ikuku. Ọ bụ iji gbochie mmetụta ahụ mmadu na ibe ya ebe ụmụakwụkwọ anyị nọ. Ule akwụkwọ anyị ga-adịkwazị n’ụdị dị iche n’ihị oke ọnụọgụ ụmụakwụkwọ. Ọ bụ naani nsogbu ego ka anyị na-enwe oge ugbu a n’ụzọ metutara ịlekọta ụlọakwụkwọ anyị anya nke ọma. N’otu aka ahụ, anyị nwere olile anya na ndị nkwado anyị maara maka nke a”.