Ọnọdụ ihe isi ike n’oge a na usoro a ga-eji meria ya

0
5

ỌNỌDỤ ihe isi ike bụ nnukwu ihe iche aka mgba n’oge ugbu a, ma n’ala anyị ma n’ebe ndị ọzọ. Onye ukwu na-ebe, onye nta na-ebe.

  Mmadụ niile, ma ndị ọrụ oyibo, ndị na-azụ ahịa, ndị ọrụ aka w.d.g na-ebe na ihe siri ike karịa. Ebe ndị ọrụ oyibo na-ekwu na ọ bụ ha ka ọ kacha njọ n’ihi na e mee elu mee ala na ọ bụ ego ole gọọmenti na-akwụ ha ka ọ ga na-aga n’ihu na-akwụ. Na ọ bụ e mekata, o tee ezigbo aka ka e ji eleba anya ma tinyekwuoro ha ihe n’ụgwọ ọnwa ha.

  N’akụkụ nke ha, ndị na-azụ ahịa na-akọwa na ihe niile galara oke ọnụ nke na mgbe ụfọdụ ha gotechaa ahịa rechaa ha anaghị enweta uru, isiokwu ha wee brụ na ha na-agabiga ọghọm ahịa.

Ndị ọrụaka na-akọwa na ha anaghị enwekebezi ọrụ n’ihi ọnọdụ ọjọọ ihe isi ike debere ndị mmadụ, iji maa atụ, ọ bụ onye rie nri o were rụba ụlọ. Nsogbu a mere na ndị ọrụaka anaghị enwezi ọrụ ka ha si enweta na mbụ.

  Otu a ka ọ dị na ngalaba ndị ọzọ dị iche iche. Ọ bụladi ihe ndị e si n’ụlọ buputa ahịa na-agalakwa ọnụ. Ndị mmadụ na-ekwu na ihe ndị e wetara n’ụlọ ekwesịghị ịgala ọnụ n’ihi na e wetere ya n’efu ma otu nwaanyị si be ya gaa ahịa ire akwụkwọnri kwuru na ọ bụ site n’ego ya retere n’akwụkwọnri ahụ ya wetere n’ụlọ ya ka ya ga-eji gota ihe nri ndị ọzọ ya enweghị dịka osikapa, anụ, azụ na ihe ndị ọzọ. Ya mere, ọ na-akọwa na ọ bụrụ na ya ree akwụkwọ nri ya kọbọ kọbọ na ya agaghị enweta naịra ya ga-eji goro ihe ya na-eri.

  Mmanụ ọkụ ‘fuel’ dị oke ọnụ n’oge a, nke mere na ime njem na-adịzi oke ọnụ. Tupu mmadụ esi be ya pụọ gaa ọrụ, ahịa ma ebe ndị ọzọ ọ na-aga, ọ chọpụta na ọ tufuola nnukwu ego. Ihe ndị a na-ere n’ahịa ma ihe ndị ọzọ dị iche iche bu mmanụ ọkụ ‘fuel’ ka e ji ebu ha.  Ọ bụ ya so n’ihe mere ihe niile jiri laa elu n’ike.

  Otu o sila dị, ọtụtụ ndị mmadụ na-akọwa na ndị mmadụ so eme ka ihe na-esiwanye ike. Ha na-akọwa na oke ọchịchịọ dị n’ụwa ugbu a, onweghị onye na-emere ibe ya ebere. Ndị na-anya ụgbọala, ọgbatumtum nụ na a ga-etinye ego na mmanụ ọkụ ‘fuel’ ha ewelie ọnụ ego ha ozigbo n’ebughị ụzọ chere ka e tinye ego na mmanụ ọkụ ‘fuel’. Ọnọdụ dị otu a jọrọ njọ, ọ bụ obi ọjọọ mmadụ na-enwe n’ebe ibe ya nọ. Oke ọchịchọ na anyaukwu adịghị mma. Ọzọ bụ mgbe ụfọdụ ọ bụrụ na ụgbọala adị ụkọ n’ọdụ ụgbọala, o nwee ka e siri hụta otu ụgbọala anya, ọkwọ ụgbọala ebulie ọnụego ozigbo n’ajụghị ma ndị ahụ na-eme njem ojikwa ole ego ahụ. Ọzọ dịka ibe ya bụ chi jibido onye njem, ndị ọkwọ ụgbọala na ndị ọgbatumtum tinyere nke ụkwụ atọ na-ana onye ahụ ihe karịrị okpukpu atọ ihe o kwesịrị iji mee njem ahụ.

  N’akụkụ ndị ahịa, ha na-emekwa nke ha dịka ha nụ na ihe tinyere ego ha ebulikwuo ahịa ndị ha nweburu mbụ. Ihe ndị a niile enweghị aka ọ ga-enyere anyị. O kwesịrị ka anyị jiri nwayọọ chọọ ihe dabara na mmiri.

  Ọnọdụ ihe isi ike a mekwara ka iri ngarị laa elu n’ebe ndị ọrụ oyibo nọ, onweghịzi onye na-arụ ọrụ dịịrị ya ma ọ bụrụ na e nyeghị ya aka azụ. Arụrụala were si otu ahụ na-arị ibe ya elu.

  Ajụjụ were bụrụ, olee otu a ga-esi kwụọ onye ukwu wara? Ihe nwere mbido kwesịrị ka o nwee njedebe.

  Ndụmọdụ bụ ka onye ọbụla chọọ ihe ọ na-eme maka na nkịtị adịghị mma ọnụnọ. Ndị nwere ihe ha na-eme chọọ ihe ọzọ gbakwunyere ya, ka o were zuo.

  Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị ọrụ oyibo na-abagidezi ịkọ ugbo azụ ụlọ iji nyere onwe ha aka. Ihe mmadụ wetere n’ugbo ya dịka ji, akpụ, ọka, akịdị, akwụkwọnri w.d.g na-enye nnukwu aka n’ezinaụlọ. Otu ahụ ka ọ dịkwa na ngalaba ọrụugbo ndị ọzọ dịka ịzụ anụmanụ: azụ, ọkụkọ, ezi, ewu, ehi, ejula. Ihe ndị a nille na-enye ego ma na-emekwa ka onye bagidere ha na-eriju afọ.

  Ọzọ bụ ka ndị ntorobịa niile nọ nkịtị chọọ ihe ha ga-eme. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ n’ime ha guchara mahadum, fee ala Nigeria ma na-echezi ọrụ oyibo, ma ọbụghị ya ga-eme ka mmadụ nọrọ nkịtị. Onye ọ bụla nọ nkịtị bụ ngwa ọrụ ekwensu maka na ngana kpuchie ute agụụ ekpughee ya. Ya mere, dịka mmadụ na-eche ọrụ oyibo, ya binye aka n’otu ihe ọ ga-esi na-enweta ego. Ọtụtụ ndị mmadụ esila n’ụzọ ahụ baa ọgaranya, na-ewezi ndị ọzọ n’ọrụ. Ịnọ nkịtị bụ ya na-etinyekari ndị ntorobịa n’ọnọdụ mpụ na aghụghọ.

  Ụfọdụ n’ime ha na-anọ ebe ha nọ nkịtị na-arọ nrọ inwe nnukwu ụgbọala, biri n’ụlọelu ụdị ya adịbeghị mbụ.

  Ka a na-ekwu maka ndị ntorobịa ka a na-ekwukwa maka ndị okenye. Ọtụtụ ndị okenye nọ nkịtị n’enweghị ihe ha na-eme, ma nwoke ma nwaanyị dị ya. Ọ bụ ọnọdụ dị otu a na-eme na oge ụfọdụ nwoke onye Igbo bi obodo mepere emepe dịka Lagos ga-alọta ime obodo lụọ nwaanyị, gwa nwaanyị ahụ na ya na azụ ahịa nke a na nke ọzọ na Lagos, na ọ bụrụ na ya lụrụ ya na ha ga-ebi Lagos. Ma n’ikpeazụ, akụkọ niile ahụ abụrụ aja mbele. Otu nwaanyị achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru ka otu nwoke onye obodo ha bi Lagos si bịa lụrụ ya, ka ha gbachara nkwụ, gbaa akwụkwọ nwoke ahụ alaghachịghị Lagos ọzọ. Nke kacha bụ na onweghị ihe ọ chọrọ imetụ aka, yaabụ ọ malitere nọba nkịtụ ma bụrụzie ibu arụ nyere nwaanyị ahụ ọ lụtara. Nwaanyị ahụ kwuru na di ya gwara ya tupu ọ lụba ya na ọ na-azụ ahịa akwa na Lagos.

  Ya mere, na ya dụrụ ya ọdụ ka ọ malitekwa zụba ahịa akwa ahụ n’ime obodo ma ọ jụrụ ajụ. Ọ gakwara n’ihu rịọ ya ka ọ chọọ otu ihe ọbụla ọ ga-emenwu iji nyere ezinaụlọ ha aka ma ekwe akụtaghị onye ala ji. Ka ọ dị ugbu a, nwaanyị ahụ amụtala ụmụ atọ ma na-atagbu onwe ya n’ahụhụ.

  Ọnọdụ ihe isi ike dị otu a na-agbawa obi maka na ọ bụrụ na nwoke ahụ tinyere aka n’otu ihe, ọ ga-aka mma n’ihi na aka weta aka weta o ju akpa. Nwoke dị otu a ekwesighị ka a kpọọ ya nwoke n’ihi na a napụ mmanwụ ihe o jiri bụrụ mmanwụ ugwu ya arụọ.

  Ka ọ dị na nwoke ka ọ dị na nwaanyị n’ihi na ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ nkịtị taa, kụrụ asịrị na-agagharị. Ndị dị otu ahụ hapụrụ di ha ka ibu o bu nyịgbuo ya. Oge agaala mgbe nwaanyị na-atọgbọ n’ụlọ na-eri akụ, nwaanyị na-esozi akpata akụ n’ụwa taa. Ndị nọ nkịtị na-abụ a chọọ di ha achọọ, o foo ha n’anya.

  Onye ọbụla ma nwoke ma nwaanyị kwesịrị iji ehihe chọọ ewu ojii maka na chi jie ọ ga-esi ike ịchọta ya.

  Ọnọdụ ihe isi ike dị n’oge a ga-abịa na njedebe ma ọ bụrụ na ndị mmadụ gwa onwe ha eziokwu, kee aji n’ume ma mara onwe ha. Onye ọbụla tinye aka n’ọrụ, mee ihe ọ ga-eme dịka o kwesịrị, ihe ga-adị mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here