Nri ndị Igbo: Ịgbaọka e ji akụ mkpu sie

0
6

Ọ DỊ ụfọdụ nri ndị Igbo a na-echezọ n’oge ugbu a, ọ kachasi ndị bi n’obodo mepere emepe. Ụfọdụ ga-asi gịnị bụ ịgbaọka? Ịgbaọka bụ otu n’ime ihe oriri ndị gboo ji zụọ ụmụ ha, ebe ụfọdụ ga-asị na ọ bụ nri ndị ogbenye.

  N’ezie , ịgbaọka bụ ihe oriri dị mma mana ndị nne na nna na-eleda ya anya.

  Ka anyị baa n’ịma ka e si akwado ịgbaọka e tinyere akụ nke ụfọdụ na-akpọ ọsụ akụ, ịgbagwu ọka, ụkpọ ọka, ya na ka e si esi ya.

  Mbụ, I weta ogbe ọka, ị gbachaa mkpụrụ ọka, ọ bụrụ ọka ka dị mmiri, ị saa ya wụnye n’ihe ị ga-eji kwọọ ya, tinye ya ose ndụ na yabaasi buga ya n’igwe na-akwọ ọka. Ị bata, ịgbanye ya mmanụ, nnu, ịra, ose na akụmkpu ị mechara nke ọma, sachaa ya ka aja ghara ịdị ya, ị chọọ ị tinye ya nchụanwụ I bere kịrịkịrị, I were osisi maọbụ ngaji gwọkọba ya ruo mgbe ihe niile ahụ ị tinyere ga-agwọkata ọnụ nke ọma. Ị gbanye ya mmiri dị ńarańara. Cheta na mmiri agaghị akarị ka I nwee ike ikechi ya n’akwụkwọ unere maọbụ akwụkwọ ojoko. I kechie ya, ị gbanye mmiri sinye n’ọkụ, ọ gbọọ, were nwayọọ tinyechaa ya n’ite, ikpuchie ya. Ị ga-esite ya aka ka o ghee nke ọma maka na o ghee nke ọma, i I richaa ya ụbọchị ọzọ ọ gụba gị.

  Nke abụọ, ọ bụrụ ọka kpọrọ nkụ ka ị chọrọ iji sie ịgbaọka akụmpu, naanị ihe dị iche bụ na ị ga-esi ya n’ọkụ ihe dịka nkeji iri, ị hapụ ya na mmiri ọkụ ahụ chi efo. Ị sapụ ọka ahụ na mmiri ahụ ị ga kwọọ ya n’igwe na-akwọ ọka, ị bata ị kwakọnye ihe niile ahu I jiri sie nke dị mmiri, I sie ya nke ọma ka I wee nụ ụtọ ịgbaọka akụmkpu.

GUO:  Nri ndị Igbo: Ọkpa

  Ịgbaọka akụmkpu bụ onye richaa ọ rahụ ụra.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here