September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Uru nkwụ bara (I)

NKWỤ so n’osisi bakarịchara uru n’ụwa. Ihe niile dị na nkwụ nwere ihe e ji ha eme, nke na-enyere mmadụ aka na ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị nkwụ n’ụwa, ọtụtụ uru ọ bara gaara abụ ihe amaghị ama. Mana otu o sila dị, okike kere ụwa kere nkwụ iji mee ka mmadụ rite uru ya.

  Nke mbụ bụ na ọ bụ na nkwu ka e si enweta mmanụ nri (red oil), nke mpaghara dị iche iche n’ụwa niile ji esi nri. Ọ bụ mmanụ nri ka ndị agbụrụ dịka ndị Igbo ji esi nri. E wepụkwa na e ji mmanụ ya esi nri, e jikwa ya eme ọgwụ n’ụzọ dị iche iche, tinyere imepụta ncha na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

  Akị nke si na mkpụrụ akwụ ahụ e si enweta mmanụ bakwara uru. A na-ata ya ata, e ji ya esipụtakwa mmanụ n’ụzọ dị iche iche dịka udeakị, nke bụ ọgwụ. Ọ bụrụ na nwata e nwee ọrịa ihe mkpatụ (convulsion), a na-ete ya udeakị, tinyere na e jikwa ya egbochi ụmụaka oyi, ma jirikwa ya na-egbochi ha ọrịa dị iche iche. Ọ bụghị sọọsọ ụmụaka ka udeakị na-abara uru, ọbụladị okenye ji ya eme ọgwụ. Mgbe ụfọdụ ndị dibịa Igbo na-enye ndị mmadụ udeakị iji gwọọ ha ọrịa. Otu nwaanyị ihe wụrụ n’ahụ, dibịa gwara ya ka ọ na-etezu udeakị ebe ahụ niile iji mee ka ọrịa ahụ laa.

  Ichere akị, nke bụ azụ mkpụrụakị bakwara uru nke ya. E ji ya esi nri n’ihi na ọ na-enwu ọkụ nke ọma. E ji ya egbochi ide mmiri (erosion). Nke a pụtara na a na- awụ ya ebe ide mmiri  na-akpa ike iji gbochie nsogbu ọ na-enweta n’okporo ụzọ. Ọzọ dị ka ibe ya bụ na a na-awụ ya n’ụzọ iji mee ka ụzọ dị larịị, n’enweghị mgboko ọbụla. Ọtụtụ obodo enweghị ezi ụzọ jiziri ya mere korota iji hụ na mmiri emebighị ụzọ ha.

  Igu nkwụ so n’ihe e si na nkwụ enweta, ọ bakwara uru nke ya. E ji ya azụ ụmụanụmanụ dịka ewu. Ha na-ata ya nke ọma. E ji igu nkwụ atụ ndo ihe dịka ebe a na-eme mmemme, ọdụ ahịa, ebe ezumike w.d.g. Ebe ọbụla e jiri igu nkwụ were tụ ndo na-ajụ oyi pịị. Ị nọdụ na ya, ikuku a na-aga were were.

  Ọ bụkwa na nkwụ ka e si enweta azịza e ji aza ụlọ tinyere akpata e ji aza mbara ezi. Ihe ndị a niile dị nnukwu mkpa n’obibi ndụ mmadụ.

  Ọ bụrụ na a kpụchapụtachaa azịza, ọ bụladị aghịrịgha igu a kpụchapụtara na ya bakwara uru. E ji ya ekpuchi ji ma a kọnyechaa ji n’ala ka anwụ ghara ịchagbu ya. E jikwa ya eme nri ala n’ihi na o ree, ọ na-eme ka ihe a kọrọ n’ala na-ama poko poko ma mepụta ihe ihe ọma.

  Ọzọ dịka ibe ya bụ na a kpapụtasịa akwụ, ihe ndị ahụ ọgwụ juru ahụ nke ụfọdụ na-akpọ ọgha ngụ bakwara uru nke ya. A gbaa  ya ọkụ, ọ ghọrọ ntụ nke a na-akpọ ngụ. Ọ bụ ngụ ka e ji esi ụkwa, were ya na-esi ọtụtụ ihe siri ike ighe eghe, were ya na-eme ncha nkọta tinyere ịsa efere, ịgba ncha e ji agwọ abacha na ọtụtụ erimeri ndị ọzọ.

  E sikwa na nkwụ enweta ihe e ji amụ ọkụ iji wee hụ ụzọ n’abalị nke ụfọdụ na-akpọ nderi maọbụ maọbụ ogbodu. E jikwa ya emenwu ọkụ iji mee ka ọkụ nwuo ngwa ngwa. N’oge gboo, ọ bụ ya ka ndị mmadụ ji ahụ ụzọ n’abalị. Ma ruo taa, a ka jikwa ya ahụ ụzọ n’ime obodo dị iche iche.

  Uru ọzọ nkwụ bara bụ na ọ bụ ya na-emepụta nkwụ elu, nke bụ mmanya ọcha bụ ịgba, nke ndị Igbo ji eme emume omenala. Nkwụ elu bụ oke mmanya nke na-adị oke ọnụ ahịa. Ọ bụ ya ka e ji eme emume ịlụ nwaanyị. Ọ bụ na nkwụ ka o si apụta. Ọ bụ mmanya pụrụ iche ma na-enye ihe a chọrọ.

%d bloggers like this: