Ụka ga-enyenwuru ndị ụka aka nweta ọrụ, nkwado – Nnabuife

0
5
Nnabuife, mgbe ọ na-enye nkuzi n'ọgbakọ ahụ

ONYEISI ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportsLight Xtra na Homeland, Sir Chuka Nnabuife akpọkuola ụka ka ha wepụtara ndị nke ha ohere inwe ọrụ.

  Nnabuife kwuputara nke a na nkuzi o nyere n’ọgbakọ  Izuụka Justice, Peace and Development Commission (JDPC week) n’ụlọụka St Thomas Aquinas Catholic Church, G.R.A, Awka, nke isiokwu ya bụ: ukọ ọrụ dịka ihe butere enweghị ezi nchekwa n’oge ihe iche aka mgba korona; ọrụ ụka kwesịrị ịrụ (Unemployment as a catalyst for insecurity in a COVID-19 pandemic era: The role of the church).

  Nnabuife kọwara nsogbu korona dịka nke jezuru ụwa niile ma bụrụ nke butere oke ihe iche aka mgba; ma wete ịkpa oke n’ebe mmadụ na ibe ya nọ nke na ndị nọ n’otu ezinaụlọ malitere ịsọ onwe ha asọ. Ọ chetaara ndị mmadụ otu nsogbu ahụ siri ruo ụlọụka nke na e mechiri ụlọụka ma gwa ndị mmadụ ka ha nọrọ n’ụlọ na-ekpere chi ha.

  Ọ gara n’ihu rụtụ aka n’Akwụkwọ Nsọ Eph 2:10 ma kwuo sị na mmadụ bụ aka ọrụ Chineke nke o kere ka ọ rụọ ezi ọrụ ma nwee ike merie ihe ọbụla nwere ike ịbịa n’ọdịnihu.

  Dịka ọ kọwara ụka dịka ebe ụmụ Chineke gbakọrọ ọnụ, o kwuru na ụka ga-arụ ọrụ n’ọnọdụ korona n’ụzọ dị iche iche. O kwuru na ọ ga-ewetara ndị nke ya ọrụ site n’inyere onwe ha aka (networking). Onye ọ bụla mara nke ibe ya na-eme ọ na-atụnyere ya, n’ụzọ dị otu ahụ ihe ọbụla onye ahụ na-eme a na-aga nke ọma.

GUO:  Ụmụakwụkwọ UNIZIK enyela Nnabuife onyinye nkwanye ùgwù maka ngbasa ozi

  Ọzọ bụ site n’ikuzi ọrụ aka (skill acquisition), ọ kachasi n’ebe ndị ntorobịa nọ. Ọ bụrụ na ụka  na-achịkọba ya, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite n’ụzọ ahụ mụta ọtụtụ aka ọrụ.

  O kwuru n’ụka ga-esikwa na ngalaba ya dị iche iche na-ewepụta ihe dị n’ime mmadụ. Ụfọdụ mmadụ na-eme ihere ikwu okwu n’ọgbọ ma mgbe ha malitere pụtaba n’igwe mmadụ n’ụlọụka, ime otu ihe ma ọ bụ nke ọzọ, ihere na-emebu ha na mbụ alaa, ha achawapụ bido na-emesi ihe ike n’ọgbọ.

  O kwuru na a na-esite n’ụlọụka zụpụta ezi onye ọchịchị. Mmadụ na-esite n’ọrụ ọchịchị ụka baa obodo ma chịa ezi ọchịchị.

  Site n’ịhazị ihe emereme n’ụlọụka a na-achọpụta ma mee ka ọnatarachi chawapụ dịka ọ rụtụrụ aka na ụfọdụ ndị a maara aha ha n’ụwa dịka ndị oti egwu malitere n’ụlọụka, si otu ahụ kwudosie ike. Taa ha bụzị ndị aha ha na-ada ụda.

  Nnabuife gakwara n’ihu kwuo na ịchịkọba ihe ọmụmụ nkuzi bụkwa ụzọ ụka ga-esi na-eme ka ndị nke ha nwee ọrụ. Ndị mmadụ ga-esi ọnọdụ ahụ mụta ma tinye ihe ha mụtara n’ọrụ.

  Ọ chịkọtara nkuzi ya ma kọwaa na ọrụ ụka banyere ime ka ndị nke ya nwee ọrụ bụ ihe gbasara onye ọ bụla, bido na ndị ụkọchukwu wee ruo na mmadụ niile.

  Otu onye n’ime ndị bịara ọgbakọ ahụ, Oriakụ Lucy Nnaji-Ihedinmah kwuru sị na nkuzi ahụ bụ iji mee ka ndị nke Chukwu mata ụzọ ha ga-esi wee nwee ike merie oge a, inyere ndị mmadụ aka ịma ihe ha ga-eme n’oge ihe iche aka mgba korona nke a nọ n’elu ya.

GUO:  West African Students Union Parliament emeela Nnabuife ‘Vanguard of Nation Building in Nigeria’

  Ọ kọwara na JDPC na-eleba anya n’ihe na-eme n’obodo na ụzọ a ga-esi wee so ya, ka ihe wee dị mma.

  O kelere Nnabuife maka ezi nkuzi ya nke ọ haziri n’ụzọ bụ ịgba ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha jisike.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here