Ikupụta nwa ọhụrụ n’ala Igbo

0
6

IKỤPỤTA nwa bụ nnụkwụ mmemme n’ala Igbo.Ọ bụ ya bu mmemme kasi elu n’ime mmemme ọmụgwọ nile, yaabụ n’ime mmemmme dị iche iche a na-eme mgbe nwanyị mụchara nwa ọhụrụ.

  A na-eme nke a ụbọchi ọ mere izu Igbo asaa ma ọ bụ mkpụrụ ụbọchị ịri, abuọ na asatọ nwanyị mụrụ nwa.

  A na-enwere mmemme a ka nke kasi elụ n’ihi na ọ bụ ụbọchi nwanyi  mụrụ nwa ọhụrụ na-apụta n’ọmụgwọ.Ọ bụkwa ụbọchị ahụ ka ọ ga-amalite isi nri. Ọ bụkwa ụbọchị ahụ ka a ga-egọsị ọha na eze nwa ọhụrụ nwanyi ahụ mụrụ ma bụrụkwa ụbọchị nne mụrụ nwanyị ahụ lezụrụ nwa ya nwanyị ọmụgwọ.

  Nke kacha bụ na ọ bụ ụbọchị ahụ ka a ga-agụ nwa ọhụrụ ahụ aha. N’isi ụtụtụ ụbọchị ahụ a na-ekupụta nwa, nwanyi mụrụ nwa ọhụrụ na-azacha ụlọ, zaa ezi, ma dọbe ebe nile ọcha. Ihe na-esọta nke a bụ ikpọpụ ntụ ọku ọmụgwọ o nyara.

  A na-esi ụdị nri dị iche iche nke a ga-enye igwe mmadụ ga-abia maka mmemme a. Ubọchi ahụ bụ ụbọchi oriri na ọńuńụ.Nke a mere na nna nwe ụlọ ga-enute mmanya n’ebe ọ dị ukwu. Malite n’oge ehihie, ndị mmadụ ndị gụnyere ikwu na ibe, ndi enyi, ndi ọgọ, agbataobị, ụmụaka w.d.g. ga amalite na- abia maka mmemmme a.

  Mgbe oge ruru, ọnye kacha bụrụ ọkenye n’ezinaụlọ ga-agọ ọjị dịka ndị Igbo si eme iji kelee Chineke, ọkike kere ụwa; ndị ichie na ụmụ mmụọ dị iche iche n’ihi nwa ọhụrụ nke a mụtara n’ezinaụlọ ahụ.

  Mgbe nke a gachara, ọ ga-ekụrụ nwa ọhụrụ ahụ ma jụọ nna mụ ya aha ọ chọrọ ka a gụọ ya.

  Nna nwa ahụ ga-agwa ya aha ọ chọrọ ka a gụọ nwa ya.  Ọ ga-akpọpụta aha ahụ ka ọhaneze nụrụ. Ọ bụrụ na nna nwa ahụ sịrị na aha ya ga-abụ Ositadịmma; nwoke ahụ ga-ewelite olu kpọọ nwata ahụ ‘OSITADIMMA’.

  Mgbe ọ mere nke a, ụzụ ọńụ ga-atụ n’elu, tụọ n’ala. Ọ bụ mgbe e mechara nke a ka ndị ọzo nweziri ike inye nwa ahụ aha masiri ha, yaabụ aha nke aka ha. Nne nwata ahụ nwere ikịke inyezi ya aha masịrị ya. Otu a ka ndị ikwunibe, ndị ọgọ ga-esikwa mee dịka nne ọchie ya w.d.g.

  Malitezie mgbe ahụ, oriri na Ońụńụ ga-ebiri ọkụ. Ndị mmadụ ga-eji obị ańụri na-eri ma na-ańụkwa. Ndi egwụ ga-amalite na-akụ, ndị ogbụgba a na-agba.

  Ụmụ nwanyị (ndị inyom) ga na-agụ na-ekwe dịka:

Ọ bụghị ma nwa               –    onye ga-enye m

Ọ bụghị ma nwa               –    onye ga-enye m.

  Ihe ọzọ na-apụtakwa ihe n’oge ahụ bụ na nwanyị mụru nwa ọhụru na-ekuru nwa ya nọrọ n’ọtụ akụkụ were na-anara ihe ọnyinye dị iche iche ndị mmadụ na-enye ya.

  N’otụ aka ahụkwa, nne nwanyị ahụ na-anorọkwa n’akụkụ nke ya ma na anarakwa ihe ọnyinye dị iche iche n’ihi ọmụgwọ ọ bịara lee nwa ya.

  Otụ a ka a ga-anọ n’ezinaụlọ ahụ na-eri na anụ ma na-agụkwa na-ekwe tupu chi ejie.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here