Ọba akwụkwọ Anambra emerùbela ụbọchị mmụta na mba ụwa

0
5
Udeze (onye nke mbụ n'aka nri), Ifeanyi (onye nke mbụ n'aka ekpe) na ụfọdụ ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ

A KPỌKUOLA ma dụọ ụmụakwụkwọ na ndị ntorobịa ọdụ ka ha gbasie mbọ ike mụta ka e si ede na ka e si agụ, ya na etu e si eji igwe kọmputa na usoro ICT were eme ihe.

  Onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra (a maara dịka ‘Anambra State Library Board’) bụ Dọkịta Nkechi Udeze bụ ya nyere ndụmọdụ a na mmemme imerbè ụbọchị mmụta na mba ụwa, nke ahọ 2021, bụ nke ọba akwụkwọ ahụ chịkọbara n’isi ụlọọrụ ya dị n’Awka, ma bụrụkwa nke isiokwu ya bụ “Mmụta Maka Mgake Nke Mmadụ: Ibelata Ndịiche n’Ihe Metụtara Usoro Nzikọrịtaozi Ọgbaraọhụrụ” (ma a tụgharịa ya).

  Dịka o siri kọwaa, mmụta, dịka ọ dị taa, abụghịzị naanị maka mmadụ ịma ka e si agụ na ka e si ede, kama na ọ gụnyekwara mmadụ ịma nke ekwe na-akụ n’ihe gbasaara usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, bụ ICT, n’ihi na ụwa ugbua kweszịkwara na onye ọbụla ga-ama ka e si eji kọmputa na usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ were eme ihe. O kwuru na ọ bụ nke ahụ mere na ọtụtụ ụmụakwụkwọ na ndị nkụzi ha ka gara n’ihu na-agụrụ onwe ha akwụkwọ n’usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ oge ahụ e mechisiri ụlọakwụkwọ niile n’ahọ gara aga n’ihi ọrịa nje korona.

  O mere ka a mara na ọba akwụkwọ ahụ so n’ezi ihu n’ịkụziri ndị mmadụ ka e si eji usoro ọgbaraọhụrụ eme ihe, bụ nke ha gosipụtagoro site na nkụzi dị icheiche ha chịkọbàgooro ndị mmadụ n’efu bànyere nke ahụ, ọbụladị dịka ọ dụzịrị ụmụakwụkwọ ahụ ọdụ ka ha na-agụsi akwụkwọ ha ike ma mụtakwa ka e si eji usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ were eme ihe dị iche iche.

GUO:  Ọba akwụkwọ Anambra ehibela atụmatụ nkwàlite agụmakwụkwọ, ọmụmụ ọrụaka

  N’akụkụ nke ya, onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara agụmakwụkwọ n’ogo sekọndịrị, bụ Dọkịta Paul Ifeanyị kelere ọba akwụkwọ ahụ maka ịchịkọba ụdị ọmarịcha mmemme ahụ, ọbụladị dịka o kwupụtara obi mwute ya na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị agụzị akwụkwọ taa. Ọ katọkwara ma kọwaa ya dịka akụkọ enweghị isi na ọdụ, bụ ihe ahụ ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu sị nà ịgụ akwụkwọ abàghịzị uru ọbụla taa, ọbụladị dịka ọ rụtụrụ aka na ọtụtụ nnukwu obodo na-ewu èwù ma na-eme nke ọma na mba ụwa taa, dịka mba USA na mbà ndị ọzọ, bụ maka ihi agụmakwụkwọ.

  Ọ kpọkuzịrị ụmụakwụkwọ ahụ ka ha jiri agụmakwụkwọ ha kpọrọ ihe ma tinyekwa ihe dị icheiche ha mụtàrà na mmemme ahụ n’ọrụ.

  Na mbụ n’okwu ya oge ya na ụmụakwụkwọ ahụ na-enwe mkparịtaụka n’ihe gbasaara ịma ka e si ede, onyeisi ụlọakwụkwọ ‘Potters College, Awka’ bụ Oriakụ Ebere Chinọnso, kọwara mmụta n’ebe ọ dịkarịchara ala dịka mmadụ ịma agụ na ịma ede, ọbụladị dịka ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ uru dị icheiche dị na mmadụ ịma agụ na ịma ede, ma kọwakwara ha na onye ọbụla chọrọ ịma ka e si ede ede nke ọma ga-abụrịrị onye ma ka e si agụ agụ nke ọma, ma bụrụkwa onye na-agụ akwụkwọ oge niile.

  E wezuga ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche ụmụakwụkwọ ahụ mere n’ebe ahụ, ha nọkwara na mmemme ahụ nwee asọmpi ‘sụpeere m’, bụ nke obere Maazị Ezeh Chinazaekpere, obere Maazị Anyachi Emmanuel na obere Nwaada Ezediebube Chimziterem nwètàrà mmeri na ya site n’ịgba onye nke mbụ, onye nke abụọ na onye nke atọ n’ótù n’ótù, ma bụrụkwa ndị e nyere akwụkwọ nkọwaokwu ‘Oxford Advanced Learners Dictionary’, akwụkwọ e ji ede ihe, akwụkwọ ọgụgụ, mkpịsị odee na ihe ndị ọzọ dịka ihe nrita.

GUO:  Ọba akwụkwọ Anambra emerùbe mmemme ụbọchị ọrịa mkpụrụ akị

  E kesàzịkwaara ụmụakwụkwọ ndị ọzọ bịara mmemme ahụ akwụkwọ e ji ede ihe na mkpịsị odee. Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere Nwaada Chinenye Anyaegbunam na Oriakụ Obianuju Umeh.

  Mmemme ahụ wèrèkwàrà ọnọdụ na ngalaba ọba akwụkwọ ahụ dị n’Ihembọsị na nke dị n’Onitsha, bụ ebe onye odeakwụkwọ otu jikọtara ndị ọrụ ọba akwụkwọ n’ala Nigeria, bụ ‘Nigeria Library Association, NLA’ (ngalaba steeti Anambra), bụ Oriakụ Ngozi Perpetual Osuchukwu nọrọ wee dụọ ndị sonyere na mmemme ahụ ọdụ ka ha were agụmakwụkwọ ha kpọrọ ihe, ma kọwakwa mkpà ọ dị ibelàtà ndịiche dị n’etiti ndị ma akwụkwọ na ndị amaghị akwụkwọ, ya na n’etiti ndị ma eji usoro nzikọrịta ọgbaraọhụrụ eme ihe na ndị amaghị eji ya eme ihe, n’ihi nke ahụ abụghị ọrụ e kwesiri ịhapụrụ naanị gọọmenti.

  Mmemme Ụbọchị Mmụta na Mba Ụwa, nke e mèrè àgbà nke mbụ ya n’ahọ 1967, bụ ụbọchị pụrụ iche ndị òtù mba ụwa ‘United Nations Educational and Scientific and Cultural Organisation (UNESCO)’ wepụtàrà maka iji kọwàpụta mkpà mmụta dị nà uru ọ baara mmadụ na obodo n’izugbe. Ọ bụkwa n’abalị asatọ nke ọnwa Setemba ahọ ọbụla ka a na-eme ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here