Mịnịsta ọrụugbo akpọkuola ndị Nigeria ka ha na-ego nri ndị ala anyị rụpụtara

0
7

 MỊNỊSTA ọrụugbo na mmepe ime obodo (Minister of Agriculture and Rural Development), a họpụtara ọhụrụ, Mohammed Abubakar akpọkuola ndị Nigeria ka ha na-ego erimeri ndị a kọpụtara n’ala Nigeria iji wee kwado ndị ọrụugbo.

  O kwuputara nke ahụ, oge ọ na-ahafe ya ọrụ n’aka isi ọnọdụ mịnịstrị ahụ dị n’Abuja.

  Ka ọ na-akpọku ndị Nigeria ka ha na-ego ihe ndị a rụpụtara n’ala anyị, Mịnịsta ọhụrụ ahụ kwuputara mkpa ọ dị bụ ichekwa ihe oriri, ma kọwaa na Nigeria nwere ihe niile ọ ga-ewe iji nwee ihe oriri n’ozuzu oke ma bụrụkwa ndị bu ụzọ n’ịrụpụta na ibufe ihe oriri mba ọzọ.

  O kwuru sị: “Goro ihe ndị a rụpụtara na Nigeria oge ọbụla I nwere ike n’ihi na ọ bụ sọ ya bu ụzọ anyị ga-esi akwado ndị ọrụugbo anyị ka ha wee nwee ike na-arụpụta ihe oriri. Anyị achọpụtala na anyị ga-emeli ya, n’ihi na oge e mechiri agbata oke (border) anyị na ndị mba ọzọ, osikapa zuuru anyị. Ọ bụladi onyeisiala na-eri otu osikapa ahụ. Ya mere, onweghị ihe ga-egbochi anyị ịtụnyere ndị ọrụugbo nke anyị.”

  Ọ gara n’ihu kwuo na ichekwa ihe oriri dị oke mkpa ma bụrụ ụzọ a ga-esi mee ka ihe oriri zuoro anyị.

  Abubakar dị na mbụ kwuo na ebumnobi ya nke kacha bụ ịbagide National Livestock Transformation Plan.

GUO:  Ọrụugbo n'gba ọfụụ

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here