Mgbọ egbe atụgbuola pastọ ka ọ na-ekpe ekpere ụtụtụ n’ụlọ ya

0
7

MMADỤ abụọ anwụọla n’ike na Nkaliki dị n’okpuru ọchịchị Abakaliki, steeti Ebonyi oge e nwere ọgba aghara ndị ntorobịa.

  Otu n’ime ndị ahụ lara mmụọ bụ onye pastọ aha ya bụ John Onu onye mgbọ egbe (stray bullet) tụrụ ka ọ na-ekpe ekpere n’ụlọ ya. E kwuru na mgbọ egbe tụrụ ya oge ndị ọrụ nchekwa wụchara ogbe ahụ iji gbochie ndị ntorobịa ahụ iwe na-ewe ịgba otu ụlọ oriri na ọńụńụ nke otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwe ọkụ.

  Ndị ntorobịa Ebyia Upnuhu dị n’okpuru ọchịchi Abakaliki nọ na-agba ụlọ ọkụ n’ogbe ahụ n’ihi ntigbu e tigburu otu nwoke na be ha. Ndị ntorobịa ahụ mechara hapụ obodo n’iwe wee gaa Abakaliki isi obodo steeti ahụ mee ngagharị iwe maka ogbugbu e gburu nwoke ahụ.

  Ya mere, ha wakporo otu ụlọ oriri na ọńụńụ nke otu nwoke aha ya bụ Chukwudi Onyibe, onye enyemaka pụrụ iche nye onyeisioche okpuru ọchịchị Abakaliki, new.

  E wepu ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ, ndị ntorobịa ahụ gaara agba ụlọ oriri na ọńụńụ ahụ ọkụ.

  Ka ndị ọrụ nchekwa na-agba egbe aghara aghara iji chụsasịa ndị ntorobịa ahụ na-akpa aghara, ka mgbọ tụrụ pastọ John Onu nke ụlọụka Glorious Gospel Fire Assembly, Abakaliki, onye nke bi na ncherịta ihu ụlọ oriri na ọńụńụ ahụ; ma bụrụ onye nọ na-ekpe ekpere ụtụtụ. Mgbọ egbe ahụ ka e kwuru na ọ tụrụ ya n’obi, ọ nwụọ.

  Ndị ntorobịa ahụ ka e kwuru na ha chọrọ ịwakpo isi ọnọdụ okpuru ọchịchị (Abakaliki Local Government Headquarters, Nkaliki) ma ndị ọrụ nchekwa chụsasịrị ha.

  Oge a kpọtụụrụ ya, osote onye uweojii na-ahụ maka mmekọrịta ha na ndị mmadụ na steeti ahụ, Philip Levi, kwuru na ya bụ ihe mere eme ma kọwaa na ebe niile ederela duu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here