Ibenata mkpamkpa ide mmiri n’akpa n’ala anyị

0
6
Iju mmiri toro n'Ogbaru

MMIRI ozuzo dị mma maka na ọ bụ oge mmiri ozuzo ka eji akọnye ihe a ga-eri kwa afọ ọ bụla. Ọ bụkwa oge ihe nile dị ndụ ji ekute ume ndụ. Mmiri ozuzo dị mma mana oke mmiri ozuzo na-ewetara ihe ọ bụla na-eku ume oke ọdachi.

  Ọ bụ n’ime oke mmiri ozuzo ka e si enweta oke ide mmiri bụ nke na-ewetara ihe nile ọ bụla oke ọdachị jọgbụrụ onwe ya. Ide mmiri pụtara mmiri juputara ebe nile na mberede, oge ụfọdụ ọ bụrụ n’oge ehihie ma ọ bụ oge abanị.

  Ide mmiri bụ ihe enweghị aka ma ọ bụ ụkwụ mana ọ na-akpa ike ọjọọ. Ọ na-eropụ osisi n’agbanye ka osisi ahụ ra, ọ na-akwatu ụlọ, ọ na-ebu mmadụ, na-ebukwa ụgbọala nakwa ọtụtụ mmekpa ahụ ọ na-ewetara mmadụ.

  E wepu ụlọ, osisi, ngwa ahịa nakwa ngwo ngwo ndị mmadụ ide mmiri nwere ike I buru. Ihe ọzọ na-eweta ide mmiri jiri ebukarị mmadụ bụ enweghị ndidi. Mmiri na-ezo, ụfọdụ asị ka ha laba, ma ọ bụ ha ebilie, gaba ọlụ ma ọ bụ ahịa ma ọ bụkwa ebe ọ bụla dị ha mkpa. Oge ụfọdụ, ha ekwudo oke ide mmiri n’ụzọ. N’ihi na ha amaghị otu ụzọ ahụ dị na mbụ, tinyere ide mmiri juru ebe nile, ha adanye n’olulu, ide eburu ha.

  Ihe ọ bụla nwere ọghọm nwekwara uru. Uru abụghị n’anyị na-asi ka ide mmiri na-adi mgbe ọ bụla. Ụfọdụ uru dị n’ide mmiri bụ na akụkụ ndị ọlụ ubi ka ọ dịkarị maka na ebe ọ bụla ide mmiri na ebukọ ihe nile, ịkọ ihe n’ebe ala ubi dị otu ahụ na-eme ihe nke ọma.

GUO:  Na Jigawa, ide mmiri egbuola mmadụ ruru iri abụọ na ise

  O kwesiri ka ndị gọọmentị leba anya n’ihe gbasara ide mmiri. Ka ha lụọ ezigbo ọwara mmiri ka ide na-aga ebe okwesiri. Onye na-alụ ụlọ, ya alụchina ebe ide mmiri na-esi aga. Ndị na-ekponye ahịhịa n’ọwara mmiri ma ọ bụ n’ide ma mmiri na-ezo, kwụsi ya kpam kpam.

  O kwesịrị ka ụfọdụ n’ime ha kpatara ego nyere gọọmentị aka n’ihazi obodo anyị ka ọ na-atọ ụtọ dị ka ebe ahụ ha jere.    

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here