Na Lagos, nwaanyị otu ụkwụ na-ebugharịbu mmiri egoola ụlọelu ọhụrụ

0
19

Izunna Okafor dere akuko a

KA ọ gachara ọnwa olenaole o nwetechara nkwàdo dị ukwu site n’aka ndị ọrụ obiebere na-amasị, nwata nwaanyị ahụ nwere otu ụkwụ ma bụrụkwa onye na-ebugharịbụ mmiri ọñụñụ na steeti Lagos, bụ Mary Daniel egoola nnukwu ụlọelu gburu ego ruru nde naịra iri na asaa na ụma ise (N17.5m) na steeti Lagos ahụ.

  Daniel, bụ nwaafọ steeti Kogi, màlitere wùbé èwùbé ma bụrụkwa onye ọtụtụ mmadụ màlìtèrè ịgbatara ọsọ enyemaka, inye ego na inye nkwàdo dara ụdà oge foto ya gbasàrà n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, na-egosi ebe o bù ótù ụkwụ ya fọrọ afọ ma jiri mkpọ na-ebugharị ma na-ere mmiri ọñụñụ n’okporoụzọ.

  Ka foto ahụ gbasachara, ya bụ nwata nwaanyị nwètèrè ego ruru nde naịra iri abụọ na ise site n’aka ndị ọrụ obiebere na-amasị, ndị ọrụ gọọmenti na ndị ọzọ o metụrụ n’obi inye ya nkwàdo, iji mee ya ka ọ bụrụ onye kwụụrụ onwe ya ma kwụsị ahịa mbugharị ahụ ọ na-ebugharị. Ọ bụzị site na nke ahụ ka Chineke siri wee mee ya bụ nwatanwaanyị ezege, ma kpọpụ ya n’ụzọ ka ọ kwụsịzie ibugharị mmiri.

  Ka ọ dị taa, ya bụ nwaagbọghọbịa na-ebugharịbụ mmiri n’Oshodi Lagos egoola ụlọelu na mpaghara Igando Lagos.

  Ọ bụghị naanị nke ahụ; ya bụ nwata nwaanyị gbara ahọ iri abụọ na asaa malitèkwàrà ịrụ ụlọ ebe a na-emepụte ụdị mmiri ọñụñụ dị iche iche ugbua, bụkwazị nke ọ ga-arụchapụ n’oge adịghị anya, n’ihi na ọrụ na-achọzị ịkụrụ ọnụ n’ebe ahụ ugbua.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here