E liela Fada Uchebo n’Awka

0
19

Chinwendu Uzoatu dere akuko a

 NA Mondee, ọnwa a bụ Julaị dị n’abalị iri na iteghete ka a nọ n’Obi Chukwu, St Patrick’s Cathedral, Awka, wee lie otu ụkọchukwu nke dayọsis Awka, Fada John Chukwuemeka Uchebo; onye Ifitedunu nke dị n’okpuru ọchịchị Dunukofia na steeti Anambra.

  A kaara ya ụka ma lie ya n’ebe a na-eli ndị Fada n’ogige Obi Chukwu ahụ.

  Bishọp nọrọ n’isi emume bụ Bishọp Solomon Amatu nke dayọsis Okigwe, ebe bishọp ndị o mere be ha, dayọsis Awka bụ Bishọp Paulinus Ezeokafor na Jonas-Benson Okoye, tinyere ndị Fada ndị ọzọ si ebe dị iche iche bịa sonyere chụọ aja maasị dị asọ n’isi Fada Uchebo, ma rịọ Chineke ka ọ nabata mkpụrụobi ya n’Alaeze Eluigwe.

  N’okwuchukwu, Fada Eugene Anowai, onye klaasị Fada Uchebo kọwara ya dịka ụkọchukwu gbara ọsọ ndụ ya n’ụzọ dị iche iche mgbe ọ nọ ndụ.

  O kwuru sị: “Anyị nọ ebe a taa ịsị nwanne anyị nwoke Fada John ya gaa ije ya nke ọma. A maara ya n’ebe dị iche iche ọ gbasara oziọma, bụ nke mere na o nwetere ọtụtụ aha n’ebe ndị ahụ dịka Egovin, Enenebe Eje Olu, Tomato Jos w.d.g. Ọ kụziiri ndị mmadụ ụzọ ndụ nke e si aga eluigwe. O mechara daa n’ọrịa, mana nke ahụ emeghị ka ọ daa mba n’ọrụ ya dịka ụkọchukwu. Ọ nọgidesiri ike n’okwukwe.”

  Fada Anowai gara n’ihu kọwaa na ọnwụ onye otu Kristi bụ ohere anyị nwere iji chechighaa uche azụ banyere ndụ anyị, dịka ọ rụtụrụ aka na ndụ mmadụ dị ka okooko (flower) dị n’ọhịa bụ nke na-amụke n’ụtụtụ ma nwụọ n’uhuruchi. O kwuru na ọnwụ bụ ọdimakwaghị akwa ma bụrụ nke ga-emerịrị eme na ndụ onye otu Kristi ọbụla.

  O kelere ndị niile nọ n’akụkụ ya mgbe ọ nọ n’akwa ọrịa, Bishọp Ezeokafor na Okoye, ụmụnne ya, ezinaulọ ya, ụkọchukwu St Simon’s Parish, Ukpo, ebe ọ nọrọ ikpeazụ bụ Fada Emma Akpusionu, ndị parish ahụ na ọtụtụ ndị ọzọ.

 N’akụkụ nke ya, Chanselọ nke dayọsis Awka bụ Fada Francis Chidume kelere ezinaụlọ Uchebo maka onyinye nwa ha nwoke nke ha nyere ụka; tinyere ndị Ifitedunu na ọtụtụ ndị ọzọ nyere aka n’ụzọ dị iche iche. O chefughị ndị zitere ozi nkasiobi dịka Bishọp dayọsis Ekwulobia, Peter Okpaleke bụ onye nke Fada Charles Umeoji nọchitere anya ya, ndịisi òtù echichi dị iche iche (religious superiors), ndị gọọmenti w.d.g.

  Osote Odeakwụkwọ bụ Fada Cyril Ezeani gụpụtara ozi laa mma nke Awka Diocesans Presbyterium. Ọ gụpụtara tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na a mụrụ Fada Uchebo ka ọnwa Jenụwarị dị n’abali asaa n’afọ 1950, n’Ifitedunu. E chiri ya ụkọchukwu n’afọ 1986. Ọ rụrụ ọrụ ma dọta ndị mmadụ nsọ n’ebe Kristi nọ.

  Na ọ bụladị mgbe ọ nọ n’ọrịa, ọ gbara mbọ n’ọrụ ya dịka ụkọchukwu. Ọ rụtụrụ aka na oji ọ na-eji mere ka ogologo o toro pụta ihe nke mere ndị mmadụ ji na-akpọ ya aha dị iche iche dịka Udala mmịcha, Akwa nwa, Enenebe ejeolu, Olu gbajie girls; bụ ndị na-eto ya dịka omume ya sịrị dị.

  Otu nwaanyị si Our Lady of Fatima Parish, Umuchu, aha ya bụ Oriakụ Christiana Ibeadimuo kwuru na ezinaụlọ Uchebo na Ibeadimuo bụ enyi, nke mere ha jiri bịa ebe a na-eli Fada Uchebo. O kwuru sị: “Ọ ga-erite alaeze eluigwe. Ọ na-eleta ụmụ ogbenye, ọ bụ mmadụ ọha. Ọ bụladị mgbe ọ nọ n’akwa ọrịa, ọ na-egwu egwu ma na-eme ka a na-achị ọchị.”

  Arc Odinakachukwu Uchebo kọwara Fada nwanne nna ya (uncle) lara mmụọ dịka onye na-agbaziri ya ụzọ. O kwuru sị: “Fada Egovin dị obi sarị sarị. Mgbe i mere ka mmadụ mata gị, ha abịakwute gị, i were duzie ha dịka o kwesịrị; o bụ nke ahụ mere ka ị bụrụ onyeisi n’etiti ha. Amụtara m ihe na ndụ ya nke juputara n’egwuregwu. Ọ bụkwa onye eziokwu.”

  N’akụkụ nke ya, nwa nwanne Fada Uchebo bụ Chijioke Okafor si Umuawulu kwuru sị: “Ọ bụ ezigbo mmadụ. Ọ na-achịkọta ma na-enyere ndị mmadụ aka. Ana m agọrọ ya ọfọ ka ọ nọdụ n’akụkụ Chineke, dịka ọ kọrọ n”ugbo (vineyard) ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here