Akụkọ iho: Ihe mere nwamba enweghị enyi n’ala ụmụanụmanụ

0
4

O NWERE otu anụ a na-akpọ Nwamba, ụfọdụ na-akpọ ya Nwologbo. Nwamba nwere otu nwanne a na-akpọ Nnanwụrụde. Sọ ha abụọ bụ ụmụ nne na nna ha mụtara. Nke a pụtara na ọ bụ sọ Nnanwụrụ (aha mkpọbiri ya) bụ nwanne Nwamba nwere.

  Ọ bụ ya bụ Nnanwụrụ bụ anụ kachara were ka nka n’obodo ụmụanụmanụ. Ọ bụ ya bụkwa eze ha. Oge ọ bụla e gburu anụ ma ọ bụ nwee ihe ọ bụla e kere n’obodo ụmụanụmanụ nke Nnanwụrụ ga-akacha nke onye ọ bụla. Dịka eze ụmụanụmanụ, Nnanwụrụ kwedosiri aka ike na onye ọ bụla ga na-eme ezigbo omume ma dịkwa ike ọrụ.

  Ma dịka ihe siri dịrị, ụfọdụ ụmụanụmanụ na-enwe ntaji anya maka ọnọdụ Nnanwụrụ n’obodo ha. Nke a mere na ha bidoro tụwa aro otu  ha ga-esi gbu ya ka ha wee nwere onwe ha n’iwu nke ọ na-etiri ha.

  Iji wee mee nke a, ha gbara mbọ wee nwete nkwado nwanne ya bụ Nwamba n’ihi na ọ bụ site n’aka ya ka ya bụ okwu ga-esi wee nwee isi. Ha gwara Nwamba na ọ bụrụ na o gbuo nwanne ya bu Nnanwụrụ na ha ga-eme ya eze ma bugoo ya n’ọkwa dị elu. Ka ha gwachara ya ihe ndị a, Nwamba kwetara igbu otu nwanne o nwere.

  Ka Nnanwụrụ na nwanne ya bụ Nwamba nọ na-akpa nkata gbasara ezinaụlọ ha ma na-ańụkwa mmanya n’otu mgbede abali, Nwamba jiri ụzọ aghụghọ wee tinyere nwanne ya nsi na mmanya. Nsi ahụ bụ agwọ a na- akpọ echieteka nyere ya.  Ka chi echi ya foro, ha chọpụtara na Nnanwụrụ anwụọla. Ha liri ya n’ụzọ kwesiri ya ma kwaa ya nke ọma dịka eze.

GUO:  Akụkọ iho: Onye ga-anyaba nwamba mgbirigba n'olu?

  Mana, ka ụbọchị ụmụanụmanụ gbakọrọ ka ha họpụta onye ga-anọchị  anya eze ha nwụrụ anwụ ruru, ha ahọpụtaghị Nwamba. Anụmanụ ha họpụtara bụ mbe. Nke a wutere Nwamba nke  ukwu. Oge ọ jụrụ ha ihe kpatara ha ji mee ihe ha mere, ha zara ya sị na onye ọ bụla tinyere aka n’igbu otu nwanne o nwere ekwesighị ịbụ onye eze. Ha gwara ya na ọ bụrụ na enye onye ahụ eze na ọ ga-esi otu ahụ gbuchapụ ndị ọ na-achị.

  Nwamba jiri iwe si n’etiti ha pụọ. O beere akwa gaa n’ili nwanne ya bụ Nnanwụrụ na-akpọ ya ka o bilite maka na ụmụanụmanụ aghọriala ya. Ọ bụ ya kpatara Nwamba ji ebe mịanwụ, mịanwụ oge ọ bụla nke pụtara, “ebee ka ị nọ Nnanwụrụ nwanne m?” Were ruo taa, Nnanwụrụ apụtakwaghị ọzọ. Ọ bụ ya kpatara Nwamba ji aga naani ya taa. Onweghi anụmanụ ya na ya na-adị na mma, nke pụtara na o nweghi enyi n’ala ụmụanụmanụ.

Ihe mmụta: Oke ọchịchọ adịghị mma, ọ bụ ya mere Nwamba jiri gbuoo sọọsọ otu nwanne o nwere.

Ihe omume: Ihe omume m ga-enye ụnụ bụ nke a – Gini mere egbe ji ebu ọkụkụ?

 Ka chi fo nụ o o

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here