September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Ofe ụkpọ

ỤFỌDỤ ga-ajụ, gịnị bụ ụkpọ? Ụkpọ bụ ihe e ji esi ofe. Ọ na-atọ ụtọ ma ị sie ya nke ọma. O nwekwara aha ndị mpaghara ọbụla na-akpọ ya dịka ndị a: okobo, ịbaa maọbụ abachi. Ụkpọ, ị kụọ ya ọ na-eko ka ụkpa n’elu osisi. Ọ michaa, ị ghọta ya, ị wepụta mkpụrụ ya, ọ na-adị oji, akara ọcha na-adị na mkpụrụ ya gburugburu. Ụkpọ bụ ezigbo ego n’ahịa ugbu a.

  Ka anyị mara ka e si esi ofe ụkpọ: I weta mkpụrụ ole ị chọrọ isi, tiwaa ya sinye n’ọkụ, o ghe ị sụọ ya n’ikwe maọbụ ị kwọọ ya n’igwe. Ị chọkwaa, ị hụọ ya n’ọkụ. Ma ị siri ya esi ma ị hụrụ ya n’ọkụ, wepụ azụ ya tutu i sube ya.

  Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọ dị ka egwusi, sie ya esi, ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọ dị ka egwusi e ghere n’ọkụ, ị hụọ ya ahụ. Sikọọ anụ debe, gbanye mmiri ofe, wụnye okporoko, o ghee were mmanụ gbarie ụkpọ ahụ wunye ya na mmiri ofe ahụ, tinye azụ mkpọ, ịra, ose, nnu, okpenyi na magị; o ghee, tinye akwụkwọ ụgụ maọbụ onugbu. Ị kpagharịa ya, ị lee ma nnu ọ dịkwa ya. O ghee ị fọtuo ya were akpụ, nri ede, nri e sere ese ọbụla maọbụ garị wee ribezie ya.

  N’ezie, ị mara ofe ụkpọ sie, ịrichaa ya, ụra atụba gị ozigbo.

%d bloggers like this: