Jigida, ejiji mgbe ochie

0
3

NA mgbe ochie, ọdịghị uwe ọ bụla ha nwere. Onye ọ bụla n’agba ọtọ, ma nwoke ma nwanyị,ma  ụmụagbọghọ na ụmụokorobia. Ha amaghị ihe bụ uwe. Ndị dị ike na achụ nta n’oge ahụ malitere  ị were akpụkpọ anụ ha gburu na-emere onwe ha obere akwa ha na eke nani n’ukwu ha. Ọ bụghị mmadụ ncha nwere akpụkpọ anụ ahụ.

  Mgbe ha malitere na-enwe nghọta nwayọ nwayọ, ha wee metara ụmụ nwanyị jigida. Ha malitere ịga jigida mana ọ bụ onye nwere ego ga enwe jigida ahụ. Jigida bụ nani n’ukwu ka a na-eyi ya, adịghị eyi ya n’obi. Ha na-eyiri jigida n’ukwu maka ikpuchi ihe ha ji bụrụ nwanyị mana ha gbakwa ọtọ.Jigida a na-ekwu abụghị akwa, ọ bụghị akpụkpọ anụ, ọ bụghị akwa a kwara akwa kama ọ bụ mkpuru ihe dịka mkpụrụ ‘ludo,’ akpọpue ya n’etiti,were owu gaa ya. A gajue ya, e kechie  ya ọ dị gburugburu. Ndị nwere ego na-agara ụmụ ha jigida ahụ ihe dịka ụzọ anọ ma ọ bụ ụzọ asatọ.

  Ọ bụ jigida ahụ ka ha na-eyi ebe ọ bụla ha na-eje. A na-eme emume, ọ bụ jigida ka ha na-eyi eje mmemme ahụ. Ihe ụtọ dị n’oge ahụ bụ na n’agbanyeghị na ha na-agba ọtọ, nwoke na-agara onwe ya, nwanyị a na-agara onwe ya.

  Otu nwanyị ajụrụ ajụjụ maka jigida bụ Cecilia Okafor gwara onye ọlụ anyị ihe ndịa: Jigida bụ uwe ụmụ agbọghọ na-eyi n’oge gboo tupu ndị ọcha ewepụta akwa oyiyi na nke a na-ama n’ukwu. N’oge nke anyị n’Awka, o nwere obere akwa anyị na-eyi n’ukwu yikwasizie jigida na elu ya, mana a dịghị eyi ihe ọ bụla n’obi. Ana eme mmemme,  ọ bụ jigida ka ụmụagbọhọ nile ga- eyi n’elu obere akwa ahụ ha yi, ma onye nwere ara ma onye enweghị.

GUO:  Ejiji: Echiche ndị mmadụ banyere ndị kacha egosipụta njirimara ha n’etiti Igbo, Hausa na Yoruba,

 Ọ bụrụgodụ onye nna ya bụ igwe n’obodo, ọ bụ ihe ụmụagbọghọ ndị ọzọ yi ka ọ ga- eyi. Ihe dị iche bụ na jigida nke ya ga eru ihe dịka isii ma ọ bụ asatọ n’ukwu ya. Ihe ọzọ dị iche iche ọ ga-eyi dịka ada igwe bụ aka ọ ga-eyi n’olu ya. Ma ada igwe onwere ara ma ọ bụ na onweghị, ọ ga agba ọtọ obi. Ndị enweghị ego, nne na nna ha ga-egotara ha ihe dịka jigida abụọ ma ọ bụ atọ ha ga na-eyi.

  Mgbe a jụ rụ ya  ka nwagbọghọ nọ na nsọ si eme n’oge ahụ, ọ kọwara na n’Abakaliki ebe ọ nọ too agbọghọọ, n’etu ha si eme bụ na oruo mgbe nwanyị ga anọ na nsọ ya, o were eriri kee n’ukwu ya were akwa pịkọta tinye n’ukwu ya. Eriri ahụ okenyere n’ukwu ya ga-ejide akwa ahụ iru na azụ ya, emesịa, ọ sụọ akwa ahụ maka mgbe ọ ga-ahụ nsọ ya n’ọnwa ọzọ.

  Onye nke abụọ aha ya bụ Margaret siri na jigida bụ uwe ụmụagbọghọ na-eyi na oge gboo ma ụmụagbọghọ togoro ma ọ bụ obere agbọghọ. Ọdịghị akwa dị n’oge ahụ. N’oge ahụ, agbọghọ rue afọ iri na anọ ma onwere di ma ọ nweghị d, ọ bụ jigida ka ọ ga- eyi. Ọ bụrụ onye nne ya nwere ego, ọ gaara ya  jigida ga- eru ihe dịka anọ rue asatọ, ọ ga na-eyi, ma ọ bụrụ na ha enweghị ego, ole ọ bụla ndị mụrụ ya gotaara ya ka ọ ga-eyi kama ọ bụrụ na onwe mmemme enwere, nne ya ga rịọtara ya n’aka ndị nwere nnukwu jigida.

GUO:  Ejiji ụmụaka n'oge Ekeresimesi

  Ezinaụlọ ọ bụla nwere nwa nwanyị n’agba mbọ iịgotara ya jigida. Oruo anyasị, oyipu jigida ahụ ka ọ ghara ịdọbị. O rukwa ụtụtụ, oyirikwa ya mana ihe dị iche dị n’oge ahụ a na agba ọtọ bụ na onye ọ bụla na-akwanyere onwe ya ugwu. Nwoke adịghị eso nwanyị otu ha si eso nwanyị ugbua.Nwoke na-atụ egwu nne na nna ya. Otu aka ahụ, nwanyị na-atụ egwu nne na nna ya. O nwee mmemme ọ bụla e nwere, ma ị bụ nwagbọghọ nwere jigida ma ọ bụ na ịnweghị, ịchọọ ịga mmemme ahụ, ị ga-eje ya. Uwe adịghị maka ụmụagbọghọ. Ọ bụ nani ndị nwere di na-ama akwa n’ukwu ha ma obi ha na-agba ọtọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here