Obiano ekwenwòóla ndị Anambra nkwà ezi ọnọdụ nchekwa

0
7
Gọvanọ Willie Obianọ (n'etiti), Maazị Uchenna Okafor (nke mbụ n'aka nri) na ndị ọzọ, oge ha na-aga njem nleta ahụ

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwenwòóla ụmụafọ steeti ahụ na ndị bi n’ime ya nkwà na ọchịchị ya ga-aga n’ihu inye ha ezi nchekwa bụ ịgbà.

  Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a oge ọ bagidere na njem nleta n’ụfọdụ ahịa nà ná mpaghara ebe ọzọ dị icheiche na steeti ahụ, iji mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ, dịka o siri metụta ntụziaka ahụ ndị òtù ‘Indigenous People of Biafra’ (IPoB) nyere ka ndị mmadụ kwụsị ịpụta iro ụbọchị Mọnde ọbụla n’ala Igbo, bụkwa nke ya onwe ya kwuru ka ndị mmadụ leghàra anya.

  Gọvanọ Obianọ nọrọ ụbọchị ahụ wee gaa n’ụfọdụ ahịa dị icheiche dika  ahịa Eke Awka, ahịa Afọ Igwè dị n’Ụmụdiọkà, nà ahịa Oye-Agụ Abagana, bụkwazị ebe ọ chọpụtara na ahịa na-azụ ma na-ekwòkwa èkwò ụbọchị ahụ; ma bụrụkwazie ebe ọ nọrọ wee gwa ndị na-azụ ma na-ere n’ahịa ahụ okwu, gbàá ha ume site n’ịzụ ha ahịa, ma kwenwòó ha nkwà ezi ọnọdụ nchekwa.

  N’okwu ọ gwara ndị ahịa ahụ ụbọchị ahụ, Gọvanọ Obianọ mèkwàrà ka a mara na e jidela ndị ahụ wakpòrò ma gbagbuo ndị uweojii na-arụrụ onwe ha ọrụ n’Onitsha ma mụnyekwa ụgbọala ndị uweojii ahụ ọkụ ụbọchị Ụka gara aga. Ọ katọrọ ya bụ ajọ akparamagwa ndị ojiègbè ahụ, ma kwe nkwà na a ga-eji usoro iwu wee nyụọ ha ịkpakwụ.

  Gọvanọ Obianọ gakwara n’ụfọdụ ụlọ ọba ego dị icheiche n’ime steeti ahụ ụbọchị ahụ, bụkwa ebe ọ nọrọ wee hụ na ha amalitela ọrụ n’ozuzuokè.

  N’okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ahịa na azụmahịa na steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor kọwara ntụziaka ahụ Gọvanọ Obianọ nyere ka ndị mmadụ leghàrá ntụziaka ‘onye apụtakwala iro’ ahụ IPoB nyere anya dịka nke magburu onwe ya, n’ihi na gọọmenti agaghị akụkọ aka, gbachị nkịtị, ma na-ele ka ndị ejighị ọkwa ọchịchị ga-esi na-etiti ụmụafọ steeti ahụ iwu ihe ha ga-eme na ihe ha agaghị eme. Ọ kọwakwara na ntụziaka ndị òtù IPoB ahụ dịka nke iwu akwadòghị, ma kwukwa na  ihe ahụ na-emetụta ọnọdụ obibindụ ụmụmmadụ na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ; ma kwuo na gọọmenti agaghị ekwe ka nke ahụ guzoro.

GUO:  COVID-19: Gooment Anambra ga-akwanyere ụfọdụ ndị Ọrụ ahụike ugwu maka mbọ ha

  N’okwu ha n’otu n’otu, onyeisioche ahịa Afọr Igwè Ụmụdiọka, bụ Maazị Dennis Okwuosa, na ògbò ya nke Oye-Agụ Abagana, bụ Maazị Ugochukwu Nwokaka kelere Gọvanọ Obianọ maka mmasị ya n’ọdịmma ụmụafọ steeti ahụ na ọnọdụ nchekwa ha, ma kwe nkwà na ha na ndị ahịa ha ga-aga n’ihu irube isi nye ọchịchị ya na ntụziaka ya n’ozuzuoke.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here