Nri ndị Igbo: Agharagha ji

0
3

NRI ndị Igbo n’izuụka a ga-apụ iche n’anya ụfọdụ amaghị na a pụrụ isi otu ahụ sie ji. Na mpaghara ala Igbo, ndị maara ya ha ga na-elo ọnụ mmiri ugbu a.

  Ihe ndị Igbo jiri dị iche bụ na ha ga-ewere otu ihe tụgharIa ya, ọ baa uru n’ọtụtụ ụzọ. Ụfọdụ chere na ọ bụ naanị awịa ji na agwa, ji na akwụkwọ nri bụ naanị otu e si esi ya.

  Ugbu a, mụta otu e si esi agharagha ji. Ịhọchaa agwa, saa ya mmiri sinye n’ọkụ, sie ya ka o ghee nke ọma. Bachaa ji, waa ya kịrịkịrị, ị ga-eji nwayọọ na-etinye mmiri n’agwa ahụ ka o wee ghee chaa achaa, wụnye ji ahụ i bere kịrịkịrị, o ghee ọ bụrụ na mmiri ka fọrọ na ya, ị wụpụ ya na nyọ, gbanye mmanụ n’ite sinye n’ọkụ, ọ dị obere ọkụ wụnye yabaasị, ọ gaa nkeji abụọ wunye ịra, ose, nnu, ụkpaka, ị chọọ tinye ya obere akwụkwọ nri ọbụla na-amasị gị. O ghee wụnye agwa na ji ahụ, mana ị ga-ahọpụta ji ahụ sutu ya ọdụ obere ka o wee jekọọ ọnụ. Ị gwọkọọ ya na agwa na ihe ndị ahụ ị ghere n’ọkụ. Ị gwọkọchaa, ị lee ma nnu ọ dịkwa ya.

  Onye richaa o nwebe ọńụ.

GUO:  Nri ndị Igbo: Ofe mpoto

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here