Inye ụmụaka ara ọnwa isii na-egbochi ọrịa nwere ike igbu ha– Onyeisi NAFDAC

0
9

ONYEISI zuzugbe ụlọọrụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC), Ọkammụta Mojisola Adeyeye akwaala arịrị gbasara ọnọdụ enyeghị ụmụaka e ku n’aka mmiri ara otu o kwesịrị (exclusive breast feeding) nke a na-ahụtazi n’aka ụmụnwaanyị na-enye nwa ara n’ala Nigeria n’oge ugbu a.

  N’okwu ya site n’Ilorin n’emume mmalite (flag-off) agba nke mbụ ọgbakọ nkuzi nke akwadoro ime na steeti asatọ a họpụta n’ala anyị, Ọkammụta Adeyeye gwara ụmụnwaanyị na-enye nwa ara ka ha na-enye ụmụaka sọọsọ mmiri ara ọnwa isii iji zọpụta ha site n’ọtụtụ ọrịa nwere ike ibutere ụmụ ha ọnwụ.

  Onyeisi ụlọọrụ ahụ nke onyeisi ‘north central’ ha, Oriakụ Bolaji Abayomi nọchịtere anya ya kwuru sị: “Otu n’ime uru nke inye ụmụaka sọọsọ mmiri ara bụ na ọ ga-egbochi ọrịa ọnyụnyụ na ọgbụgbọ (diarrheou), nke na-egbu ọtụtụ ụmụaka tupu ha agbaa afọ abụọ.”

  Dịka ọ na-ekwuputa banyere ọnọdụ ahụike cheere ọha nae ze aka mgba n’ala anyị, onyeisi NAFDAC dọrọ ndị Nigeria aka na ntị maka nsogbu dị n’igo ọgwụ site n’aka ndị na-ebugharị ya ebugharị (hawkers), ma kọwaa na ndị ọrịa kwesịrị igote ọgwụ sọọsọ n’aka ndị nwere ikike e ji ere ọgwụ (licensed pharmacies and medicine stores).

  Ọ katọrọ ma kwuo na ịńụ ọgwụ kodine n’ụzọ ọjọọ tinyere mmadụ inye onwe ya ọgwụgwọ ọ kachasị n’ebe ndị ntorobịa nọ na-aga n’ihu n’ike n’ike ma kpọọ oku ka e wepụ aka enwe n’ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ.

  Ọkammụta Adeyeye kwara arịrị maka nsogbu na-esi n’iji ụgbọala tanka na-ebu mmanụ kerozine wee na-ebu mmanụ ọpapa (groundnut oil) dịka ọ gakwara n’ihu dọọ ndị na-eme achịcha (bread bakers) ka ha kwụsị iji ‘potassium bromate’ emepụta achịcha.

GUO:  NAFDAC akagbuola iji kemikalụ akwado, echekwa ihe oriri

  Ọ gara n’ihu kpọkuo ụmụnwaanyị na-azụ ahịa n’ụzọ dị iche iche ka ha sonyere ụlọọrụ ahụ n’ibu agha megide itinye ‘Azo-dyes’ na mmanụ nkwụ (palm oil) bụ nke o kwuru na ọ na-akpata ọrịa kansa.

  O wutere ya na n’agbanyeghị mbọ niile ụlọọrụ ahụ na-agba megide iji ọgwụ snaịpa echekwa ihe oriri ọbụla, ndị mmadụ ka na-agakwa n’ihu na-eme ya. Ọ katọkwara mmadụ iri oke mmadụ yaabu iji mmanụ eri ihe oriri n’ebe ọ dị ukwuu.

  Ọ kpọkukwara ndị ọrụugbo ka ha hie asaa n’anya gbasara otu ha si eji kemikal egbu ụmụ anụmanụ n’ihe oriri n’ihi na ọ na-ebute ọrịa kansa n’ebe mmadụ nọ ma amaghị ka e siri hazie ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here