N’Awka, Action Alliance ehibela ọnọdụ na steeti Anambra

0
24
Omo-Aje (nke ise n'aka ekpe), Abdulrasheed (nke atọ n'aka ekpe), Ekeji (nke anọ n'aka ekpe), Esevihare (nke isii n'aka ekpe) na ndị ozọ mgbe ha nọ na mmemme ahụ.

OTU ndọrọndọrọ ọchịchị Action Alliance (AA) nọ na Satọdee gara aga ọnwa Epure dị n’abalị iri na asaa wee hibe ọnọdụ ha (Secretariat) n’Awka, steeti Anambra. Emume  ahụ bụ nnọọ nke ndị isi ọchịchị ha si mpaghara dị iche iche n’ala anyị wee wụchaa n’Awka, nke onyeisioche ha n’ala anyị bụ  Adekunle Rufai Omo-Aje nọ n’isi ya.

  N’ozi ya, onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na steeti Anambra  Justina Nonyerem Ekeji nabatara ndị ahụ bịara njem ahụ, ma kelee Chineke maka idute ha steeti Anambra n’udo dịka ọ rịọkwara nchedo ya n’isi ha niile n’otu n’otu ka ha nọ na njem ahụ.

  O kwuru sị: “Nje m ụnụ bịara na steeti Anambra ewulitela nchekwube anyị n’ebe otu ndọrọndọrọ ọchịchị Action Alliance nọ. O wetala ịgba ume na ngozi n’ebe onye ọbụla so n’otu a na steeti Anambra nọ. Action Alliance, dịka ị nọ n’isi ya abụrụla otu ndọrọndọrọ ọchịchị e wugharịrị nke na onye ọbụla so na ya nwere ezi ntụkwasa obi na ya nọ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị mma. Mụ na ndị otu m na steeti Anambra dịka anyị na-esonyere nzọ ụkwụ gị na-ekwe gị nkwa na anyị agaghị agharịpụ gị.”

  Otu o sila dị, oge a gbara ya ajụjụ ọnụ, ọ kpọkuru ụmụnwaanyị ka ha nuputa n’igwe ma nye nkwado ha n’ihi na ebe ọbụla nwaanyị nọ, ihe na-aga nke ọma.

  N’okwu ya, onyeisioche zuzugbe ahụ bụ Omo-Aje nyere Chineke otito niile maka nhibe nke e hibere otu ndọrọndọrọ ọchịchị Action Alliance na steeti Anambra.

  O kwuru sị: “Anyị chọrọ ka ndị mmadụ mata na onye ọbụla nwere ike ịba uru. N’otu ndọrọndọrọ ọchịchị Action Alliance, ikike (ticket) bụ n’efu n’ebe ụmụnwaanyị na ndị ntorobịa nọ. Enwetala m mmeri ugboro ugboro site n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị mmadụ esochaghị na ya. Onwebeghị mgbe m dara na nhọpụta ọchịchị.”

GUO:  N'Awka, ndị Katọlik emeela ngagharị ekpere maka ọnọdụ Nigeria

  Site n’ajụjụ a jụrụ ya ma o nwere nkewa ha nwere n’otu ahụ bụ Action Alliance, ọ kọwara na ha enweghị nkewa ọbụla, ma taa ụfọdụ ndị ntaakụkọ ụta, ka ha kpachara anya ha ma lebaa anya nke ọma tupu ha agbasaba ozi. Na ha kwesịrị ịchọpụta nke bụ eziokwu oge niile. Ọ kọwara na ọ bụ ya bụ onyeisioche zuzugbe Action Alliance n’ala anyị bụ Nigeria, ma kọwaa na akụkọ banyere otu onye si na ọ bụ ya bụzi onyeisioche otu ahụ, dịka akụkụ abaghị uru.

  Otu o sila dị, Omo-Aje kwere ndị otu ha na steeti Anambra nkwa nkwado ha oge niile. O kwuru sị: “Anyị nwere ihe niile a chọrọ iji nweta mmeri na nhọpụta ọchịchị. Ana m ekwe onye ọbụla nkwa na anyị agaghị enwe nsogbu ego. Anyị agaghị amanye ụnụ amanye na nhọpụta, kama anyị ga-ahapụ ụnụ ka ụnụ jiri aka ụnụ họpụta onye ọbụla ụnụ chọrọ, n’onwe ụnụ.”

  Ode akwụkwọ (National Secretary) bụ Amb. Suleiman Abdulrasheed toro onyeisioche ahụ maka mbọ ya na ịhụ ụzọ, tinyere ndịisi, na mmadụ niile. O kwuru sị: “Anyị dị njikere. Ọchịchị onye kwuo uche ya bụ ihe ghe anya oghe. Otu ahụ ( one body) dịka nche mmiri kpuchitere otu ndọrọndọrọ ọchịchị niile.”

  Ọ dụkwara ndị ntaakụkọ ọdụ ka ha na-eleba anya nkeọma n’akụkọ ọbụla tupu ha agbasaba ya.

  Onyeisi ụmụnwaanyị (National Women Leader) Nwaada Esther Esevihare kwuru sị: “Otu ndọrọndọrọ ọchịchị a eguzorola. Anyị ga-enwe ntụkwasa obi n’ebe onyeisi anyị nọ, anyị nọ ebe a inye steeti Anambra nkwado. Anyị ga-arụkọ ọrụ ọnụ iji gbanwee ala anyị. Ka anyị kwalite ala anyị.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here