N’Anambra, òtù NILOWV emeela ọgbakọ nkuzi ome n’afọ ma nye ụmụakwụkwọ nkwado

0
8
Uzoezie (n'aka nri), mgbe ọ na-enye ụmụakwụkwọ ahụ nkwado

NDỊ òtù League of Women Voters of Nigeria (NILOWV), ngalaba steeti Anambra emeela ọgbakọ nkuzi ome n’afọ ha tinyere amùmà nkwado (annual seminar/empowerment programme). Ọ bụ n’ụbọchị onye kwuo uche ya (Democracy Day) nke afọ a, Septemba 15, 2021 ka ha mere ya.

  Emume ahụ nke weere ọnọdụ n’Ekwulobia dị n’okpuru ọchịchị Aguata kpọtụrụ akpọtụ ma bụrụ nke ụmụnwaanyị ji obi ha niile were nabata. A kọwara ma kuziere ha ụzọ ha ga-esi tụọ okwe nhọpụta ọchịchị, na ọrụ ha nwere ịrụ dịka nne n’oge a na Nigeria ma kwụọrọ ụmụaka koleeji ndị onweghị ka ọ ha, ụgwọ akwụkwọ.

  N’ozi ekele nnabata ya, onyeisi òtù ahụ, Dọkịnta Cordelia Ego Uzoezie gbakwasara ụkwụ n’isiokwu ncheta ụbọchị ọchịchị onye kwuo uche ya nke afọ a, nke bụ; ọchịchị onye kwuo uche ya: Isi sekpụ ntị maka udo idịgide na Nigeria (Democrary: An Engine for Sustainable Peace in Nigeria). O kwuru na ọchịchị onye kwuo uche ya na-eweta udo na ọganihu; na iji mee ka ọ dị otu ahụ, mmadụ niile kwesịrị ijikọta aka ọnụ maka na a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ.

  Tinyere ihe ndị ọzọ, o kwuru sị: “E leba anya n’isiokwu anyị, ọ bụ ihe nwute na ala anyị na-agabiga ọnọdụ enweghị ezi nchekwa (ohi oji egbe, ntọrị, mwakpo ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ, nsogbu ndị Fulani na-achị ehi, ndị agha ọ lụọ ọ laa Boko Haram w.d.g), bụ nke na-echere udo aka mgba n’ala anyị dịka a na-atufu ndụ na akụnụba. Gọọmentị nwere ọrụ ha ga-arụ iji hụ na e nwere ọnọdụ ezi nchekwa tinyere udo nke ga-adịgide n’ala anyị. Usoro e si achị ọchịchị ga-eme ka e nwee udo n’ihi na ezi ọchịchị na-akwalite udo.”

  Dọkịnta Uzoezie kpọkuru ụmụnwaanyị ka ha kee aji n’ume ma hụ na ha na-etinye ọchịchị onye kwuo uche ya n’ọrụ n’ezinaụlọ ha dị iche iche.

  Ya mere, o kwuru sị: “Anyị nọ ebe a iji tụkọọ uche ọnụ maka okwu a kpụ n’ọnụ n’oge a. Ime nhọpụta ọchịchị na-abịa na nsonso a, anyị bụ ụmụnwaanyị na-agabiga ọnọdụ iche aka mgba. Anyị abụghị òtù ndọrọndọrọ ọchịchị kama anyị na-enye ụmụnwaanyị nkwado ka ha pụta sonye n’ihe a na-eme, ka a ghara ịhapụrụ sọsọ ụmụnwoke.”

  Ọ gakwara n’ihu kọwaa na òtù ahụ nke malitere afọ iri abụọ na isi gara aga nọ oge niile na-akwado ụmụnwaanyị na mmụta na ọrụaka, ma dụọ ha ọdụ ka ha malite n’obodo ha dị iche iche, na-achawapụ.

  O kwukwara sị: Anambra bụ steeti ala Igbo kpomkwem, ejighị ịghafu ọbara mara anyị. Anyị ga-ahọpụtarịrị onye ndu maara ihe ekwe na-akụ ga na-emejuputa ọnọdụ ọchịchị onye kwuo uche ya.”

  N’akụkụ nke ya, oge ọ na-enye nkuzi banyere nghọta n’ịtụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, Lady Berny Anene kpọkuru ụmụnwaanyị ka ha kpee ekpere maka ezi onye ndu ga-edu ha ka ụmụ Israel, gafee oshimiri Jordan, ma kọwakwaara ha uru kaadị e ji atụ okwe nhọpụta bara.

  O kwuru sị: “Ịtụ okwe nhọpụta ọchịchị bụ ikike ụnụ nwere (civic right). Nweenụ ndidi, tụọ okwe nhọpụta ọchịchị. Sinụ mba na iri ngarị na ime wuruwuru. Ụnụ ekwela ka ụmụ ụnụ bụrụ ngwa ọrụ tigbuo zọgbu na nhọpụta ọchịchị.”

  Na nkuzi nke ya, Dọkịnta Anuli Aguiyi nke si Nwafor Orizu College of Education, Nsugbe dụrụ ụmụnwaanyị ọdụ ka ha mara otu ha si azụlite ụmụ ha iji mee ka ha baa uru, dịka o kwuru na ndị nne kwesịrị ịrụ ọrụ ha nke ọma.

  O kwuru sị: “Anyị bụ ndị nne, olee otu anyị sị azụlite ụmụ anyị iji kwụsị ihe ọjọọ dị n’obodo? Ọtụtụ ụmụaka nwaanyị na-agbazi ọtọ n’ụlọakwụkwọ dị elu taa. Nwa m akarịala m bụ aghụghọ. Ka anyị chegharịa ma rụọ ọrụ dịịrị anyị dịka ndị nne nwere ezi ntụkwasa obi. Ụnụ ga na-aga ileta ụmụ ụnụ nọ na mahadum.”

  Ọ gara n’ihu kelee onyeisi òtù ahụ bụ Dọkịnta Uzoezie maka oke mbọ ọ na-agba ma jaa ya ike ka o jide ka o ji na-aga n’ihu ma na-eme karịa.

  Oge NILOWV na-enye ụmụakwụkwọ ahụ karịrị iri n’ọnụọgụ nkwado, site n’ịkwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ, Uzoezie kpọkuru ha ka ha jiri agụmakwụkwọ ha kpọrọ ihe iji baara onwe ha ezi uru ma gosipụta ezi ihe nke nọ n’ime ha.

  Ụmụakwụkwọ ahụ ji ańụrị kelee ekele n’ebe ọ dị ukwuu maka na e nye nwata ihe karịrị ya, ọ jụọ ma a sị ya nye onye. Egbunine Chioma, onye si na Community Secondary School, Ugboukwu; Okoye Chinaza, Community Secondary School, Aguluezechukwu; na Ugochukwu Chinasa, First Hill Secondary School, Ekwulobia n’ajụjụ ọnụ a gbara ha iche iche kpere ka Chineke gozie ha.

  N’oge ọ na-enye ekele ya n’aha ụmụakwụkwọ ibe ya, Okoli Chinedu si All Saints Secondary School, Umunze dị n’okpuru ọchịchị Orumba South kwuru sị: “Daalụnụ maka inye anyị nkwado. Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ibe anyị kwụsịrị ịgụ akwụkwọ n’ihi otu ọnọdụ siri dịrị ha. Ụnụ ga-ahụ ụmụ ụmụ ụmụ ụnụ, n’aha Jesus.”

  Otu n’ime ụmụnwaanyị bịara ọgbakọ ahụ, Oriakụ Bridget Ngozi Onyesolu si Ekwulobia kọwara na mmemme ahụ bụ ịgba ma rụtụkwa aka na ha mụtara nnukwu ihe na nkuzi e nyere ha dịka ọ mere ka obi dere ụmụnwaanyị duu n’ọnọdụ ihe iche aka mgba dị ugbu a. Ọ gara n’ihu kpọkuo ụmụnwaanyị ka ha tụkwasa Chineke obi oge niile.

  N’akụkụ nke ya, nwaanyị ọzọ sonyere na emume ahụ, Oriakụ Helen Adaobi Ezeosim si Oko, Orumba North kwuru sị: “Òtù a mara mma, a mụtara m ọtụtụ ihe taa.”

  Oge ọ na-enye ekele n’aha ụmụnwaanyị ndị ọzọ, Oriaku Cordelia Okoye si Igboukwu gosịpụtara obi ańụrị na afọ ojuju ha nwere. O kelere ndị chịkọbara emume ahụ ma kwe ha nkwa na ndụmọdụ ha ga-amịta ezi mmịmị n’ihi na ha nabatara ya nke ọma. Ọ gara n’ihu too ha maka nkwado ha nyere ụmụakwụkwọ ndị ahụ onweghị ka ọ ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here