September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

ANPC etoola Chineke maka ọgbụgba afọ iri ise Editọ ha, Oriakụ Oranye

Nnabuife (n'aka ekpe), Oranye (n'etiti) na Uzoatu mgbe a na-aọ ọjị na mmemme ahụ

NDỊ ọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLightXtra etoola Editọ ha, Oriakụ Rose Oranye dịka ọ gbara afọ iri ise na ndụ.

  Emume ahụ nke were ọnọdụ na ngalaba akụkọ (Editorial Department) kpọtụrụ akpọtụ ma bụrụ ihe oke ọńụ.

  N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi (MD/CEO) ANPC bụ Maazị Chuka Nnabuife gọrọ ọfọ ihe ọma n’isi Oriakụ Oranye. Ọ kpọkuru Chineke ka o nye ya ndụ n’uju, ma na-aga n’ihu n’ọrụ ya tinyere iweta ihe ọma n’ezinaụlọ ya.

  Nnabuife gara n’ihu kwuo sị: “Ihe ị ga-eri agaghị akọ gị. Ị ga-ewelatara ezinaụlọ gị ihe ọma ma nwetakwa ihe ọma site n’aka ha. Ọrụ gị ga na-aga n’ihu, ị g ana-enweta mbuli elu.”

  Ọ rụtụkwara aka n’ọrụ ọma ya, nke ọ na-ezipụta n’ụzọ dị iche iche, ma dụkwaa ndị mmadụ ọdụ ka ha mụta ka e si arụ ezi ọrụ, dịka ọ kwuru na ọ bụghị onye ọbụla ga-emeli ihe Editọ Oranye na-eme.

  N’akụkụ nke ya, Oriakụ Uchenwa Mba bụ otu n’ime ndịọrụ ANPC toro ya maka mbọ ya na ọrụ ọma ya niile. O kwuru sị: “Ihe anyị ji ańụrịrị Oranye abụghị sọọsọ maka na ọ bụ Editọ anyị, kama na ọ bụ ezigbo mmadụ, onye nne anya ruru ala. Ọ na-agbazi ma na anọnyere mmadụ oge niile. I nwee mkpa, ọ ga-adụ gị ọdụ ma mee ka obi ruo gị ala. A bịa n’ọrụ, ọ na-arụ ka jakị. O jighị ọrụ ya egwu egwu, ọ na-arụ nke ya rụọ nke ndị ọzọ.”

  Otu n’ime ụmụ ya, Chukwubuikem Oranye kelere Chineke maka ndụ ọma o nyere nne ya bụ Oriakụ Oranye. O kwuru sị: “Obi bụ m sọ ańụrị, ana m ekele Chineke maka ime ka nne m gbaa afọ iri ise. Ana m asị ka ọ gaa n’ihu na-agọzị ma na echekwa ya. Ka o nye ya ndụ n’elu ndụ, ka os I n’ike na-aba n’ike.”

Kingsley Ugwu, bụ onyeọrụ na ANPC kwuru sị na obi ańụrị na-akpa ya oge ọbụla a na-eme emume ọgbụgba afọ. O kwuru sị: “Umụnne m, taa bụ oke ụbọchị, n’aha ndị ngalaba akụkọ ana m ekele Chineke bụ onye nyere Editọ anyị ohere iru afọ iri ise. Ya mere, n’aha ụlọọrụ ANPC niile, n’aha onyeisi anyị, Ọchịagha National Light, Maazị Chuka Nnabuife (Chinyereugo) ana m ekele gị ma na-asị na njem gị nke na-abịa n’ihu ga-abịa n’uju amara nke Chineke.”

  Amara Eze, n’akụkụ nke ya toro Oriakụ Oranye maka oke mbọ na obiọma o ji arụ ọrụ ya n’enweghị nsogbu ọbụla. Ọ gọọrọ ya ọfọ sị “Dịka Ị gbara afọ iri ise, ị g ana-aga n’ihu ma si n’ike na-aba n’ike site n’amara Chineke.”

  Uzor Maxim Uzoatu, enyi ANPC, oge ọ na-akpọ mmanya ‘toast’ gọrọ ọfọ ihe ọma. O kwuru sị: “Jide ka ị ji. ANPC ga-abụ ihe niile ọ ga-abụ. Anyị na-ekele Chineke n’ime ihe niile.”

  Izunna Okafor bụụrụ ya abụ dịka ndị ọrụ ndị ọzọ dịka Okwuchukwu Chukwurah jakwara ya ike n’ebe ọ dị ukwuu.

  N’ozi ekele ya, Oriakụ Oranye ji abụ otito wee too Chineke maka afọ ọma ya na ndụ ya. O kelere ndị ANPC. O kwuru sị: “Otito dịrị Chineke, Alleluya! Ndị Igbo si na nnunu  akụ tụrụ n’ọnụ amaghị atụ. Ebere m akwa taa maka ihe ụnụ mere m taa. Nke a abụghị mbụ ụnụ na eme ya. Ụnụ gosiri m ịhụnanya dị egwu. Ọgbụgba afọ a dịirị iche n’agbanyeghị na ọ bụ nke iri ise. Adị m na nwata mata na ọnwụ dị. Agabigala m ọtụtụ ihe, n’ime ihe niile amaghị m na m ga-eru afọ a m dị taa. Otito niile dịrị Chineke. Oranye gara n’ihu kelee ndị niile o zuterela na ndụ, bido na nne na nna ya.

  Ya mere, o kelere ndị ANPC maka nkwado ha. O kwuru sị: “Ihe ụnụ mere taa juru m anya. Ana m ekele ụnụ maka ibuli m elu. Onyeisi anyị (MD), amaghị m ka m ga-esi kele gị. Dịka m gbara afọ iri ise taa ụnụ ga-erukwa, anyị ga-agafekwa ya.”

  Ihe pụrụ iche e mere na mmemme ahụ gụnyere onyinye obi ọcha e nyere Oriakụ Oranye, ịwa achịcha bekee, ịgụ egwu, abụ, w.d.g.

%d bloggers like this: