Òtù Ụmụada Abagana eguzobela ngalaba ndịda-ọwụwa anyanwụ

0
6
Ụmụada Abagana oge ha na-awa achịcha bekee na mmemme ahụ

Ọ BỤNNỌỌ ụwa bịa kirie na nsonso a, dịka ndị òtù a maara dịka Ụmụada Abagana, guzobere ngalaba ndịda-ọwụwa anyanwụ nke òtù ahụ. Mmemme nguzobe ngalaba òtù ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obodo Abagana dị n’okpuru ọchịchị Njikọka, na steeti Anambra.

  N’okwu ya n’ebe ahụ, onyeisi izugbe ndị òtù ahụ n’ala Nigeria, bụ Oriakụ Chinyere Ogugua kọwara na ya bụ òtù bụ òtù jikọtara ụmụnwaanyị bụ ụmụafọ obodo Abagana, ma bụrụkwa nke ebumnobi ya bụ iji kwalite ọdịmma ụmụnanyị ahụ, chọpụta ọnatarachi dị icheiche ha nwere, nye ha nkwàdo, ma kwàlitekwa ọdịmma obodo ahụ na ụmụafọ ya n’izugbe.

  Oge ọ na-akọwa nguzobe ahụ ha guzobere mpaghara ọhụrụ dịka ihe magburu onwe ya na nke na-egosi na òtù ahụ na-agawanye n’ihu, o kwuru na òtù ahụ nwèrè ngàlàbà na mpaghara ebe dị icheiche n’ala Nigeria, ma kwupụtakwazie olileanya o nwere na ya bụ òtù ga-aga n’ihu na-eto.

  N’ozi nke ya, onyeisi òtù ahm na ngalaba ndịda-ọwụwa anyanwụ ahụ e guzobere ọhụrụ, bụ Oirakụ Elizabeth Anyaonu mere ka a mara na òtù Ụmụada bụ otu siri ezigbo ike ma nwekwa ọnụokwu n’ala Igbo, bụrụkwa òtù na-akwàlite ugwu dịịrị ụmụnwaanyị, alụmdinanwunye, ezinụlọ, na-akwàlite omenala na ihe dị iche iche e jiri mara ndị Igbo.

  Dịka ọ na-akpọpụtasị ihe dị iche iche òtù ahụ ga-eme iji hụ na ọ na-eto eto, na-agawanye n’ihu ma na-enwewanye mmetụta, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ma dụọ ndị òtù ahụ na ụmụnwaanyị ibe ya ọdụ ka ha bụrụ ndị na-agbasi mbọ ike ma na-atụnye ụtụ n’ụzọ pụrụ iche na mmpe obodo.

  Na ntụnye nke ya, otu onye òtù ahụ, bụ Oriakụ Amaka Josiah Okoli kọwara ụmụnwaanyị dịka ndị na-ewulite obodo, ma dụọ ha ọdụ ka ha bụrụ ndị nlereanya ma na-akpakwa agwa kwesiri nñòmi n’obodo.

  Na nkụzi ya na mmemme ahụ, Ọkammụta Caro -Arinze Umeobi nke mahadum Nnamdi Azikiwa dị n’Awka kọwara ụmụnwaanyị, ọkachasị ụmụnwaanyị Igbo dịka nnukwu ihe onwunwe, ma kwukwa na ha bụkwa ndị nwere nnukwu ọrụ dịịrị ha n’ịkwàlite ịdịnotu, ọganihu na mmepe obodo na ezinụlọ.

 Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisioche nchereoge n’okpuruọchịchị ime obodo Njikọka, bụ Maazị George Ozor; eze ọdịnala Abagana, bụ Igwe Mbamalu Okeke; onyeisi ọchịchị obodo ahụ, bụ Maazị Linus Okafor, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here