Ejiji ndị ala anyị n’afọ 1960 na nke oge ugbua

0
3

N’OGE mbụ, oge Nigeria nweereonwe ha n’afọ 1960, e nwereejiji e jirimara ndị alaanyị. Ị hụonye Igbo ị mara, otu ahụka ọ dịkwan’ebe ndị Hausa na Yoruba naagbụrụ ndị ọzọnọ.

  Ejiji nwaikorobịa na-adị iche na nke nna mmadụ, tinyekwara nke agbọghọbịa na nne nwaanyị.

  Site n’akwammadụyin’ahụ wee ruon’ụkwụ, ị ga-ama ebe onye si naihe ọ bụ. Mana taa ihe agbanwoola, ọnọdụ adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, a maghịzi onye bụ onye. Agbụrụ dị iche iche na-ejizi ejiji otu o siri masị ha.

  N’akụkụ ụmụnwoke, anaghị amazị nna mmadụ n’ihi na ọtụtụ n’ime ha na-eyizi akwa ụmụikorobịa. Ọtụtụ ụmụnwoke na-etezi ihe n’isi, ọtụtụ na-akpa nke ha akpa, ebe ndị ọzọ na-akwụzị iyeri ntị w.d.g.

  Ụmụnwaanyị, ma agbọghọ ma nne nwaanyị na-eyizi traụza n’eleghị anya n’azụ. Ha na-akwụnye mbọ aka, iku anya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ịma ọgọdọ ukwu abụọ bụ ihe e ji mara ụmụnwaanyị ndị Igbo. N’oge ahụ nwaanyị lụọ di, o bido mawa ukwu akwa abụọ nke bụ na onye ọbụla hụrụ ya ga-ama na ọ lụọla di; ma taa, ekwe akụtaghị onye ala ji. Ajụjụ wee bụrụ: ụmụnwaanyị ole na-ama akwa ukwu abụọ ma ha lụchaa di ugbu a?

  Ọ bụladị ụmụaka, anaghị amakwa nke bụ nwoke na nke bụ nwaanyị n’ihi na ha niile yichazi traụza akpagharị.

  Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị mmadụ ka na-agbalị ịhụ na ejiji ha ka dị otu ọ dị na mbụ ma imirikiti agbanweela. Ọtụtụ ndị ala anyị esorola ndị ọcha n’ụzọ niile wee na-eńọmizi ndụ ha nke mere na ha tufuziri ejiji ndị ala anyị kpamkpam.

GUO:  Ejiji: Akwa e ji akpọchị akpịrị

Mgbe ụfọdụ, onye jie ejiji o kwesịrị iji dịka ezi nwa afọ ala Nigeria ọtụtụ ndị mmadụ ahụtaba ya dịka onye amaghị nke a na-akọ ‘mgbeke’. Ị baruo na mahadum, ịhụ ka ụmụakwụkwọ ụfọdụ jiri ejiji ka ndị ara mana nke bụ eziokwu bụ na ndị ọcha ha na eńomi anaghị eji ejiji ka ndị ara.

  Otu o sila dị, Maazị Ndu Okeke kwuru sị: “Ejiji na-agbanwe site n’oge n’ihi mmụta, njem, mmekọrịta na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’oge gboo, ụmụnwoke na-awa ọgọdọ, nke bụ e weta akwa akwanye ya na mpara o kpuchie ihe mmadụ jiri bụrụ nwoke ma ị ga na-ahụ apata ike ya abụọ anya. Ka nke ahụ gachara ha bidoro yibe nke a na-akpọ danchiki.

Nke ahụ bụ e weta akwa e bepuo ya isi, bepuo aka abụọ, kwata traụza. Ka e bidoro yibe danchiki, ndị ọcha batara ndị mmadụ wee mụta ejiji ndị ọcha dịka iyi akwa elu na-enwe mkpọchị (shirt), ịkpọ taị, iyi cootu. N’otu aka ahụkwa, agbụrụ dị iche iche, n’ihi mmekọrịta bidoro jibe ejiji agbụrụ ndị ọzọ n’ala Nigeria nke n’abụghị ejiji ha.

Ọmụmaatụ, ndị Igbo bidoro yibe agbada nke n’abụghị ejiji ha, otu ahụ ka ọ dị wee ruo taa. Ya mere, otu a ka ejiji siri kwesị ka ọ dị n’oge ugbu a n’ihi na ihe na-agbanwe agbanwe. Ọ bụzị ka anyị je wabakwa ọgọdọ? Mbanụ! Mmụta na mmepe abatala, o kwesịrị ka ihe dị iche dị.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here