Ọrụaka: Ịsụ akwa

0
4

ỊSỤ akwa bụ ihe dị oke mkpa na ndụ mmadụ. A na-asụ akwa oge ọbụla maka adịmọcha. Ịdị ọcha so n’obibi ndụ mmadụ maka na ọ na-enyere ndụ aka.

  Ma nwoke ma nwaanyị na-asụ akwa, tinyere okenye na ụmụaka. N’oge ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ ji ịsụ akwa mere akaọrụ. Ha na-asụrụ ndị ọzọ akwa ma si na ya na-enweta ego.

  Ka ọ dị ugbu a, e nweela ọtụtụ njin (matchine) e ji asụ akwa iji mee ka ihe na-aga werewere, maka na chi na-efo ihe ọma a na-apụta. A nọzị n’ụwa ọgbara ọhụrụ, ihe agbanweela. Ndị na-asụ akwa, na-asụ, na-ede ya nkeọma nke na ha hazichaa ya ochie akwa adịzie ka nke ọhụrụ.

  Ọtụtụ ndị bagidere ịsụ akwa esila na ya kpata ego, wee ndị ọzọ n’ọrụ, ma bụrụ ndị a ma ama n’obodo.

  Ụfọdụ ndị na-achọ ọrụ na-enweta ọrụ n’ebe a na-asụ akwa. Ọtụtụ n’ime ha na-esi na ya malite nwee nke aka ha; ma sikwa otu ahụ mebe nke ọma.

  Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-esi n’ịsụ akwa gbakwụnye ya ihe ndị ọzọ dịka ire akwa ere.

  O kwesịrị ka ụmụnwoke na ụmụnwaanyị gụchara akwụkwọ, enweghị ọrụ bagide ịsụ akwa. Oge agaala mgbe a na-eche na ọ bụ ọrụ anaghị aga nkeọma.

  N’ụwa taa, ndị na-asụ akwa na-eme nkeọma. Ndị gụrụ akwụkwọ ma nwee nzere dị iche iche na-abagide ọrụ ịsụ akwa. Ụfọdụ ndị nwere ọrụ na-emepekwa ebe a na-asụ akwa ma na-anọ na ya ma ha rụchaa ọrụ ha tinyere ụbọchị ezumike (Satọdee).

  Ọ bụghị iwu na mmadụ ga-anọ n’ebe ọ na-akwụ ụgwọ ọnụụlọ wee malite ọrụ ịsụ akwa. Ọtụtụ ndị mmadụ bagidere ya site n’ịga n’ụlọ n’ụlọ na-anara ndị mmadụ akwa. Ha mechaa, ha anọrọ n’ụlọ ha sụọ ha. Otu ahụ ka ha megidere wee nwee ike kwụdosie ike n’ọrụ ịsụ akwa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here