Akụkọ okike: Ihe mere ndị Igbo jị akwanyere ji ugwu pụrụ iche tupu ha erie ya

0
4

O RURU otu oge, oke ụnwụ/ụganị (famine) dara n’ala ndị mmadụ, onweghịkwa onye hụrụ tụtụrụ rachaa n’ihi na ihe oriri kọrọ ụkọ kpamkpam.

  Ka nke ahụ na-aga n’ihu, ike gwụrụ mmadụ niile nke mere ka ha dupu ndị okenye ka ha gakwuru chi okike jụọ ya ihe ha ga-eme banyere ọnọdụ ọjọọ ahụ.

  Mgbe ndị ahụ ruru na be chi okike, ọ nabatara mkpesa ha ma zie ha ihe ha ga-eme ka agụụ laa. Ọ gwara ha sị, ka onye ọbụla gbuo dịọkpara ya na ada ya, ma likwaa ha.

  Mmadụ niile mere ihe a gwara ha ma gbuo dịọkpara na ada ha, ma likwaa ha dịka e si eli ozu.

  Mgbe nke ahụ gachara, ome mechara si n’ili niile ahụ na-epupụta. Ome ji puru n’ili dịọkpara ebe ome ede puru n’ili ada.

  Ka o ruru n’ọnwa nke asatọ, chi okike gwara ha ka ha gwuo ili ndị ahụ ka ha were ihe oriri dị n’ime ha. Ha gwuru ili wee hụ jị n’ili dịokpara ma hụ ede n’ili ada. Ọ bụ otu a ka ji na ede si bata n’ala ndị mmadụ wee bụrụ ihe oriri ruo taa.

  Ndị Igbo na-enye ji nsọpụrụ dịka isi ihe a kọrọ n’ubi n’ihi na ji bụ dịọkpara. Ede bụ ada (nwaanyị). N’ihi na ọ bụ n’ọnwa nke asatọ ka chi okike gwara ha gwuo ji, ha na-emezi a banye ọnwa nke asatọ n’afọ ọbụla ha amalite mebe emume iri ji ọhụrụ.

  Dịka a nọ n’ọnwa nke asatọ bụ ọnwa Ọgọstụ, ndị Igbo amalitela na-eme emume iri ji ọhụrụ. Ha na-akwanyere ya ugwu tupu ha erie ya n’ihi na ọ bụ dịọkpara. Emume iri ji ọhụrụ bụ oke emume n’ala Igbo, a na-agba egwu dị iche iche, mmọnwụ na-apụ tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.Iri ji ọhụrụ bụ oke mmemme oriri na ọńụńụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here