Ịzọ Igwe: Ndị Amanuke akpọkuola gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka

0
20

Izunna Okafor dere akụkọ a

IGBO sị na ọ naghị adị mma okenye ịnọ n’ụlọ ewu amụọ n’ọgbụ.

  N’ihi nke ahụ, ndị okenye obodo Amanuke dị n’okpuru ọchịchị ‘Awka North’ akpọkuola ma rịọ gọọmenti steeti Anambra ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n’ihi nsogbu ịzọ igwe na-adapụta n’obodo ahụ ugbua.

  Ndị okenye na ndị e ji okwu ha agba izù n’obodo ahụ, bụ ndị a maara dịka “Oke-Ọkpa Irunese” bụ ha kpọrọ oku mgbataọsọ a na nnukwu ọgbakọ ha nwere na nsonso a ma bụrụkwa nke ha nọ na ya wee kpọọ òkù ka e nwee udo, ọbụladị dịka ha kpọkuru ụmụnne abụọ ahụ na-enwe nsogbu ịzọ igwe ahụ ka ha gbasoo udo.

  N’okwu ya n’ebe ahụ n’aha ndị òtù ahụ, onye kacha bụrụ okenye n’obodo ahụ, bụ Mokwugwo Ughanwa gbarụrụ ihu banyere ogoogo okwu ahụ rugoro na ya ugbua, nke na o ruola ụlọikpe, n’ebughị ụzọ ruo n’aka ndị na-ahụ maka ihe gbasaara omenala n’obodo ahụ ka ha buru ụzọ tinye ya ọnụ maọbụ mee nnyocha kwesiri ekwesi banyere ya.

  Dịka ọ na-eme ka a mara na okwu ahụ ekwewsighị iru ụlọikpe maọbụ gbasàá ruo ogoogo ahụ ọ nọ na ya ugbua, ọ kọwara na oche eze obodo ahụ ekwesighị ịbụ ihe a ga-eji na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị maọbụ na-eme tigbuo, zọgbuo, ọbụladị dịka o mere ka a mara na ọ bụ otu nwoke ji ego na-esuwanye nsogbu na ọgbaaghara ahụ ma na-eme ka ọ na-akawanye njọ.

  Na ntụnye nke ya, otu onye ọzọ selitere isi n’obodo ahụ, bụ Emezie Nwokoye kwàrà arịrị na ya bụ nsogbu na-akawanye njọ kwà ụbọchị, ma kwuo na ọ bụrụ na e gbubìghì ya bụ agwọ ọdụ ugbua, ị mara na o nwere ike itokwu ogologo ma tagbuo mmadụ n’ọdịnihu, n’ihi na ya bụ nsogbu nwere ike ịkpụtọ aha obodo ahụ maọbụ wèta mbibi n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche.

  Dịka ọ na-adụ ndị so akwanye ọkụ na nsogbu ahụ ọdụ ka ha sepụ mma n’akịdị ma gbasoo udo na ụzọ iwu kwàdòrò, ọ rịọzịrị enyemaka na mgbataọsọ gọọmenti steeti ahụ iji gbochie ya bụ nsogbu ịbà n’ihe ọzọ ka njọ.

  N’okwu nke ya n’aha ụmụnwaanyị, Oriakụ Gladys Enemuo na Oriakụ Charity Anaedozie kpọkuru mmadụ abụọ na-enwe nsogbu ahụ ka ha wèlata okwu ahụ ụlọ ma nọrọ n’ụlọ kpezie esemokwu ha. Ha kwuru na ọ gbara ha ngharị etu onye esoghị wee mee nhọpụta maka ịzọ igwe ga-esi si n’ụzọ mkpụkè wee na-agwọgharị ihe niile ma na-agbanwèzị ebumnobi ndị mmadụ; ọbụladị dịka ha kpọkuru na-azọ ọkwa ahụ ka ha kpezie ma kwụsị ime ka okwu ahụ gaa n’ihu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here