Fada Nwosu arịọla Bishọp Ezeokafor mgbaghara n’ihu ọha

0
22

Rose Oranye, Nkechi Ikenwoke, Blessing Nnabuife na Chinwendu Uzoatu dere akuko a

AKPATAOYI wụrụ ndị ụka na St Patrick’s Cathedral Awka, ụbọchị ụka ka Fada Oliver Ekene Nwosu, onye e chiri ụkọchukwu na katọlịk Dayọsis nke Morogoro dị na Tanzania dịka nwa lara akụ nna ya n’iyi nke e dere n’akwụkwọ nsọ bịara n’ụlọụka ahụ gosipụta ezi nchegharị site n’irịọ bishọp katọlik a ụzọ dị iche iche o siri mejọọ ụka.

  Fada Nwosu, onye ya na nne ya bụ ajadu nwaanyị batara n’ụlọụka ka a natachara oriri nsọ kwetara na ya emehiela ụka ma rịọ onyeisi ọzụzụ atụrụ dayọsis ahụ ka ọ gbahara ya, dịka o kwuru na bishọp ahụ nwere ikike ịgbaghara ya.

  Dịka o sekpu ala n’alta o kwuru: “Anọ m ebe a n’ihu Jesu nọ na Sakaramenti dị Ngọzị, tinyere n’aha nne anyị Maria, taa, anyị na-eme emume ọbịbịa Mụọ Nsọ. Mụ na nne m onye bụ ajadu nwaanyị nọ n’akụkụ m, so bịa. Nna m kaara ịnọ ebe a taa, mana dịka o siri masị Chineke, ọ nọ n’ọbaozu. Anọ m ebe a ịrịọ gị mgbaghara ụzọ ọbụla m siri mejọọ gị.

  Etosịghị m ịnọ ebe a. Nabata m dịka nwa lara akụ nna ya n’iyi, ka ngọzị nke nwa lara akụ nna ya n’iyi bụrụ oke m taa. Ana m arịọ gị, ịbụ nna m, onye dị mbụ na-emeso m nke ọma. Ihe niile m mere na nzuzu ma na nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ (social media) bụ n’amaghị ama na nduhie. Ana m arịọ gị ka ị gbaghara m. Si n’obi gị gbaghara m ma nabata m ka nwa gị. N’ihu ndị nke Chineke na ndị ụkọchukwu nọ ebe a taa, ana m ekwe gị nkwa nrubeisi m, nsọpụrụ na ịhụnanya. Anọ m ebe a ọzọ ịchọ mgbaghara gị dịka onye ọzụzụ atụrụ dayọsis Awka. Biko gbaghara m. Emehiela m megide eluigwe na ụwa.”

GUO:  Bishọọpụ Ezeokafor agozie ngwaọlụ ‘Visitation Hospital' Umuchu

  Fada Nwosu gara n’ihu kwe nkwa ịbụ onye agha nke Kraist maka nsogbu niile o nyere ụka na Bishọp n’onwe ya, ma rịọ ya site n’alta ahụ ka o jiri ọnọdụ ya dịka onyeisi ọzụzụ atụrụ nyere ya aka ka ihe Chineke kwadoro na ndụ ya bịa na mmezu n’ozuzu oke. Ọ kpọkuru Bishọp ka ọ gbaghara ya na nne ya ma mee ka ọńụ nne ya zuo oke.

  N’okwu nzaghachi ya, Bishọp dayọsis Awka, Most Rev Dr Paulinus Ezeokafor kwuru na ihe dịka otu izuụka gara aga na Fada Nwosu bịara n’ọfiisi ya ịrịọ ya mgbaghara, ya wee sị ya na o nweghị nsogbu ọbụla o nwere maka na ọ maara nke ọma na ọbụladị Kraist ka ọ gabigachara mmegide na mkpagbu niile, gbaghaara ndị kpọgburu ya n’obe.

  Bishọp Ezeokafor kwuru sị: “N’ụtụtụ a, e nwetara m ozi (text message) ya ebe ọ nọrọ kọwaa na ọ chọrọ ịrịọ mgbaghara. Agwara m ya na aga m achọ ka ọ bịa maka na ihe o mere gbara n’anwụ, ma na nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ma n’ebe niile. Ya mere, ọ bụghị sọọsọ Bishọp, o metụtara ndị ụka. Ọ bụ eziokwu na echim ụkọchukwu abụghị ihe gbasara m n’onwe m; ọ bụ ihe e tinyere n’aka m, ya mere ọ bụ ọrụ dịịrị m ịhụ na a na-eme ihe dịka o kwesịrị.”

  Ọ gara n’ihu site n’ịrụtụ aka n’Akwụkwọ Nsọ Hebrews, na ọkpụkpọ oku ịbụ ụkọchukwu bụ nke si n’aka Chineke abịa; na ndị niile nwere ọkpụkpọ oku ahụ na-etinye onwe ha n’ọrụ nke Mụọ Nsọ.

  Ya mere, o kelere Chineke otu o siri kpalite mmụọ ya ịrịọ mgbaghara n’ụbọchị ahụ bụ ụka Mụọ Nsọ (Pentecost Sunday).

GUO:  Bishọpụ Ezeokafor agbaarala ndị onweghị ka ọ ha ha Isita

  Bishọp kwuru sị: “N’ihe niile merenụ, nwanne m, Oliver Ekene Nwosu, anabatara m mgbaghara ị rịọrọ. Enweghị m ihe ọbụla megide gị. Ihe ndị ọzọ gbasara ihe a ga-eme adịchaghị m n’aka, mana ọ bụ ụka ka ọ dịịrị.”

  Bishọp rụtụrụ aka maka nwute o nwere n’ihi agadi nwaanyị nne ya ọ kpọrọ bịa, ma kwuo na n’ime ihe niile, ọ bụ ije ụwa.

  N’ikpeazụ, Bishọp gara kpọlite ya ebe o sekpu ala, makụọ ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here